Anyị agaghị ebugharị oge e kwesịrị ime ntuliaka - Mahmood Yakubu
Mahmood Yakubu bụ onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa Independent National Electoral Commission (INEC) gwara BBC na ntuliaka ga-aga n’ihu dịka e si tụọ atụmatụ ya na-agbanyeghi akụkọ na-efegharị na-enwereike ịgbatị ya n’ihi ọnọdụ nchekwa n’ụfọdụ mpaghara Naịjirịa.
O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Africa nwere na Lọndọn n’ụbọchị Tuzde 17 Jenụwarị 2023.
O kwuru na ha amalitela ikesa ngwa ọrụ eji eme ntuliaka dịka usoro iwu ọhụrụ na-achịkwa ntuliaka si dị.

Mahmood gara n’ihu kwuo na ụlọọrụ ha adịla njikere ịhazi ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị omeiwu n’ụbọchị 25 Febụwarị, 2023. Cheta na Naịjirịa nwere nsogbu nchekwa ugbua bụ nke metụtarala ụfọdụ ụlọọrụ ndị INEC dị na mpaghara dị iche iche, mana Mahmood sị na ọ hụbeghi ihe ọbụla ga-eme ka a dọtịa ego ntuliaka a.
Ọ gara n’ihu kwuo na ndị Naịjirịa dị nde 93.4 edebanyela aha maka ịtụ vootu, ebe mmadụ karịrị nde 74 n’ime dị n’agbata afọ 18 na 48.
Kirie ihe ndị o kwuru n'uju;



