Attacks on Inec Offices: 'Ọ bụghị ihe ọma nye ndị Igbo na-ana agba ụlọọrụ Inec ọkụ'

Ụlọọrụ Inec

Ebe foto si, Inec/Obi/Atiku/Tinubu/Kwankwaso

Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'Ọwụwa Anyanwụ ekwuola na ọ bụghị uru nye ndị Ọwụwa Anyanwụ na a na-agba ụlọọrụ ngalaba na-ahazị ntuliaka Naijiria bụ Inec n'ịchafụ ọkụ aghar aghara na mpaghara ahụ.

Ha kwuru na ọ bụghị naanị na ọ ga-emegide ọchịchị onyekwuoucheya, na ọ ga-anapụ mpaghara ahụ ohere iso kwuo onye ga-abanye n'ọkwa Onyeisiala n'afọ 2023 ọbụladị dịka nwa afọ mpaghara hụ so na ndị nwere ohere irite ọkwa ahụ.

ụlọọụ Inec n'Oru-West

Ebe foto si, Inec

Nkwupụta na-abịa dịka ndị omekome sunyechara ọkụ n'ụlọọrụ Inec dị n'okpuru Ọchịchị Oru-West dị n'Imo steeti mebie oche na akọrọngwa ọrụ Inec ndị ọzọ Oru-West, ỤbọchịỤka, abalị anọ nke ọnwa Disemba afọ 2022(4/12/2022.)

N'ozi ha wepụtara, Inec kwuru na ya bụ mwakpoo a wakporo ụlọrụ ha n'Oru west ga-eme ya nke asaa a na-awakpo ụlọrụ ha dị na steeti ise dị na Naijiria n'ime ọnwa anọ.

Ụfọdụ ndị ọrụ na-eru n'okwu na-arụtụ aka na ọ bụ ndị si wụị̀a Anyanwụ na-etinye aja na garị n'ohere ndị Igbo nwere iji vootu ha kwado nhọpụta onye si mpaghara ha dịka onyeisiala.

Ha kwuru na o nweghị ka isunye ụlọọrụ Inec ọkụ ga-esi eme ka a ghara ime ntulikaa 2023 dịka ha kwuru ụfọdụ ndị na-eme mkpamkpa ahụ na-eche.

Kama, dịka ha siri kwuo, ọ ga-anapụ ndị Ọwụwa Anyanwu ọnụọgụgụ vootu gbalitere elu iso kwuo onye n'ime mmadụ anọ kachasị welite isi na-azọ ọkwa Onyeisiala na 2023 onye ga-abanye n'ọkwa ahụ.

'Ọ bụ ndị be anyị na-eme onwe anyị'

Nonso Orakwe

Ebe foto si, Nonso Orakwe

Nonso Orakwe bụ onye ndu otu "Catch Them Young Initiative, kwuru na ụfọdụ ndị na-eme tigbuo ahụ na-eche na ha nwere ike isi n'ụzọ ahụ gbochinwuo ntuliaka 2023.

"Ọ bụghị ihe dị mma nye ndị Igbo na ụdị ihe a na-eme,ọ bụghị ihe ziri ezi."

"Ọ bụ ihe mgbagwoju anya na n' oge a, na anyị amaghị ihe anyị na-eme."

" Ụfọdụ na-eche na ha mee nke a, na a gaghị enwe ntuliaka ọbụla."

"Ọ bụghị ihe ọma nyere ndị Igbo."

"Mana ọ kwuru na ụfọdụ aghọtaghị ihe onyekwuuche ya pụtara."

Ọ bụ imebicha PVC ,gba ya ọkụ, ọ bụ etu ahụ ka ihe ga-eji ka mma?

Ọ ka mma na onye ọbụla gara were PVC ga kwuo onye ọ chọrọ ka ọ chịa."

Orakwe kwuru na o cheghị na ọ bụ ndị si ebe ọzọ batara n'ala Igbo na-emebi ụlọrụ Inec na akọrọngwa ntuliaka.

"Ị gaghị asị na ọ bụ onye ọzọ batara,ọ bụ ndị be anyị na-emekwa onwe anyị."

E wezụga ịgba ụlọọrụ Inec ọkụ, i nwetacha ụfọdụ okwu a na-ekwu na soshal midia, megide ntuliaka ahụ, ị mara na ihe na-eme anyị si anyị n'aka.

"ihe na-eme anyị si anyị n'aka, Ọ bụ oke nọ n'ụlọ gwara oke nọ n'ọhịa na-azụ dị na ngịga."

Orakwe rụturu aka na ihe so bute isu ụlọọrụ Inec ọkụ bụ "etu obodo si mebie."

'Ọ bu ndị egoro ego na-awakpo Inec'

Dennis Ekemezie

Ebe foto si, Dennis Ekemezie

Ekemezie bụ onye ọzọ ọnụ na-eru n’okwu kwuru na ụta dịrị Inec nakwa ndị ọrụ nchekwa maka mwakpoo nile na-eme n'ụlọrụ Inec.

OỌ k;pọrọ oku ka Inec ghara iji maka ọdachi ndị a mere gba ọnyụpa n'ihu na e wepụtara PVC ọhụụ were dochie ndị mebiri tupu ntuliaka 2023.

N’uche ya, Inec zuru ka e mee n’ihe gbasara nchekwa ngwa ọrụ ha nakwa ịdoghachi ndị lara n’iyi na mwakpo awakporo ụfọdụ ụlọọrụ ha. Mana n’aka ọzọ ọ tara ndị ọrụ nchekwa ụta ma na-ajụ ihe mere ha ejighi enye Inec nkwado kwesiri n’ụzọ nchekwa. Ọ jụrụ sị, “Isi ụlọọrụ Inec na-adịkarị nso n’ụlọọrụ ndị uweojii, kedụzia ihe mere na ndị uweojii anaghị enyocha ka ihe ndị a si eme ma na-agba mbọ ịnwụchi ndị aka ha dị namwakpo a?”

Ọ bụghị naanị n'Ọwụwa-Anyanwụ ka a wakporola ụlọọrụ Inec na nsonso a, dịka n'abalị 10 nke ọnwa Novemba afọ 2022, a wakporo ụlọọrụ ha na Ogun nakwa Osun steeti bụ ebe a gbara ụlọọrụ Inec dị n' Abeokuta, Ogun State nakwa Ede-South, Osun Steeti.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Mana mwakpo e merela n'Ọwụwa Anyanwụ kachasị karịa mpaghara ndị ọzọ.

Kemgbe ọnwa Mee afọ 2022 bụ mgbe Peter Obi ghọrọ onye ga-azọrọ ndị 'Labour Party' ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 dịka ọ hapụchara otu PDP.

Kama ịdajụrụ kemgbe Obi pụtara, mwakpoo ụlọọrụ ndị Inec nke chaliri n'ọnwa Jenụwarị afọ 2021, malitere rịwa elu.

Lee ụfọdụ ebe ndị ọ kọtụọrọla n'Ọwụwa Anayanwụ:

Oru-West, Disemba 4, 2022

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Orlu, Disemba 1,2022

ụlọọrụ Inec

Ebe foto si, Inec

N'ụbọchị Tọzde, abalị mbụ nke ọnwa Disemba, 2022, ndị omekome wakporo ụlọọrụ Inec n' Ọlụ dị n'otu Imo steeti ahụ.

Izzi, Ebonyi, Nov 27,2022

Ụlọọrụ Inec na Izzi,Ebonyi Steeti

Ebe foto si, Inec

N'abalị 27 nke Ọnwa Novemba afọ 2022, ndị omekome wakporo ụlọọrụ Inec na Izzi dị n'Ebonyi steeti sunye ya ọkụ.

Okụ ahụ gbara igbe vootu (ballot bọx) dị 340,igwe na-enye ọkụ latrik 14 nakwa akwụkwọ atụmvootu a mabeghị ọnụ ọgụgụ ya.

Igbo-eze North, Enugwu, 2022

Ndị omekome wakporo ụlọọrụ Inec dị n'Okpuru Ọchịchị Igboeze-North dị n'Enugwu steeti n'ọnwa Julai, gbaa ụlọọrụ ahụ ọkụ ma mebie akọrọngwa ọrụ ntuliaka dịka igbe vootu, mkpukpu a na-anọ atụ vootu nakwa oche na tabulu ụlọọrụ ahụ.

Ezza-North& Izzi,Ebonyi Steeti n'abalị 18 nke ọn Mee, afọ 2021,

Ndị omekome wakporo ma sunye ụlọọrụ Inec n'Okpuru Ọchịchị Eze Ezza-North nakwa nke ndị n'oOkpuru Ọchịchị Izzi ọkụ n'ụbọchị Tuzde,abalị 18 nke ọnwa Mee, afọ 2022.

Oku ahụ mebiri igwe na-enye ọkụ, igbe e ji atụ vootu na akọrọngwa ntuliaka ndị ọzọ n'ebe ndị a.

Okpuru Ọchịchị Izzi, Mee, 2022