Inec achọghị ka anyị nyochaa akwụkwọ ntuliaka dịka ụlọikpe siri kwuo - LP Imo Steeti

Ndị otu Labour Party zọrọ ọkwa ụlọomeiwu nke Imo steeti na-ebo ebubo nrụrụaka megide Sylvia Agu, bụ onyeisi ụlọọrụ nhazi ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission (Inec) na steeti ahụ.
Ha na-akpọ oku ka a chụpụ Syvia Agu na steeti ahụ n'ihi na ọ na-enupu is na mkpebi ụlọikpe nke kwuru ka e nye ndị niile so zọọ ọchịchị ohere ka ha nyochaa akwụkwọ e ji mee ntuliaka.
N'ọgbakọ ndị ntaakụkọ nke ha nwere n'isi obodo Imo steeti bụ Owerri na ngwụcha izuụka gara aga, Precious Nwadike, bụ onye zọrọ ọkwa ịnọchite okpuruọchịchị Orlu n'ụlọ omeiwu Imo steeti gụpụtara akwụkwọ ozi ebe ha boro ebubo a.
Ha dere sị, "Ọ bụ ihe mwute na onye nnọchite anya Inec n'Imo steeti ekweghị ka ndị zọrọ ọkwa ụloomeiwu nyochaa akwụkwọ e dere vootu atụrụ na akwụkwọ ntụliaka ndị ọzọ dịka ụloikpe siri nye iwu. Nke a na-eme dịka oge ụlọikpe nyere ohere ka e mee nke a na-abịa na njedebe".
Nwadike boro ebubo na ha ma na onyeisi Inec na steeti Imo bụ Sylvia Agu na ndị pati 'All Progressives Congress (APC) na-enwe ọgbakọ ugboro ugboro.
Ndị Labour pati na-ebo ebubo na emeghị ntuliaka na mpaghara dị icheiche n'Imo steeti n'ụbọchị Maachị 18, bụ ụbọchị e tinyere maka ntuliaka ndị omeiwu steeti.
Ha gakwara n'ihu kwuo na 'Labour Party nwetara mmeri n'okpuruọchịchị dị icheiche mana ọ bụ nrụrụaka ka Inec ji kpọpụta naanị APC dịka ndị meriri n'ebe niile.
Ihe Inec Imo Steeti kwuru
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Inec Imo Steeti gwara BBC Igbo na ọ bụghị eziokwu na Inec jụrụ inye ndị so zọọ ọkwa ọchịchị ohere ka ha nyochaa akụrụngwa e ji mee ntuliaka nke bụ Certified True Copy.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Oriakụ Emmanuella Opara kwuru na e nwere mkpụrụ ụbọchị ole iwu kwuru na ọ gaghị agafe tupu Inec enye ndị ndọrọndọrọ ọchịchị akwụkwọ CTC ha na-achọ, "mana ụbọchị ndị ahụ erubeghị. Inec ga-enye ha ihe ha na-achọ tupu ụbọchị ahụ eruo, maka na ọ bụ ikike dịịrị ha dịka iwu si dị."
Gbasara ebubo na onyeisi ndị Inec na ndị pati APC na-enwe ọgbakọ ugboro ugboro, Opara kwuru na nke ahụ bụ okwu ụgha.
N'ime oche 27 dị n'ụlọ omeiwu Imo Steeti, pati APC meriri 25 dịka Inec si kpọpụta, ebe otu oche - Ahiazu Mbaise - ka Inec kwuru na ntuliaka nke ahụ ezubeghị oke.
Ọ bụghị naanị Labour Party na-eti mkpu ma na-ebokwa ebubo nrụrụaka na ntuliaka ahụ, otu 'Peoples Democratic Party' (PDP) sokwa na-ebo ya bụ ebubo.
Odeakwụkwọ otu PDP bụ Samuel Anyanwu gwara ndị ntaakụkọ n'ụbọchị 20 nke ọnwa Maachị na ha agaghị ekwe ka mpụtara ntuliaka nke Inec kpọpụtara n'Imo steeti kwudo, n'ihi na o jupụtara na nrụrụaka.
"Anyị ga-ewepụ okwu a n'ụlọikpe, dịka anyị maliterela iwekọta akwụkwọ akaebe niile dị mkpa iji malite okwu a," Anyanwu kwuru.









