O nwere uru ogiri bara n'ahụ mmadụ?

- Onye dere ya, Marvelous Obomanu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Ogiri bu mkpụrụ e ji eme ka nri dị ụtọ ma nwe isi ọma.
Mana ihe ọtụtụ ndị na-amaghị bụ n' ogiri bụ ezigbo ngwa nri na-enye ezigbo ihe na-ahụ mmadụ ma e jiri ya sie nri.
Ọ na-adị mma karịa ngwa nri arụrụ arụ jupụtara n'ahịa ugbua.
Ile anya n'ihu ya na-eji oji nwere ike ọ gaghị amasị gị maka na ọ maghị mma ihu.
Ọzọ bụ na ọtụtụ ndị na-agbara ya ọsọ maka na o nwere isi na adighị mma mana usi ya bụ ihe na-eme ka ahụ gị na-amụke amụke.
O nwere aha agbụrụ dị iche iche jiri mara ya na Naịjirịa.
N'ala Igbo a na-akpọ ya 'ogiri. Ndị Yoruba na akpọ ya 'iru' dịka ndị Hausa na-akpọ ya dawadawa.
Ọ bụ na mkpụrụ osisi nke a na-akpọ 'locust beans' n'asụsụ bekee nke aha sayensi ya bụ 'parkia biglobosa' ka e si enwete ya.
Kedụ uru ogiri bara?

Ebe foto si, Onyenora Uju/Facebook
O na-emetụta ahụike mmadụ?
Ogiri nwere ọtụtụ ihe na-edozi ahụ e ji akwalite ịdị mma na ahuike mmadụ dịka Vivian Onyenora Ujunwa bụ onye na-ahụ maka nri ahuike si kwuo.
Dịka Onyenora siri kọwaa, ogiri na-eme ihe ndị a:
* ịkwalite ahụike obi mmadụ.
* Ọ na-enyeaka eme ka nri mmadụ riri dabaa n'ahụ nke ọma.
* Ọ na-eme ka ọbara na-agba etu o kwesịrị.
* Ọ na-ebuli usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ.
* Ọ na-eme ka ọkpụkpụ na eze mmadụ sie ike.
* Ọ na-eme ka akpụkpọ ahụ mmadụ na amụke amụke ma dịkwa mma.
* Ọ na-enyeaka eme ka mmadụ na-ahụ ụzọ ọfụma.
* Ọ na-enyeaka ibeleta ibu.
* O nwere Carbohydrate, Faịba, Protein, Abụba dị mma, kalcium, ígwè, vitamin A na C, potassium, zinc nakwa ndị ọzọ


Vivian Onyenora Ujunwa dọkinta na-ahụ maka nri ahuike sị na ogiri dị mma na-ahụ mana o nwere obere ọghọm na ọ bụrụ na mmadụ na-eri ya mgbe ọbula nakwa n'ụfọdụ ọnọdụ.
Ndị na-emepụta ya na-eme ka ọgbaa ụka tupu ha ere ya. Ya bụrụ na ahụ mmadụ anaghị anabata ihe gbara ụka o nwereike inye onye ahụ nsogbu.
"O na-enwe usi ọjọọ nke nwereike ime ka ndị mmadụ na -agbara ya ọsọ"
"Ndị na-emepụta ya na etinye ya nke nwereike inye ndị na-enwe ọbara mgbali elu nsogbu na-ahụ".
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na ndị na-emepụta ya echekwaghị ya ọfụma nje nwereike ịba ya n'ime nke nwereike inye nsogbu na-ahụ.
Iji gbochie ihe ndị a, Vivian dọrọ aka na ntị ka ndị mmadụ hapụ ịna eji ya esi nri mgbe ọbụla nakwa ka ndị mmadụ n'azụ ya ebe dị ọcha.
Vivian si na ogiri na adị mma iji esi nri dị iche iche dịka egusi, okro, ọgbọnọ, ewedụ, ọfada, beans na ndị ọzọ.








