Ihe mere #JusticeforOchanya ji ewu ewu ebe niile

Ebe foto si, Supplied
Ọnwụ nwaada Ochanya Ogbanje gbara afọ 13 akpalitela iwe ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa na-akpọ oku maka ikpe ziri dịka o mere afọ asaa nwatakịrị ahụ nwụrụ.
Ọtụtụ ndị mmadụ zipụtara ozi n'akara soshal midia ha dị iche iche kemgbe nwaada ahụ nwụrụ na Ọktoba 2018 oge e dinara ya n'ike.
Mana ugbua, ọ bụzi #JusticeforOchanya na-ewu ebe niile na soshal midia iji hụ na e kpere ikpe ọnwụ nwatakịrị ahụ etu o kwesiri.
Akụkọ kwuru na Ochanya Ogbanje gbara afọ ise oge ọ gara ka ya na otu onye ezinaụlọ ya aha ya bụ Felicia Ogbuja bi na Benue Steeti biri. E kwuru na ọ bụ ebe ahụ ka o si aga ụlọakwụkwọ.
Oge ndị ntaakụkọ gbara nwatakịrị ahụ ajụjụ ọnụ tupu ọ nwụọ, o kwuru na ọ bụ maka ịga akwụkwọ mere o ji ga ka ya na Felicia Ogbuja biri.
Mana ihe niile gbanwere oge e bidoro imetọ nwaada Ochanja ahụ n'ike oge ọ gbara afọ asatọ.
Nnukwu ahụ ndị dinara ya n'ike meruru ya bụ ihe kpatara ọnwụ nwatakịrị ahụ.
Oge ihe ahụ mere, ezinaụlọ Ochanya bugara ya n'ụlọọgwụ Benue Teaching Hospital ebe ndị dọkịnta nọrọ kwuo na o nwere ọrịa Vesico Vagina Fistula (VVF) nakwa nsogbu ịṅụ mamịrị.
Ochanya nwụrụ n'Ọktoba 2018 dịka o kwuru na ahụ na-ekpo ya ọkụ. Ọ kwụsịrị imegharị ụkwụ na aka ya.
N'afọ 2021 ka nne nwatakịrị ahụ kwuru ụdịrị ikpe ọ chọrọ banyere ọnwụ nwa ya nwaanyị.
O kwuru na "Ọ bụ eziokwu na ụmụaka nwereike ịnwụ, mana etu nwa ya si nwụọ na-ewute ya nke ukwuu".
Na 2021, gọọmenti Benue Steeti wegara ikpe ọnwụ ahụ n'ụlọikpe ma kwe ezinaụlọ Ochanya nkwa ikpe ziri ezi.
Dịka e degara ọtụtụ akwụkwọ mkpesa, ndị uweojii nwụchiri Andrew Ogbuja na Eprel 2018 maka ebubo idina n'ike mana ndị uweojii anwụchighị nwa ya nwoke Victor oge ahụ.
A kpụpụrụ Andrew Ogbuja bụ di Felicia Ogbuja onye Ochanya gara ibi n'ụlọ ya n'ụlọikpe na Ukwu Benue Steeti 2019 maka ebubo idina n'ike. Mana o kwuru na aka ya dị ọcha.
A kpụpụkwara Felicia Ogbuja ụlọikpe maka ebubo na o meghị ihe o kwesiri ime banyere ileta ma chekwaa nwatakịrị ahụ gba gbochie idina n'ike di ya bụ Andrew na nwa ha bụ Victor dinara nwaada Ochanya Ogbanje.

Okwu ọnwụ Ochanya amalitela ọzọ dịka afọ asaa gasịrị.
Na 2025, a hụrụ ihe onyonyo Victor Ogbuja onye e kwuru na aka ya dị na ndina n'ike a dinara Ochanya mana ndị uweojii anwụchighị onye ahụ maọbụ kpụpụ ya ụlọikpe.
Ọ bụ oge a hụrụ ihe oyonyo nwaamadị ahụ ebe ọ na-ekpori ndụ na soshal midia, ka ọtụtụ mmadụ maltere ịkpọ oku maka ikpe ziri ezi n'ọnwụ Ochanya Ogbanje.
Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa nakwa ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị etinyela ọnụ n'oku a a na-akpọ ugbua.
Sinetọ Natasha Akpoti Uduaghan na-anọchiteanya Kogi Central n'ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa, kwuru ka ezinaụlọ Ochanya dee akwụkwọ mkpesa ma kwuo na ọ ga-akwado ha.
Pastọ a ma ama na Legọs bụ Iren Emmanuel akpọọla oku ka ndị ọkaiwu maara maka ikpe ahụ pụta ka a mara ihe a ga-eme maka ya.
Onye bụ Ochanya Ogbanje?
A mụrụ ya n'afọ 2005. Oge ọ gbara afọ ise, ọ gara ibi na nke otu onye ezinaụlọ ha bụ Felicia Ogbuja, di ya Andrew na ụmụaka ha ise iji nye ya ohere ịga ụlọakwụkwọ.
Ọ bụ nwa ikpeazụ nne na nna ya bụ Michael na Rose Ogbanje mụtara. Ha kwuru na ha kpọgara ya n'ụlọ Felicia iji nye ya ohere ka o nweta ezi agụmakwụkwọ.
Ọ bụ ka afọ anọ gasịrị ọgara ibi n'ụlọ Felicia na ezinaụlọ ya ka okwu Ochanya nọ dagharịa.
Nne Ochanya kwuru na ọ bụ n'afọ 2012 ka ọrịa Ochanya bidoro. N'okwu ya, "Anyị bugara ya n'ụlọọgwụ n'Okpoga, anyị nọrọ abalị isii n'ụlọọgwụ ebe ndị dọkịnta nyere nleta. Ọ malitere inweta onwe ya mana oge na-adịghị anya, ọrịa ahụ laghachitekwara.
Nne na Nna Ochanya bụ ndị ọrụ ugbo.
Nne Ochanya kwuru na obi gbawara ya oge nwa ya nwụrụ na Ọktoba 17, 2018.








