Nna m gbahapụrụ anyị oge m na-etolite etolite - Charles Born

Aha onyonyo, Nna m gbahapụrụ anyị oge m na-etolite etolite - Charles Born
Nna m gbahapụrụ anyị oge m na-etolite etolite - Charles Born
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Charles Born na-eme ejije ekwuola na nna ya gbahapụrụ ya na ụmụnne ya nakwa nne ha oge ha na-etolite etolite.

Nwaamadị ahụ na-eme ihe nkiri a maara dịka All Pronouns Duly Observed kwupụtara nke a na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere.

O kwuru na ọ bụ oge ya nwetara ohere agụmaakwụkwọ na mahadum ka nna ya kwuru na ọ naghị alụzi nne ya, ma gbahapụ ha.

"Nne m sitere mgbe ahu malite ilekọta anyị, maka na ọ lụọla dị, mụọ ụmụ, ọ gaghị agbahapụ anyị".

"Ọ bụ nne m zụrụ anyị niile n'ụlọakwụkwọ, ọkachasị mụ onwe m, maka na oge nna m kwuru na ya anaghị alụzi nne m bụ oge m chọrọ ịbanye mahadum," ka Charles kọọrọ anyị.

Charles Born kwuru na ya malitere ime ejije nkwago oge ọ nọ na mahadum, mana o mechara banye Nollywood oge ndị enyi ya gụnyere Eso Dike gwara ya na ego dị n'ejije.

O kwuru ya na ya rụburu ọrụ dịka onye mgbasaozi n'ụlọmgbasaozi Rave TV na Hot FM dịcha na Legọs steeti, tupu ọ malite ime ejije.

Charles Born sịrị na ọ ga-amasị ya ịbụ onye na-eme ejije a ma ama n'ụwa dum n'ọdịnihu.

"Achọrọ m inwe ụlọọrụ mmepụta ejije nke m. Achọrọ m ide, mepụta ma tuzie aka n'ejije nke m. Achọrọ m inye ndị ọhụrụ ohere ka ha chakee," ka o kwuru.

O nyere ndị nwere mmasị ime ejije ndụmọdụ ka ha gbaa mbọ na-ewepụta ụdịrị ihe ngosi dị iche iche, ma n'ụdị foto ma n'ụdị onyonyoo oge niile.

"Ọzụzụ dịkwa oké mkpa, n'ihi na ị gaghị achọ ọnọdụ ọ ga-abụ onye na-emepụta ejije maọbụ onye na-atuzi aka ga-asị na ị naghị agbanwe agbanwe, n'agbanyeghị agwa ọbụla e nyere gị n'ejije".

"Ọzọ abụrụ ka ị na-ekpe ekpere, n'ihi na o nweghị ihe Chineke na-apụghị ime. O nweghị ihe nyịrị Chineke n'omume. Naanị gaa n'ihu na-ekpe ekpere, ka Charles gwara ndị na-achọ ime ejije.

Nna m gbahapụrụ anyị oge m na-etolite etolite - Charles Born

Charles Ugochukwu Born bụ onye Agbaje dị n'okpuru ọchịchị Nwangele n'Imo steeti.

Ọ gụrụ ihe ọmụmụ Information Science and Technology na mahadum Madonna University dị n'Ọkịja n'Anambra steeti.

O meela ọtụtụ ejije gụnyere On the Edge, A Night With Mr Daniel, Three Is A Match, 3Ps In A Pod, Happily Unhappily Married nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.

Charles Born alụbeghị nwunye, ma o nwebeghị onye o kwere nkwa ọlụlụ. Ọ na-amasị ya ịnọrọ onwe ya n'ụlọ ma ọ bụrụ na ọ naghị arụ ọrụ.

O kwuru na nna ya chọrọ ka ọ bụrụ Ọkaiwu, mana ya onwe ya nwere mmasị ịbụ onye mgbasaozi. Ugbua, ọ bụzị onye na-eme ejije, n'ihi ego dị n'ime ya.