Ama m ihe ndị m gabigara tupu m ruo n'ogogo m nọ taa - Ashmusy

Aha onyonyo, Ama m etu m siri ruo n'ogogo m nọ taa - Ashmusy
Ama m ihe ndị m gabigara tupu m ruo n'ogogo m nọ taa - Ashmusy
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
    • Onye dere ya, Gift Ufuoma
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Ashmusy, onye ezigbo aha ya bụ Amarachi Amuzie bụ nwaafọ Enugwu steeti a ma ama na-eme ihe nkiri na soshal midia, ma na-emekwa ejije.

Na mkparịtaụka a pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Ashmusy kọwara na ọ tụghị ya n'anya na o ruru n'ogogo ọ nọ taa, ma bụrụ onye a ma ama n'ihi na ọ gbara mbọ maka ya.

"Ọ tụghị m n'anya na m bụ onye a ma ama ugbua, maka na ama m etu m siri ruo n'ogogo m nọ taa. Agbara m mbọ maka ya," ka ọ gwara anyị.

Ọ sịrị na ọ na-ara ya ahụ ịrụtụ aka n'ihe ngosi bupụtara ya kpọmkwem, maka na o mere ọtụtụ ihe ngosi ma tinyekwa aka n'ọrụ dị iche iche iji bụrụ onye a ma ama.

Ashmusy kwuru na ya emepụtala ejije ruru isii, maka na ọ bụ ihe masịrị ya, nke mere o ji malite ime ihe ngosi.

Ọ kọwara na ọtụtụ ihe na-akpalite mmụọ ya imepụta ihe ngosi, nke gụnyere ejije ndị o kirichara metụrụ ya n'ahụ, egwu ndị ahịrị egwu ya metụrụ ya n'obi, maọbụkwanụ ihe ọbụla ọ hụrụ n'akụkụ ya.

E wezuga ime ihe ngosi, Ashmusy nwere ụlọahịa a ma ama na-ere ihe e ji elekọta ntutu, ma nweekwa ụlọọrụ na-ere ụlọ na ala.

Gbasara atụmatụ ndị o nwere maka ọdịnihu, Ashmusy kwuru na ya na-ahụta onwe ya dịka nwunye nakwa nne n'ime afọ ise na-abịa abịa.

Ọ sịrị na ihe ọbụla ga-eme ka ya nwetazuo ebumnobi a bụ atụmatụ o nwere maka ọdịnihu.

Ama m etu m siri ruo n'ogogo m nọ taa - Ashmusy

O kwukwara na ya na-ele anya ịbanye na ndọrọndọrọ ọchịchị n'ọdịnihu, ibugo azụmaahịa ya n'ogogo dị elu, ma tinye aka na ngalaba ndị ọzọ.

Ashmusy nyere ndị nwere mmasị ịmalite ime ihe ngosi ndụmọdụ ka ha nọgidesie ike ma chọpụta ihe gbara ọkpụrụkpụ a ga-eji mara ha.

Amarachi Amuzie bụ onye Obeagu Awkunanaw dị n'Enugwu steeti, o toro na Legọs ma birikwa na Legọs.

Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndịrị na Federal Government College Enugwu, ma gụọ ihe ọmụmụ ahụike bụ Human Anatomy na mahadum Madonna University dị n'Elele na Riva steeti.

Ọ malitere ime ihe ngosi n'afọ 2017 oge a gbara Iko Mbaụwa, site n'ihe ngosi nke ya na enyi ya nwaanyị mere oge ahụ.