Etu idemmiri si akpa ike ọjọọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa

Dịka a nọọrọ na nsonso a na-ahụta ọtụtụ mmiri ozuzo na mpaghara Naịjirịa dị iche iche, ọkachasị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, ndị mmadụ agaala n'ihu na-eti mkpu gbasara nnukwu idemmiri na-eyi ndụ ha egwu.
Ọnọdụ a emetụtala ndị bi na steeti dị iche iche na mpagahara Ọwụwa Anyanwụ dịka Abịa na Imo steeti.
Oge ndị ntaakụkọ BBC News Igbo gagharịrị n'ụfọdụ obodo dị na mpaghara ala Igbo, ha chọpụtara ọnọdụ na-agba anyammiri nke ndị bi ebe ahụ na-agabiga n'ihi nsogbu idemmiri.
Ndị bi gburugburu steeti ndị ahụ kwuru na ihe butere ọnọdụ a bụ nnukwu mmiri ozuzo malitere kemgbe ihe ruru otu izuụka.
Ha kwuru na oke idemmiri ahụ achụpụla ụfọdụ mmadụ n'ụlọ, kpochapụ ọtụtụ ngwongwo ha ji biri ma gbuokwa ụfọdụ anụmanụ ha.

Cheta na ụlọọrụ na-ahụ maka ihu igwe na Naịjirịa bụ Nigerian Meteorological Agency (NiMet) kwuru na a ga-enwe egbe eluigwe na mmiri ozuzo gburugburu Naịjirịa malite n'ụbọchị Mọnde ruo Wenezde.
NiMet kwuru na ụfọdụ steeti a na-atụ anya mmiri ozuzo gụnyere Abịa, Imo, Ebonyi, Anambra, Osun, Ogun, Oyo, Ondo, Ekiti, Edo, Delta, Bayelsa, Rivas, Legọs, Cross River na Akwa Ibom steeti.

N'obodo Isiala Ovom kwụụrụ onwe ya, n'okpuru ọchịchị Obingwa dị n'Abịa steeti, idemmiri achụpụla ọtụtụ mmadụ n'ụlọ, mebie ngwongwo ruru nde kwuru nde naịra ma mee ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-enweghị ebe obibi.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị bi ebe ahụ kwuru na ọdachi a malitere oge e wuchara ogige ọrụ maka ndị na-edozi ụgbọala na ndị na-ere akụkụ ụgbọala n'Ovom.
A na-ekwu ugbua na ogige ahụ, nke Gọọmentị Abia Steeti wuru n'ebe mmiri si na-asọpụ n'obodo ahụ na-egbochi okpo mmiri n'oge udummiri.
Nnukwu mmiri ozuzo malitere izo kwa ụbọchị kemgbe ihe ruru otu izuụka emeela ka mmiri tojuo n'akụkụ ụfọdụ n'obodo ahụ, na-erikpu ụlọ, na-ebufu ngwongwo dị n'ụlọ, ma na-egbukwa anụ ụlọ.
Okporoụzọ Opobo Road dị n'Aba abụrụla nke a na-enye nsogbu iji mee njem n'ihi nnukwu idemmiri tochiri ebe ahụ, bụ nke na-enye ụgbọala nsogbu ịgafere.
A manyela ọtụtụ ndị bi n'ụlọ ka ha kwapụ n'ebe obibi ha, ebe ụfọdụ na-agbaba n'ebe nchekwa nwa oge.
Otu nwaanyị di ya nwụrụ, ọnọdụ ahụ metụtara bụ Nkechi Monday kọọrọ onye ntaakụkọ BBC News Igbo ihe ọ na-agabiga.
"Idemmiri a mebiri ihe niile m nwere. Mụ na ezinụlọ m na-ehi ụra ugbu a n'ime ụlọahịa dị n'akụkụ ụzọ. O gbuola ọtụtụ anụ ụlọ ndị m na-akpa. Amaghị m ebe m ga-ebido," ka o kwara arịrị.
Ndị obodo akpọkuola gọọmentị ka ha tinye aka ngwangwa ma weta ogbugbo ga-adịgide adịgide maka nsogbu idemmiri a.

N'ọzọ yikwara nke ahụ, ndị bi na Mbieri, Ubommiri, Ohii, Orji, Akwakuma na Umuguma dịcha n'Imo steeti etiela mkpu gbasara ihe idemmiri na-eme ha, ọkachasị n'oge a mmiri na-ezo kwa ụbọchị.
Oge onye ntaakụkọ BBC News Igbo gagharịrị n'ụfọdụ obodo dị na steeti ahụ ka ọ chọpụtara ọnọdụ ọjọọ ndị bi ebe ahụ na-agabiga.
Idemmiri achụpụla ọtụtụ mmadụ n'ụlọahịa ha n'okporoụzọ siri Orji gawa Nwaorieubi dịka ndị na-akwọ ụgbọala na ọgbaatumtum ekweghịkwa agba n'okporoụzọ ahụ ọzọ.
Ndị bi gburugburu ebe ahụ kwuru na gọọmenti Imo steeti agbahapụla ha n'ihi na arịrịọ niile ha na-arịọ kemgbe gbasara ọnọdụ ọjọọ nke okporoụzọ ahụ bụ nke gọọmenti ekweghị aza.
Ha kwuru na ha na-enyeziri onwe ha aka site n'ịkwa ụzọ n'ebe ụzọ na-adịghị iji nyere ndị ji ụkwụ aga aka.
Na mpaghara Ohii nakwa okporoụzọ si Akwakụma gawa ahịa ọgbọ osisi dị na Mbieri, ndị mmadụ bere akwa gbasara ihe ha na-agabiga n'okporoụzọ ndị ahụ, ọkachasị n'oge udummiri a.
Ndị na-azụ ahịa n'ọgbọ osisi dị n'Umuonyeali Mbieri kwuru na ha anaghịzi ahụ ụzọ ha si ebubata ngwaahịa ha, ebe ndị na-azụ ha ahịa ahụghịkwa ụzọ ha si abata n'ime ahịa ahụ iji gbaa ha aka ahịa.
Ha kwuru na nke a abụghị oge mbụ maọbụ abụọ ha na-arịọ gọọmenti Imo steeti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka ma dozie okporoụzọ ahụ.
Ka o sina dị, ha kwuru na ha ga-aga n'ihu na-eti mkpu ruo mgbe gọọmenti ga-anụrụ olu akwa ha ma mara ihe ọ ga-eme iji nyere ha aka.









