Ihe anyị ma maka nwaanyị a chụpụrụ na ngwuru nna ya n'Anambra Steeti

Ebe foto si, Screengrab
Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu gụnyere ndị ọkaiwu na ndị na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye agbarụọla ihu banyere ihe ha kporọ 'mkpagbu ụmụnwaanyí' dịka a chụpurụ otu nwaada na ngwuru nna ya n'Anambra Steeti na nsonso a.
Nke a na-abịa dịka ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia gosiri otu nwaanyị aha ya bụ Ụkamaka Ezekibe Onwuzobe, nwaada obodo Odida Ogidi na-ebe akwa arịrị ma boo ebubo na a chụpụrụ ya na ngwuru ya ma tụpụ ngwongwo ya n'ama.
N'okwu ya, "Ewe sị m kwapụ, ebe ọsọrọ m, mụ tinye isi n'ọhịa, na ha amaghị onye m bụ."
Nwada Onwuzobe gara n'ihu sụọ ọfọ sị: "Mụ bụ nwada were dọnọ na mbara ezi be nna m were na-asụ ọfọ, na-akpọku ala Ogidi, na-akpoku Ezechụọmagha, na-akpọku Ala Ikenga, na-akpoku mmụọ nile dị n'ala Ogidi, na-akpoku ụmụada, ndị nze na ochie sị ụnụ ka ụnụ bilie..."
Dịka ọ na-akọwa ihe mere, Nwada Onwuzobe gbara ama na ya, 'bọrọ ọhụ n'ala' were tụọ arịrị ahụ, ebe nwa nwane ya nwoke na nwunye ya nọ na-ekiri ya ma na-akwa ya emo.

Ebe foto si, Screengrab
Oge a jụrụ ya, nwa amadị ahụ ihe mere o jiri kwapụ arịa nwanne nna ya n'ezi, Ogochukwu Onwuzobe onye kwetara na ya wepụrụ okwu ha n'ụlọikpe kwuru sị, "Ọ bụghị m bupuru ihe ya n'ezi, ọ bụ ndị ụlọikpe bupuru ya."
Onyeisi ụmụada ndị Odida Ogidi ekweghị asa BBC Igbo ajụjụ banyere okwu ahụ na-ewu ewu na soshal midia kama ọ gwara BBC Igbo ka e nye ha ohere ka ha gaa n'ezinaụlọ ahụ mata ka mmiri si banye n'opi ụgbọgụrụ tupu ha nwee ọsịsa ha ga-enye ndị ntaakụkọ.
Mana ụfọdụ ndị nọ Ọdịda Ogidi ebe ihe mere gwara BBC Igbo na nwada ahụ onye anọghị na be di na nwa nwanne ya nwoke nwere esemokwu metụtara ihe a na-eweta n'ubi nke mere ka nwa amadi ahụ kpụbụ ya n'ụlọikpe majie, ebe ụlọikpe nyere nwoke ahụ ikike ịchụpụ onye mbimbi ọbụla nọ n'ụlọ ya.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Otu onye n'ime ha na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo sị, "ihe na-ese okwu abụghị okwu rijuru afọ, ọ bụ okwu onye ga-aghọ mkpụrụosisi mango na oroma dị na be ha na-ese okwu.
"Nke nwoke wegara ya n'ụlọikpe. ụlọikpe si ya na o nwere ikike ịchụpụ onye mbimbi n'ụlọ ya mana nwaada abụ onye mbimbi?"
Okwu nchụpụ a chụpụrụ Ukamaka kpalitekwara ọzọ okwu banyere ikike ụmụnwaanyị nwere iketa oke ala na ihe enweenwe n'Ala Igbo.
N'omenala Igbo, nwaanyị anaghị eketa ihe n'ebe nna ya maọbụ na be di ya bụ ebe o nwere ikike inwe site naanị n'ụmụnwoke ọ mụrụ ebe ahụ.
Nke a bụ na-agbaghị ọtụtụ mkpebi enwerela n'ụlọikpe na nwoke ma nweaanyị kwesịrị inwe nketa oke n'akụ ezinaụkọ.
Otu na ndị ndu ụmụnna Nwada Ụkamaka kọwara na dịka omenala ha siri dị, " A naghị achụ nwada achụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka nwada pụọrọ gị n'ụlọ, ị ga-awa ntọala rụọrọ nwada ụlọ."
Ọ gara n'ihu kwee nkwa na ndị ụmụnna ga-agbagha mkpebi ụlọikpe majie ahụ iji nwetara nwa ada ahụ ikpenmkwụmọtọ.
Kedụ ebe ebe iwu kwụ n'okwu a?

Ebe foto si, Ebelechukwu Aroh/Facebook
Ọkaiwu Ebelechukwu Aroh gwara BBC Igbo na o nweghị onye nwerere ikike ịchụpụ mmadụ n'obi nna ya.
Ọkaiwu Aro onye bụ ọkachamara n'iwu metụtara akụ na ihe enwenenwe sịrị, "Ị gaghị achụnwu mmadụ na be nna ya."
"N'agbanyeghị na n'iwu omenala na ọdịnala kwuru na ọ bụ diọkpara bụ onye na-eketa obi, mana o nweregodi obi, nke a apụtaghị na ọ ga-achụpụsị ụmụnne ya ndị ọzọ."
" Ụmunne ya ga-ebigide n'obi ahụ ganye na aka esie ha ike, ha rụọ ụlọ nke ha."
Ihe ndị mmadụ na-ekwu
Otu onye ọnụ na-eru n'okwu bụ Willie Nwokoye kwuru na nwoke wepụrụrụ okwu ahụ n'ụlọikpe dajọrọ," Ọ ka eri nwaa amadi ahụ ihe imeri n'ụlọikpe karịa imede nwaanyị ahu obi."
"Ọ buru na-ekpezighị okwu a nke ọma, ọnụ ọ bụrụ ga-emegide onye ezinaụlọ ebe ọ kpụrụ ahụ ya n'ala were bụọ ọnụ."
Ọ tụrụ alo ka a rụọrọ nwaanyị ahụ obere ụlọ ka o mere nwoke ahụ ekpere ma gọzie ụmụ ọ ya na ndị ga-eso ha."








