Onye bụ Ezra Olubi ụlọọrụ Paystack kwụsịrị ọrụ n'ike maka ebubo mmetọ ụmụaka?

Ezra Olubi

Ebe foto si, Ezra Olubi/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọọrụ e ji eziga ego n'ịntanet bụ Paystack akwusịla otu onye n'ime ndị hibere ụlọọrụ ahụ bụ Ezra Olubi ọrụ n'ike maka ebubo imetọ ụmụaka.

N'ozi ụlọọrụ ahụ wepụtara nke rutere BBC aka, ha kwuru na ha amalitela inyocha ebubo ndi e boro ya.

"Paystack ma maka ebubo metụtara onye so hibe ụlọọrụ anyị bụ Ezra Olubi."

"Malite na mgbede Tọzde abalị 13 nke ọnwa Nọvemba afọ 2025, a kwụsịtụla Ezra Olubi ọrụ ganye oge e mechara nchọpụta."

Kedụ onye bụ Ezra Olubi?

Ezra Olubi

Ebe foto si, Ezra Olubi/X

Ọ bụ onye Ogun Steeti mana a mụrụ ya n'Ibadan, Oyo steeti n'afọ 1986.

Ọ gụrụ Kọpụta Sayensị na mahadum 'Babcock University'

Ọ bụ onye nka teknụzụ nakwa onye so hibe ụlọọrụ Paystack.

N'afọ 2021, ụlọọrụ Amerịka a kpọrọ 'Stripe' zụrụ 'Paystack' n'aka Ezra Olubi na enyi ya bụ Shola Akinlade onye ya na ya gbakọrọ aka hibe ụlọọrụ ahụ mana ha hapụrụ ya dịka onyeisi na-ahụ maka teknụzụ ha.

Olubi na Akinlade hibere Paystack n'afọ 2016 maka ndị na-azụ ahịa na Naijiria na Gana nwee ike ịnata ụgwọ ahịa ha rere site ebe ọbụla n'ụwa.

Kemgbe afọ 2021, Paystack na-ahụ maka ụgwọ ruru pasenti 50 ndị mmadụ na-akwụ n'ịntaneti na Naịjirịa nakwa n'ụlọọrụ 60,000 gụnyere FedEx, UPS, MTN nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.

Olubi nwere nturuugo 'Officer of the Order Of The Niger (OON) n'aka gọọmentị etiti Naịjirịa n'oge ọchịchị Muhammadu Buhari lara mmụọ.