Mmachi asụsụ ọdịbendị bụ iweghachi anyị n'aka ọchịchị Briten - Ndị nkuzi

Ebe foto si, Chidi Emeagi/ Getty Images /Nma Olebara
Ndị ọkachamara n'okwu nkuzi ekwuola na atụmatụ ọhụrụ nke Gọọmentị Naijiria wepụtara nke mere ya iwu iji Bekee akụzi ihe n'ụlọakwụkwọ g-a eweghachi aka elekere azụ n'ịkwalite njirimara ndị na omenala, ma nabata Briten.
Na nsonso a, Gọọmentị Etiti machiri iji asụsụ ọdịbendị akụzị akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ malite na Praimarị rue na mahadum sị na ọ bụ iji hụ na onye ọbụla sonyere na mmụta.
Ọ pụtara na anyị enyefela njirimara na omenala anyị n'okpuru mba Briten- Emeagi

Ebe foto si, Chidi Emeagi
Mana otu onyeisi ụlọakwụkwọ bụ Ichie Chidi Emeagịị, kwuru na atụmatụ ọhụrụ ahụ bụ 'nnukwu ihe ihere" ma bụrụ "ihe mmegide nye ụmụ Naijiria".
Ọkammụta abụ bụ onye ụlọakwụkwọ' 'Eagles Model Academy, Owere, gwara BBC igbo sị, "Dịka onye nwere ụlọakwụkwọ, ọ bụ nnukwu ihe ihere na ndị na-ahazi agụmakwụkwọ kwụsịrị anyị iji asụsụ be anyị akụzi nkuzi n'ụlọakwụkwọ anyị nile."
" Ọ bụrụ na anyị etinynye iwu ọhụrụ n'ọrụ, ọ pụtara na anyị enyefela njirimara anyị na omenala anyị n'okpuru mba Briten."
Ọ gara n'ihu rutụ aka na mba ndị ọzọ ndịọcha chịrị ji Bekee agwa asụsụ ala ha na nkuzi na mmụta.
Ọmaatụ: Mba India bụ ndị ji Bekee na Hindi akụzi akwụkwọ; Kenya, ji Bekee na Swahili; Saụt Afrika ji Bekee na asụsụ 11 ndị ọzọ ebe Ireland ji Bekee na asụsụ Irish wgz.
Ọ dịka nkagbu a kagburu ọmụmụ 'History'- Olebara

Ebe foto si, Nma Olebara
N'otu aka ahụ onye ọzọ welitere agba na nkuzi bụ Nma Olebara katọro iwu ohụrụ ahụ sị na ọ bụ iweghachite ọchịchị ndị ọcha Bekee kpọrọ'neo-colonialism'..
Ọ jụrụ sị, " Kedụ onye chọrọ ka anyị kwụsị nkuzi n'Igbo, ebe a na-amụzị Igbo rụọ ogogo ọkammụta na mba dị iche iche gụnyere mba Amerịka, Briten, Chaina wdg?"
"Kedụ ka Naijiria malitere ikuzi asụsụ Chaina n'ụlọakwụkwọ na Naijiria na nsonso ga-esi kwụsị nkụzị asụs u ọdịbendị nke Naijiria?"
Olebara gara n'ihu jiri iwu ọhụrụ ahụ tụnyere nkagbu a kagbuburu nkuzi 'History' n'ụlọakwụkwọ ma jụọ, "Ọ bụ na atụmatụ abụghi iji mee ndị be anyị ohu omenala ndị ọzọ?"
Kedụ ihe atumatụ ọhụrụ maka iji naanị Bekee akụzi ihe n'ụlọakwụkwọ niile dị na Naijiria pụtara?

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị Etiti ewepụtala atụmatụ iji asụsụ Bekee akụziri ụmụakwụkwọ ihe malite na praịmarị rue na mahadum.
Nke a kagburu atumatụ e nweburu nke nyere ohere ikuziri ụmụakwụkwọ nọ n'obere ụlọakwụkwọ (Praịmarị 1-3) ihe n'asụsụ ndị be ha, dịka ngalaba Nigerian Educational Research and Development Council(NERDC) siri hazibuo ya.

Ebe foto si, Federal Ministry of Education
N'ozi ya n'ọgbakọ e nwere n'Akure n'ụbọchị Wenezde 12 Nọvemba 2025, Minista na-ahụ maka agụmaakwụkwọ bụ Maruf Tunji Alausa, kwuru na nke a bụ iji hụ na onye niile sonyere n'ihe a na-eme na mbaụwa.
Ọzọ bụ na atụmatụ ọhụrụ a nyere ohere ka a na-akụzi ọbụladị otu asụsụ Naịjirịa iji kwalite omenala ndị nakwa njikọ.
Cheta na ọkwa ọhụrụ a na-abịa dịka ụlọomeiwu Kano steeti malitere itulegharị iwu nke ga-eme ka Hausa bụrụ asụsụ e ji akụzi ihe n'ụlọakwụkwọ gọọmentị niile dị na steeti ahụ.
Kedụ ihe ụmụafọ Naịjirịa na-ekwu maka atụmatụ ọhụrụ a?
Ọtụtụ na-akwado atụmatụ a, ebe ụfọdụ na-akatọ ya.
Otu onye kpọrọ onwe ya Dkta Bukola bụ onye akara ọba ozi ya na X bụ@blockofbuilders katọrọ atụmatụ ahụ sị,"Ọ ga-adọghachi aka elekere azụ ma gosikwa ileda omenala na njirimara ndị anya."
n'otu aka ahụ, @yorubachic kwuru na "dịka mba ndị ọzọ n'ụwa na-agba mbo iji chekwaa asụsụ ọdịbendị ha, Naijiria na-amachi nke ya."
Ọ rụtụrụ aka na mba Gana malitere atụmatụ iji asụsụ ha akuzi akwụkwọ na nsonso a.
Mana @Galaalex4 toro atụmatụ ọhụrụ ahụ, sị: "Ekele dịrị Chukwu Gọọmentị Naijiria amachiela iji asụsụ ọdịbendị akụzi akwụkwọ, naanị Bekee bido ugbua gaa n'ihu."









