Mba Venezuela akatọọla egwu Trump yiri maka imechi ụzọ ụgbọelu n’ikuku mba ahụ
Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Nọvemba 2025.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu
Igbo mụrụ nze mụọ ọzọ!
Unu asaala chi? Anyị ji obiọma na-anabata gị n'ọbaozi BBC Igbo taa ma na-asị ka ụbọchị taa gaara gị nke ọma.
Biko buru oche gị bịa n'ọnyere n'ọgbakọ BBC Igbo dị iche iche maka ị gụrụ, ikiri nakwa igere akụkọ na-eme n'ụwa gbaa gburu gburu
Ndewo!
Ekele dịrị Gọvanọ Alex Otti maka ị ga leta Nnamdi Kanu n’ụlọmkpọrọ na Sokoto - Ejimakor
Ebe foto si, Governor Alex Otti / X and Aloy Ajimakor / x
E nyela Gọvanọ Abia steeti bụ Alex Otti nnukwu ụkpa ekele maka ị ga n’ụlọmkpọrọ dị na Sokoto steeti ga leta Nnamdi Kanu.
Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor ji akara soshal mịdịa
ya nwere kwuo nke a ma sị “a na m ekele Gọvanọ Alex Otti maka imezu
nkwa ị ga leta nwanne ya nwoke bụ Nnamdi Kanu”.
Ejimakor gara n'ihu gwa Alex Otti na "ọ bụ nwoke na-eme nke o kwuru. Chukeu gozie gị”.
“Ka njem nleta nke mbụ a ị mere bụrụ ihe
ga-enyereka kwụsị mmegbu nke a n’oge na-adịghịanya”.
Anyị akwụsịla ịgba abụbọọrụ maka ndị nwere nsogbu ahụike - NARD
Ebe foto si, NARD/X
Otu jikọtara ndị dọkịnta na Naịjirịa bụ Nigeria Association
of Resident Doctors (NARD) akwụsịla ịgba
abụbọ ọrụ.
Cheta na NARD bidoro ịgba abụbọ ọrụ na Nọvemba 1, 2025 dịka ha na-azọ maka ọdịmma nke ha nakwa nkwalite ọnọdụ ahụike na Naịjirịa.
N'ozi otu ahụ wepụtara n'akara X soshal Midia ha ka ha kwuru
sị "anyị na-akwụsị ịgba abụbọ ọrụ ma nye gọọmenti izuụka ano ka ha hazie
ihe na-eseokwu".
"Anyị mere nke a maka inweta ezigbo ọzụzụ, ọnọdụ e si
arụ ọrụ dị mma nakwa ka ngalaba ahụike dị mma".
"Ihe anyị na-ekwu bụ na ndị dọkịta kwesiri ka a
na-akwanyere ha ugwu, ndị nwere nsogbu ahụike kwesiri inweta ezigbo ọgwụgwọ,
ebe Naịjirịa niile kwesịrị inweta ngalaba ahụike na-arụ ọrụ".
Ha gara n'ihu kwuo na "anyị ga-alọghachi jiri obi anyị niile bido ọrụ, ọ bụghị
maka na nsogbu anyị nwere agwụla mana ọ bụ maka na ndị ọrịa anyị na-agwọ chọrọ ka
anyị bido".
Ndịagha Naịjirịa azọpụtala ụmụagbọghọ 12 ndịagha nnupụisi tọọrọ na Borno
Ndịagha Naịjirịa ekwuola na ha zọpụtara ụmụagbọghọ iri na abụọ
nke ndịagha nnupụisi Boko Haram/ISWAP tọọrọ na mpaghara Mussa, dị n’okpuru ọchịchị
Askira/Uba nke Borno steeti.
Nke a bụ ihe ndịagha Naịjirịa kwupụtara n’akara soshal midịa
ha n'ụbọchị Sọnde 30 Nọvemba 2025.
Ha kwuru na ndịagha nnupụisi ahụ tọọrọ ụmụaka ahụ dị agbata
afọ iri na ise na iri abụọ, n’ụbọchị Sọnde Nọvemba 23 ka ha na-aghọrọ ihe ubi
n'ugbo ezinụlọ ha.
Mana a tọhapụkwara ha na Satọde, 29 Nọvemba, mgbe ndịagha
Operation HADIN KAI malitere ọrụ ngwa ngwa na mpaghara ndịda Borno.
Ha gara n’ihu kwuo na ha kpọgara ụmụagbọghọ ahụ a zọpụtara
n'ebe a na-echekwa ha nke ọma, ya n’ebe a na-enye ha nlekọta ahụike zuru oke.
“Mgbe emechara usoro ndị a, a ga-ejikọghachi ha na ezinụlọ
ha n'ụzọ iwu kwadoro,” ka e kwuru.
Ndịagha Naịjirịa kpọkuru obodo nọ na mpaghara ahụ ka ha gaa
n'ihu na-akwado ọrụ ndị na-aga n'ihu site n'inye ozi a pụrụ ịtụkwasị obi na nke
dị mkpa, maka njikọta dị oke mkpa iji merie iyi ọha egwu na ijide nchekwa na-adịgide
adịgide.
Mmadụ anọ anwụọla maka mwakpo ebe a na-eme ncheta ọmụmụ nwatakịrị na Kalịfọnịa
Nkọwa foto, Mmadụ anọ anwụọla maka ịgba egbe ebe a na-eme ncheta ọmụmụ nwatakịrị na Kalịfọnịa
Opekatampe mmadụ anọ anwụọla n'ọgbaaghara dara mgbe a
na-agba egbe n'ebe a na-eme emume ncheta ọmụmụ nwatakịrị na Kalịfọnịa.
Mmadụ iri ndị ọzọ merụrụ ahụ n'ọgbaaghara ahụ mere n'otu ụlọ
nri n'abalị Satọde, n'obodo Stockton nke dị n'ebe ugwu steeti ahụ.
Ndị uweojii obodo ahụ kwuru na ndị nwụrụ gụnyere ndị okenye
na ụmụaka. E kwubeghị ihe ọbụla banyere ọnọdụ ndị merụrụ ahụ.
A mabeghị ebe onye a na-enyo enyo maka mwakpo ahụ nọ ugbua
mana ndị uweojii na-ekwu na ha kwenyere na ọ ga-abụ ogbugbu "e lekwasịrị
anya" gbua.
Ka ọ dị ugbua, ụlọọrụ ndị uweojii nke mpaghara San Joaquin
kwuru na ịgba egbe ahụ mere obere oge tupu elekere iri na asatọ nke ụtụtụ Sọnde,
ma na-arịọ onye ọ bụla nwere "ozi, vidiyo, maọbụ onye hụrụ ihe ọ bụla
merenụ" ka ọ bịa kwupụta ya.
Mba Venezuela akatọọla Trump maka iyi egwu imechi ụzọ ụgbọelu n’ikuku mba ahụ
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ndị Venezuela na-ebo Onyeisiala Trump ebubo iyi egwu “nke ndị ọchịchị aka ike".
Venezuela ejiri iwe zaghachi okwu Onyeisiala mba Amerịka bụ
Donald Trump kwuru na e kwesịrị imechi ụzọ ikuku na gburugburu mba ahụ.
Minista mba ofesi nke mba ahụ kpọrọ okwu Trump "mwakpo ọzọ
dị oke njọ, nke iwu na-akwadoghị na nke na-enweghị isi megide ndị
Venezuela".
O kwuru na mba Amerịka enweghị ikike iwu imechi ụzọ ikuku mba ọzọ ebe
okwu ndị Venezuela boro Trump ebubo iyi egwu “nke ndị ọchịchị aka ike".
Mba Amerịka ewulitela ọnọdụ ndịagha ha na mpaghara ebe ahụ
ma mee opekatampe ihe ruru mwakp ugboro
iri abụọ na otu n'ụgbọmmiri ha kwuru na ha bu ọgwụ ike, gbuo ihe karịrị mmadụ
iri asatọ.
Ha enyebeghị ihe akaebe mana Onyeisiala Venezuela bụ Nicolás
Maduro kwuru na ihe ndị Amerịka mere bụ ịgba mbọ ịchụpụ ya.
Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma ụnụ.
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 30 Nọvemba, 2025.
Ekpere anyị bụ ka Chineke zaa anyị niile ekpere taa.
Gaa n'ihu nọnyere anyị dịka anyị na-ewetere ụnụ akụkọ niile
si n'ala Igbo, na Naịjirịa nakwa ụwa niile.
Ikpeazu, Reno, Ugwuanyi na Fani-Kayode so na ndị Tinubu họpụtara n'ọkwa 'ambassador'
Ebe foto si, Ikpeazu/Ugwuanyi/Reno/Fani-Kayode/Facebook
Onyeisiala Bola Tinubu ahọpụtala aha mmadụ iri atọ na abụọ ọzọ
bụ ndị ga-anọchiteanya Naịjirịa n amba dị iche iche n’ụwa a kpọrọ ‘Ambassadors’
na Bekee.
N’akwụkwọ ozi abụọ dị iche iche o degaara Onyeisi ụlọomeiwu
na Naịjirịa bụ Godswill Akpabio, Tinubu gwara ha ga-enyochaa ma tinye aka
nkwado n’inye ndị a ọkwa na-egbughi oge.
Aha ndị e wepụtara n’ogogo ndị nnọchiteanya a kpọrọ ‘career
ambassadors’ dị mmadụ iri na ise gụnyere; Enebechi Monica Okwuchukwu (Abia),
Yakubu Nyaku Danladi (Taraba), Miamuna Ibrahim Besto (Adamawa), Musa Musa
Abubakar (Kebbi), Syndoph Paebi Endoni (Bayelsa), Chima Geoffrey Lioma David
(Ebonyi) and Mopelola Adeola-Ibrahim (Ogun).
Ndị ọzọ bụ Abimbola
Samuel Reuben (Ondo), Yvonne Ehinosen Odumah (Edo), Hamza Mohammed Salau
(Niger), Ambassador Shehu Barde (Katsina), Ambassador Ahmed Mohammed Monguno
(Borno), Ambassador Muhammad Saidu Dahiru (Kaduna), Ambassador Olatunji Ahmed
Sulu Gambari (Kawara) and Ambassador Wahab Adekola Akande (Osun).
Ndị aha ha dị n’ogogo ‘non-career ambassador’ gụnyere; Barrister Ogbonnaya Kalu si Abia, Reno Omokri
bụbu onye enyemaka onyeisiala (Delta), Mahmud Yakubu bụbu onyeisi ụlọọrụ Inec,
Onye bụbu nwunye Gọvanọ Ekiti Steeti bụ Erelu Angela Adebayo na Ifeanyi
Ugwuanyi bụbu Gọvanọ Enugwu Steeti.
Ndị ọzọ bụ Tasiu
Musa Maigari bụbu onyeisi ụlọomeiwu nke Katsina Steeti, Yakubu N. Gambo bụbu Kọmishọna
na Plateau Steeti, Ọkammụta Nora Ladi Daduut, Otunba Femi Pedro, Femi
Fani-Kayode bụbu mịnịsta njem ụgbọelu si Osun Steeti na Ọkaiwu Nkechi Linda
Ufochukwu si Anambra Steeti.
Aha ndị ọzọ sokwa n’akwụkwọ a bụ Fatima Florence Ajimobi
bụbu nwunye Gọvanọ Oyo Steeti, Lola Akande bụbu Kọmishọna Legọs Steeti, Grace
Bent bụbu Sịnetọ n’Adamawa Steeti, Victor Okezie Ikpeazu bụbu Gọvanọ Abia
Steeti, Sịnetọ Jimoh Ibrahim nke Ondo Steeti na Paul Oga Adikwu si Benue Steeti.
A na-atụ anya na ndị a Tinubu họpụtara ga-anọchiteanya Naịjirịa
na mba ndị ha nwere ezi mmekọrịta dịka Chaịna, India, Saụt Korea, Kanada, Meziko,
United Arab Emirates, Qatar, Saụt Afrịka, Kenya, nakwa otu ndị dịka United
Nations, UNESCO na African Union.
Ha ga-amata mba ebe a ga-eziga ha ma ọ bụrụ na ndị ụlọomeiwu
Sịnetị kwadoo nhọpụta ha.
Ha ndị mbụ Onyeisiala Tinubu zigaara n’izuụka gara aga gụnyere
Ayodele Oke (Oyo), Amin Mohammed Dalhatu (Jigawa) na Lateef Kayode Are (Ogun) bụ
ga-anọchiteanya Naịjirịa na mba Briten, Amerịka na Fransị ma ọ bụrụ a kwadoo
ha.
Tinubu kwuru na aha ndị ọzọ ka na-abịa.
"Kwụsị inye akwụkwọ ikikere asylum" - Donald Trump
Nkọwa foto, "Kwụsị inye akwụkwọ ikikere asylum" - Donald Trump
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na a ga-akwụsị 'asylum' nke bụ inye ndị mmadụ si mba ọzọ ohere ịgbaba na mba Amerịka.
O kwuru nke a maka ọnwụ onye ọrụ nchekwa onye ojiegbe gbaburu n'ime mmadụ abụọ ọ gbara egbe na Washington DC, onyeisi Citizenship and Immigration Services (USCIS) na Amerịka ekwuola nke a.
Joseph Edlow sị na nkwụsịtụ a ga-adị "ruo mgbe anyị nwereike ilebanya na ndị niile debaranyela akwụkwọ ruo ogogo kwesịrị".
Ebe foto si, Getty Images
Nke a na-abịa elekere ole na ole Onyeisiala Donald Trump foro ntututaa na "na ọ ga-akwụsị mbịarambịara" sị "mba niile ka na-etolite".
Atụmatụ ọhụrụ a na-eme dịka otu onye ọrụ nchekwa dị afọ 20 nwụrụ n'ụbọchị Wenezde, ebe onye ọzọ ka nọ n'ụlọọgwụ na-azọ ndụ ya nke ndị isi mba Amerịka na-ebo onye mba Afgan na o mere.
Rọshịa atụọla ogbunigwe droonu na Kyiv n’agbanyeghị atụmatụ udo
Ebe foto si, Reuters
Droonu na
ogbunigwe mba Rọshịa adaala n’isi obodo Yukren bụ Kyiv, ma gbuo opekatampe otu
onye, ma merụọ mmadụ asaa ndị ọzọ ahụ.
Ndị ọchịchị obodo
kwuru na Rọshịa ji ogbunigwe na droonu mee mwakpo ahụ n’ebe obibi ndị mmadụ.
N’ụzọ ụtụtụ Satọde
ka a tụrụ ogbunigwe n’ụlọ obibi ndị mmadụ n’ụfọdụ mpaghara Kyiv, dịka a nụkwara
ụda ihe ntiwa n’obodo ahụ.
Onyeisioche Kyiv
bụ Vitaly Klitschko kwuru na nwata dị afọ iri na atọ so na ndị merụrụ ahụ, dịka
e bugara mmadụ anọ ụlọọgwụ.
Na mmalite izuụka
a ka e mekwara ụdị mwakpo a na Kyiv ma gbuo mmadụ asaa, ka ndị ọchịchị Yukren
kwuru.
E mere mwakpo nke
ikpeazu a dịka ndị nnọchiteanya Yukren na-akwado ka ha na ndị ọchịchị mba Amerịka
nwee mkparịtaụka na ngwụcha izuụka a gbasara atụmatụ udo mba Amerịka e megharịrị
emegharị.
Igbo bụ Igbo, unu asaala chi, Ka ngwụcha izu a maara onye niile mma!
Obiụtọ na obi aṅụrị ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde Eke 29 Nọvemba, 2025.
Gaa n'ihu nọnyere anyị maka akụkọ niile si n'ala Igbo, na Naịjirịa nakwa n'akụkụ ụwa dị iche iche.
Kedụ mba ndị na-emepeghị emepe Trump kwuru na ya ga-akwụsị ụmụafọ ha ịbanye Amerịka?
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba
Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ya ga-akwụsị ndị si na mba ndị na-emepeghị
emepe ọ kpọrọ “third world countries” ịbata mba Amerịka.
Ka ọ dị, Trump enyeghị
ozi rijuru afọ maọbụ kpọọ aha mba ndị ọnọdụ a ga-emetụta.
Onyeisiala Amerịka
gakwara n’ihu boo ndị gbara ọsọ ndụ ebubo ibute “ala adịghị mma n’Amerịka”, ma ṅụọ iyi na ya ga-ewezuga “onye ọbụla na-abaghị
uru” nye mba Amerịka.
Trump kwuru nke a
dịka ọ gachara otu ụbọchị e boro otu nwaamaala Afganịstan ebubo na ọ gbara ndịagha
National Guard abụọ egbe na Washington DC, dịka otu n’ime ha nwụrụ n’ụbọchị Tọzde
27 Nọvemba.
Onyeisi ụlọọrụ United
States Citizenship and Immigration Services bụ Joseph Edlow kwuru na dabere na
ntuziaka Trump, ọ nyela ntuziaka ka e nyochagharịa akwụkwọ “Green Card” ndị
niile si mba e lakwasara anya n’ụzọ tara ọchịchị.
N’ọnwa Juun ka
Onyeisiala Trump binyere aka n’akwụkwọ iwu, bụ nke tinyere mmachibido njem maka
ụmụafọ mba iri na abụọ, ma gbochie ụmụafọ mba asaa ndị ọ kpọrọ ‘mba ndị e
lekwasara anya’.
Mba ndị ahụ gụnyere:
Afganịstan – A kwụsịla ụmụafọ Afganịstan ịbanye mba Amerịka dịka ndị mbịarambịa na ndị njem kpamkpam.
Ụlọikpe Mkpegharị
dị n’Abuja atụfuola akwụkwọ mkpegharị onyendu otu Indigenous People of Biafra
(IPOB) bụ Nnamdi Kanu.
Nke a bụ maka akwụkwọ
mkpegharị Kanu gbara megide nchabi ikpe Ọkaikpe Taiwo Taiwo nke Ụlọikpe Ukwu
Etiti dị n’Abuja, bụ nke kachapụrụ akwụkwọ Kanu gbara megide Onyeisi DSS, ụlọọrụ
DSS na Nnukwu Ọkaiwu Naịjirịa n’ebubo imetọ ikike ya.
Na nchabi ikpe
ha, ndị Ọkaikpe mmadụ atọ nke Ụlọikpe Mkpegharị kwuru na ebubo Kanu boro na e
metọrọ ikike dịịrị ya dịka mmadụ, ikike ịnata ezi nlekọta ahụike na ikike
okpukperechi enweghịzi isi, n’ihi na a maala ya ikpe ma tụọ ya mkpọrọ.
Oge ọ na-ekwupụta
ikpe ahụ, Ọkaikpe Moses Ugo kwuru na okwu ahụ enweghịzi isi, n’ihi na Ọkaiwu
Nnamdi Kanu kwetara na e ji Kanu eji n’ụlọmkpọrọ dị na Sokoto, ebe ụlọikpe ahụ
enweghị ikike inye iwu ka a kpọgaa ya n’ụlọmkpọrọ dị na Kuje, bụ ebe ọ chọrọ ka
a kpọgaa ya site n’ụlọnga DSS.
Ọkaikpe Ugo kwuru
na ebe ọ bụ na Kanu eburula ụzọ họrọ ụlọmkpọrọ ọ chọrọ ịga, na ụlọikpe ahụ
agaghị enwekwa ike nabata arịrịọ ya, n’ihi na a maala ya ikpe ma kpọgaa ya n’ụlọmkpọrọ
ọ chọrọ ịga.
Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ọkụ Hong Kong arịala ruo 128
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, A chọpụtara na mkpu ọkụ anaghị arụ ọrụ nke ọma dịka ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ si kwuo.
Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ọkụ gbara na Hong Kong eruola mmadụ 128, ebe a ka na-achọ ọtụtụ
ndị mmadụ na ọkụ ahụ gbara ebe obibi.
Akụkọ kwuru n’ihe ruru mmadụ iri asaa na itoolu merụrụ ahụ, ebe ndị mmadụ ruru iri na isii
ka nọ n’ime ụlọ ahụ gbara ọkụ.
A chọpụtara na mkpu ọkụ anaghị arụ ọrụ nke ọma dịka ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ
si kwuo.
Ndị ọkachamara gwara BBC na akụrụngwa ndị e ji arụ ụlọ a hụrụ n’ime ụlọ ahụ
eji emezi ụlọ ahụ bụ ihe kpatara ọkụ ahụ ji fesasịa.
Ndị be anyị, ụnụ abọọla chi?
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde, Nọvemba 28, 2025. Ekpere anyị bụ ka ụbọchị taa mara anyị mma.
Biko, sonyere anyị dịka anyị na-ewetere unu akụkọ ihe na-eme Naịjirịa nakwa ụwa niile.
Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.
Udo dịrị ụnụ!
Goodluck Jonathan alọghachila Naịjirịa dịka ndịagha kwatuchara ọchịchị na Guinea-Bissau
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan
Goodluck Jonathan
bụbu onyeisiala Naịjirịa, bụ onye nọ na mba Guinea-Bissau oge ndịagha weghaara ọchịchị
n’ike alọghachila.
Ụjọ jidere onye
niile gbasara nchekwa Jonathan oge ozi nkwatu ọchịchị fesara ebe niile dịka ọ nọ
na mba ahụ oge ndịagha nwuchiri onyeisiala Guinea-Bissau.
Na mbụ ka ọnụ
na-ekwuchitere Goodluck Jonathan bụ Ikechukwu Eze gwara BBC na e nweghị ihe na-eme
Jonathan, ma kwuo na ọ ga-ahapụ mba ahụ oge ọbụla e nyere nkwado maka nke ahụ.
Eze kwuru nke a dịka
ozi fesara ebe niile na Jonathan tọrọ na mba Guinea-Bissau oge ndịagha kwaturu ọchịchị
n’ike n’ụbọchị Wenezde 26 Nọvemba, 2025.
Goodluck Jonathan
bụ otu n’ime ndị ndu Afrịka gara ozi n’aha otu African Union (AU), Economic
Community of West African States (ECOWAS) nakwa West African Elders Forum
(WAEF) na mba Guinea-Bissau iji hụ ka ha si hazie ntuliaka onyeisiala n’ụbọchị
Sọnde 23 Nọvemba, 2025.
Ndịagha kpachiri ọhịchị
na Guinea-Bissau kwuru na ha emechiela okeala mba ahụ niile, ma tinyekwa iwu
onye apụtakwala ezi n’oge abalị.
Lee ndị Onyeisiala Tinubu họpụtara maka mkparịtaụka Naịjirịa na mba Amerịka
Ebe foto si, Presidency/X
Onyeisiala Bola Tinubu ahọpụtala ndị ha na mba Amerịka ga-arụkọ ọrụ iji hụụ na e gboro nsogbu nchekwa dị na Naịjirịa.
Nhọpụta ndị a so na nkwekọrịta e nwere n’oge onye ndụmọdụ nchekwa
bụ Nuhu Ribadu kpọọ ndị nnochiteanya Naịjirịa gaa mba Amerịka maka mkparịtaụka.
Ribadu ga-abụ onyendu ndị nke si na Naịjirịa, ebe ndị ọzọ ọkwa
ha dị elu na gọọmentị ga-enyere ya aka n’uzo ahụ.
Onye ndụmọdụ pụrụiche nke Onyeisiala bụ Bayo Onanuga n’ozi
o wepụtara kwuru na ndị a gụnyere;
Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ bụ
Yusuf Maitama Tugar, Mịnịsta nchekwa bụ Mohammed Badaru Abubakar, Mịnịsta ihe
na-eme n’ime obodo bụ Olubunmi Tunj-Ojo, Mịnịsta na-ahụ maka ọdịmma ndị mmadụ bụ
Bernard M. Doro, Onyeisi ndị ọrụ nchekwa bụ Ọchịagha Olufemi Oluyede, Onyeisi ụlọọrụ
National Orientation Agency bụ Mohammed Mohammed na onyeisi ndị uweojii bụ
Kayode Egbetokun.
Ndị ọzọ gụnyere, Nwada Idayat Hassan nke ụlọọrụ ndụmọdụ nchekwa na Paul Alabi nke ụlọ nnọchiteanya
Naịjirịa na mba Amerịka.
Onyeisiala Tinubu gwara ndị a ka ha gbaa mbọ rụsie ọrụ ike iji
hụụ na ha na mba Amerịka nwere ezi mmekọrịta ga-amịta mkpụrụọma.
Ihe ndị uweojii kwuru maka akụkọ mwakpo ụgbọala Sịnetọ Chris Ngige
Ebe foto si, Anambra Police
Ndị uweojii
Anambra Steeti ekwuola na ha e nwetela ụgbọala ndị ojiegbe ahụ a sị wakporo ụgbọala
Chris Ngige bụbu Gọvanọ Anambra Steeti.
N’ozi ọnụ
na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga wepụtara, o kwuru na ndị
ojiegbe ahụ hapụrụ ụgbọala gbaa ọsọ mgbe ha na ndị uweojii na-achụ ha ọsọ
na-akwakọrịta egbe.
O kwuru na
ndị ojiegbe ahụ wakporo ndị uweojii nọ n’ọrụ nchekwa na mpaghara Eziowelle dị n’okporoụzọ
Umuoji bụ ndị a sị na-eso ụgbọala na-ebu Chris Ngige bụbu Mịnịsta ndị ọrụ na Naịjirịa.
Mana o kwughi ma Ngige oso n'ụgbọala ahụ mgbe nke a mere.
BBC Igbo kpọtụụrụ Ngige n'ekwentị ịnụta n'ọnụ ya banyere nke a mana ọ zaghị ekwentị ya rute mgbe akụkọ a pụtara.
Ikenga kwuru
na ndị uweojii malitere ịchụ ndị ojiegbe ahụ ọsọ nke mere ha jiri na-agbarịta
onwe ha egbe ma mechaa hapụ ụgbọala ha gbaa ọsọ.
Ọ gara n’ihu
kwuo na ndị mgbọ egbe tụtara otu onye uweojii mana ọ na-anata ọgwụgwọ ugbua,
ebe e burula ụgbọala ndị ojiegbe ahụ dosa n’ụlọọrụ ndị uweojii maka ime
nnyocha.
Ndị uweojii
Anambra steeti anwuchiela ụmụnwoke abụọ a na-enyo enyo na ha tọọrọ ndị Kameruun
atọ n’ụbọchị 10 Nọvemba 2025, n’Ọnịcha.
Ọnụ na-ekwuru ndị
uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kwupụtara nke a n’ụbọchị Tọzde 27 Nọvemba,
2025, ma kwuo na aha ndị omekome ahụ bụ Nonso Augustine Akpeh dị afọ iri atọ na
asaa nakwa Kingsley Akpeh dị afọ iri anọ na anọ.
Ikenga kwuru na
ndị uweojii nke ngalaba Rapid Response Squad dị n’Awkuzu napụtakwara ha otu
egbe pump action na otu egbe ntụ.
“Ozi anyị nwetara
n’aka ụmụnne ndị ahụ a tọọrọ kpughere na ha gara njem azụmaahịa n’Ọnịcha tupu a
tọrọ ha,” ka Ikenga kwuru.
O kwukwara na ndị
ntọ ahụ jụrụ ịtọhapụ ha bụ mmadụ atọ, ọbụnadị mgbe ha kwụchara nde naịra abụọ n’ime
nde naịra itoolu ndị omekome gwara ha kwụọ.
Ebe foto si, Anambra State Police Command
Oge a na-agba ha ajụjụ, ha kpọkwara Uchenna Nicholas Mmadu aha dịka onye na-agbakọrọ ha aka.
Ka ọ dị, ndị ahụ a na-enyo enyo duuru ndị uweojii gaa n’ọhịa dị iche iche n’obodo Anam, bụ ebe ha ji ndị ha tọọrọ.
Onye nke abụọ a na-enyo enyo bụ Kingsley Akpeh gbara mbọ iri mbọmbọ mana ndị uweojii gbara ya egbe n’ụkwụ ma nwuchigharịa ya.
Oge ndị uweojii na-achọ ndị e ji eji n’ime ọhịa, ha na ndị bi na mpaghara ahụ kparịtara ụka, nke mere ha jiri nweta ozi na a hụrụ ozu ụmụnwaanyị atọ a maghị ndị ha bụ n’elu mmiri.
Ebe foto si, Anambra State Police Command
N’ọzọ yiri nke a, ndị uweojii Anambra steeti ebughachitela ụgbọala ọkwụọtọ ekele eze Mercedes-Benz ọcha ndị omekome napụrụ mmadụ n’ike.
Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ sịrị na nke a mere oge ngalaba ndị uweojii dị iche iche e jikọtara ọnụ chụrụ ndị omekome gara wakpoo ndị uweojii nọ n’Eziowelle ọsọ.
Ikenga kwuru na ndị uweojii na ndị omekome ahụ kwarịtara onwe ha mgbọ nke mere ha jiri gbahapụ ụgbọala ahụ.
Ka o sina dị, Ikenga kpughere na otu onye uweojii merụrụ obere ahụ site na mgbọ egbe, mana ọ na-enweta onwe ya nke ọma ugbua n’ụlọọgwụ.
Ndịagha kwaturu ọchịchị n’ike na mba Guinea Bissau ekwuola na Goodluck Jonathan ‘nọ ọfụma’
Ebe foto si, Goodluck Ebele Jonathan/X
Nkọwa foto, Goodluck Ebele Jonathan
Ndịagha kwaturu
ọchịchị n’ike na mba Guinea Bissau ekwuola na onye bụbu Onyeisiala Naịjirịa bụ
Goodluck Jonathan ‘nọ ọfụma”.
Nkọwa
nke a na-abịa dịka Ndịagha kwatuchara ọchịchị ma mechie ọpụpụ na mbata mba ahụ.
Ikechukwu
Eze bụ ọnụ na-ekwuru Goodluck Jonathan mere ka a mata nke a ma kwuo na Jonathan ga-esi
mba Guinea Bissau pụọ mgbe ọbụla o wetere ikike.
Eze na-enye
nkọwa nke a dịka akụkọ na-efegharị n’ịntanet sị na Jonathan na ndị ọzọ tọrọ atọ
mgbe ndịagha kwaturu gọọmenti mba ahụ.
Jonathan so
na ndị otu jịkọrọ Afrịka bụ African Union, na Economic Community of West African States
(ECOWAS) nakwa West African Elders Forum
zigara mgbe a na-eme ntuliaka na Guinea Bissau mana ha tọrọ mgbe ndịagha
weghara ọchịchị n’ike n’ụbọchị Sọnde, 23 Nọvemba, 2025.
Ndịagha ahụ nkwaturu gọọmenti mechiri oke ala mba ahụ niile ma machie ọpụpụ na mbata na mba ahụ.
Mana n’ọgbakọ
ụlọomeiwu ndị nnọchịaanya Naịirịa mere ka ha gwara gọọmenti ka o jiri usoro
niile ha were mee ka Jonathan nakwa ndị Naịjirịa ndị ọzọ tọrọ atọ na mba ahụ lọghachịta
ngwangwa.