Ọgbaghara adaala n'isiụlọọrụ pati PDP n'Abuja

PDP Headquaters

Ebe foto si, Screengrab

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ebe niile na-akpọ ghara ghara n'isiụlọọrụ otu pati PDP bụ Wadata House dị n'Abuja dịka alaka PDP abụọ kwatara n'ehihie Tuzde 18 Nọvemba, 2025..

Oke n'ọsọ, ngwere n'ụzọ dịka a kwara mgbọ ma gbaa anwụrụ ose nke mere ka ebe niile na-ede jiji dịka otu alaka pati PDP gbaliri ịkwụsị alaka nke ọzọ ịbata n'isi ụlọọrụ.

Bala Mohammed, gọvanọ Bauchi Steeti

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Bala Mohammed na Seyi Makinde bụ gọvanọ abụọ kwesiri banye n'ogige isiụlọọrụ PDP

Nsogbu dapụtara dịka ọgbakọ PDP nọrọ Ibadan chụọ ụfọdụ ndị otu ha mmadụ 11 gụnyere Minista na-ahụ maka Abuja bụ Nyesom Wike nakwa Onye bụbụ onyeisioche Pati ahụ bụ Samuel Anyanwụ.

Ndị imeọbị pati ahụ họrọ ọhụrụ(alaka nke Taminu Turaki) kara nzukọ n'isi ụlọọrụ ahụ mana ndị ochie kwechiri jụ inye ha ohere ịbata na Wadata Plaza.

Mana ndị gọvanọ abụọ; Seyi Makinde nke Oyo Steeti nakwa Bala Mohammed nke Bauchi Steeti siri ọnwụ bata n'ogige isi ụlọọrụ PDP.

Ndị a hụrụ n'ogige PDP

Ebe foto si, Screengrab

Ndị mmadụ tụrụ n'ụlọọrụ ahụ dịka ndị na-akwado Wike nakwa ndị na-akwado alaka nke ọzọ wujuru n'ogige PDP na-azọ onye ike ya ga-aka.

Cheta na ụbọchị Satọde, ndị PDP nwere ọgbakọ ọha ebe ha nọ nwee ọtụtụ mkpebi nke gụnyere ịhọpụta ndị ọhụrụ ga-achị pati ahụ nakwa ịchụ ụfọdụ ndị otu ha n'ọrụ maka ikpa agwa megidere ọdịmma pati ha.