Ijeoma Nneke: Ụlọikpe amaala onye gburu nwagbọghọ 'makeup artist' ikpe ọnwụ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọikpe Ukwu dị n'Enugwu Steeti amaala otu nwaanyị ikpe ọnwụ maka ọnwụ otu nwaagbọghọ ọrụ ya bụ itechasị ndị mmadụ.

Ijeoma Neke: Ihe a ma maka mwaada ọnwụ ya wuru ebe niile

Ebe foto si, Ijeoma Neke/Facebook

Nkọwa foto, Ijeoma Neke bụbu nwaada na-eme ihe ntecha a kpọrọ "makeup artist" na Bekee

N'ikpe e kpere n'abalị asaa nke ọnwa Febụwarị, afọ 2024,Ọkaikpe Jọstịs K. I Okpe, onye kwuru na ikpe mara Chiamaka Ifezue nyere mkpebi ka a kwụgbụọ ya maka ogbugbu Ijeoma Nneke gbara afọ 27 bụ onye e gburu n'abalị 11 nke afọ.

Cheta na n'afọ 2020, akụkọ fegharịrị na soshal midia kwuru na a na-a chọwa Nneke achọ dịka o kwuchara na o nwetara ọrụ ịga techa mmadụ n'ụlọ ya.

A hụrụ ozu ya ka abalị ole na ole gachara nke mere ka ndị uweojii malite nnyocha ihe gburu ya nke dugara ha na ụmụnne abụọ;otu nwoke na ootu nwaanyị bụ ndị a kpụpụrụ ụlọikpe maka ebubo na ha manyere nwada ahụ lara mmụọ ọ ṅụọ nsi

Mana e mechara tọhapụ nwanne Chimaka nke nwoke.

A chọtala ngwongwo ọrụ Ijeoma Neke n'aka ụmụnne abụọ a na-enyo maka ogbugbu ya

Ijeoma Neke

Ebe foto si, Ijeoma Neke

Ndị akaebe na-ekwu ọnụ ha ugbua n'ikpe dị n'etiti ụmụnne abụọ, Emeka na Chiamaka Ifezue, e boro ebubo na ha jikọrọ aka ọnụ gbuo nwagbọghọ na-eme ihe ntecha "make-up" n'Enugwu.

N'ikpe ahụ pụtara n'ihu Ọkaikpe Kenneth Okpe, n'ụlọikpe High Court dị n'Enugwu, n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Febrụwarị 2022, ndị akaebe kwuputere ihe ha ma maka Ijeoma Neke, bụ onye e gburu ma wụọ 'acid' n'ihu.

Onye nnọchite anya nke gọọmenti na ngalaba Department of Public Prosecution (DPP) bụ Ọkaiwu C.C Chigbo, wepụtara ihe ngosi nkata a kpara akpa (SMS na "call log"), n'etiti Ijeoma na ndị a na-enyo maka ogbugbu ya; ganye na ọ gara n'ụlọ ha.

Ọkaiwu Chigbo gosikwara ebe Ijeoma gwara enyi ya nwoke na Whatsapp na ọ nọ na nsogbu tupu e gbuo ya.

Ndị uweojii hụkwara akpa ngwa ntecha (makeup bag) Ijeoma nakwa ekwentị ya n'ụlọ ụmụnne abụọ a na-enyo maka ogbugbu ya, dịka ndị ụlọikpe si kwuo.

Cheta na ọ bụ na 11 nke ọnwa Nọvemba 2020 ka a hụrụ Ijeoma anya ikpeazụ dịka ọ gawara ọrụ ntecha a n'Enugwu.

Dịka akụkọ si kwuo, mgbe ọ garuru ka ọ chọpụtara na ọ bụ Chiamaka kpọrọ ya ọrụ.

Ndị ụlọikpe hụrụ mkparịtaụka dị n'etiti Ijeoma na enyi ya nwoke mgbe ọ garuru ụlọ Chiamaka, ebe ọ na-agwa ya na egwu na-atụ ya n'ihi na ọ ghọtaghị ụdịrị ọrụ akpọrọ ya.

O kwuru na Chiamaka gwara ya na ọ na-agba nkwụ, mana ka ọ bịara ibido ọrụ ntecha ọ bịara, ọ hụrụ na onweghi nkwụ ọbụla a na-agba ebe ahụ.

N'ime ụbọchị ole ma ole a malitere ịchọ Ijeoma ka e mechara chọta ozu ya ka ọ tọgbọrọ n'ụzọ, ebe a wụrụ ya 'acid' n'ihu.

Ọkaikpe Okpe yigharịrị ya bụ ikpe gaa Maachị 22, 24, na 29, iji malitekwa ma kpebie ikpe ahụ.

Ihe anyị ma maka Ijeoma Neke:

  • Ijeoma toro n'Owerri, Imo steeti ma gụọ akwụkwọ praịmarị n'ụlọakwụkwọ 'police children school', Owerri
  • Ọ gara akwụkwọ mahadum na 'Imo state University' malite n'afọ 2010 ruo 2014
  • O nwetara ọzụzụ na ngalaba 'Psychology'
  • Ọ bụ onye ọrụ ntecha nke bekee kpọrọ "makeup artist"
  • Akụkọ kwuru na ọ bụ n'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Nọvemba (21 Nọvemba, 2020) ka a malitere ịchọ Ijeoma achọ
  • Dịka akụkọ si kwuo, otu onye kpọrọ ya n'ekwentị ka ọ bịa techaa ya ihu
  • Ka ụbọchị ole ma ole gara, a hụrụ ozu Ijeoma ka ọ tọgbọ n'okporo ụzọ, n'Enugwu
  • Ọ bụ akara ekwentị onye ahụ kpọrọ Ijeoma ọrụ ka ndị uweojii jiri jide ndị a na-ebo ebubo igbu ya.

Nne Ijeoma bere akwa arịrị n'ụlọikpe n'ụbọchị Tọzde oge a malitere ikpe mmadụ abụọ eboro ebubo na ọ bụ ha gburu nwata nwaanyị ahụ.

Lee ihe BBC Igbo hụrụ oge anyị gara ụlọikpe maka ikpe ya n'ụbọchị 29 nke ọnwa Julaị afọ 2021:

Skip Facebook post, 1

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 1

Skip Facebook post, 2

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 2

Aha onyonyo, Onye gburu Onyebuchi Rita?