Ijeoma Nneke: Ụlọikpe amaala onye gburu nwagbọghọ 'makeup artist' ikpe ọnwụ
Ụlọikpe Ukwu dị n'Enugwu Steeti amaala otu nwaanyị ikpe ọnwụ maka ọnwụ otu nwaagbọghọ ọrụ ya bụ itechasị ndị mmadụ.

Ebe foto si, Ijeoma Neke/Facebook
N'ikpe e kpere n'abalị asaa nke ọnwa Febụwarị, afọ 2024,Ọkaikpe Jọstịs K. I Okpe, onye kwuru na ikpe mara Chiamaka Ifezue nyere mkpebi ka a kwụgbụọ ya maka ogbugbu Ijeoma Nneke gbara afọ 27 bụ onye e gburu n'abalị 11 nke afọ.
Cheta na n'afọ 2020, akụkọ fegharịrị na soshal midia kwuru na a na-a chọwa Nneke achọ dịka o kwuchara na o nwetara ọrụ ịga techa mmadụ n'ụlọ ya.
A hụrụ ozu ya ka abalị ole na ole gachara nke mere ka ndị uweojii malite nnyocha ihe gburu ya nke dugara ha na ụmụnne abụọ;otu nwoke na ootu nwaanyị bụ ndị a kpụpụrụ ụlọikpe maka ebubo na ha manyere nwada ahụ lara mmụọ ọ ṅụọ nsi
Mana e mechara tọhapụ nwanne Chimaka nke nwoke.
A chọtala ngwongwo ọrụ Ijeoma Neke n'aka ụmụnne abụọ a na-enyo maka ogbugbu ya

Ebe foto si, Ijeoma Neke
Ndị akaebe na-ekwu ọnụ ha ugbua n'ikpe dị n'etiti ụmụnne abụọ, Emeka na Chiamaka Ifezue, e boro ebubo na ha jikọrọ aka ọnụ gbuo nwagbọghọ na-eme ihe ntecha "make-up" n'Enugwu.
N'ikpe ahụ pụtara n'ihu Ọkaikpe Kenneth Okpe, n'ụlọikpe High Court dị n'Enugwu, n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Febrụwarị 2022, ndị akaebe kwuputere ihe ha ma maka Ijeoma Neke, bụ onye e gburu ma wụọ 'acid' n'ihu.
Onye nnọchite anya nke gọọmenti na ngalaba Department of Public Prosecution (DPP) bụ Ọkaiwu C.C Chigbo, wepụtara ihe ngosi nkata a kpara akpa (SMS na "call log"), n'etiti Ijeoma na ndị a na-enyo maka ogbugbu ya; ganye na ọ gara n'ụlọ ha.
Ọkaiwu Chigbo gosikwara ebe Ijeoma gwara enyi ya nwoke na Whatsapp na ọ nọ na nsogbu tupu e gbuo ya.
Ndị uweojii hụkwara akpa ngwa ntecha (makeup bag) Ijeoma nakwa ekwentị ya n'ụlọ ụmụnne abụọ a na-enyo maka ogbugbu ya, dịka ndị ụlọikpe si kwuo.
Cheta na ọ bụ na 11 nke ọnwa Nọvemba 2020 ka a hụrụ Ijeoma anya ikpeazụ dịka ọ gawara ọrụ ntecha a n'Enugwu.
Dịka akụkọ si kwuo, mgbe ọ garuru ka ọ chọpụtara na ọ bụ Chiamaka kpọrọ ya ọrụ.
Ndị ụlọikpe hụrụ mkparịtaụka dị n'etiti Ijeoma na enyi ya nwoke mgbe ọ garuru ụlọ Chiamaka, ebe ọ na-agwa ya na egwu na-atụ ya n'ihi na ọ ghọtaghị ụdịrị ọrụ akpọrọ ya.
O kwuru na Chiamaka gwara ya na ọ na-agba nkwụ, mana ka ọ bịara ibido ọrụ ntecha ọ bịara, ọ hụrụ na onweghi nkwụ ọbụla a na-agba ebe ahụ.
N'ime ụbọchị ole ma ole a malitere ịchọ Ijeoma ka e mechara chọta ozu ya ka ọ tọgbọrọ n'ụzọ, ebe a wụrụ ya 'acid' n'ihu.
Ọkaikpe Okpe yigharịrị ya bụ ikpe gaa Maachị 22, 24, na 29, iji malitekwa ma kpebie ikpe ahụ.
Ihe anyị ma maka Ijeoma Neke:
- Ijeoma toro n'Owerri, Imo steeti ma gụọ akwụkwọ praịmarị n'ụlọakwụkwọ 'police children school', Owerri
- Ọ gara akwụkwọ mahadum na 'Imo state University' malite n'afọ 2010 ruo 2014
- O nwetara ọzụzụ na ngalaba 'Psychology'
- Ọ bụ onye ọrụ ntecha nke bekee kpọrọ "makeup artist"
- Akụkọ kwuru na ọ bụ n'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Nọvemba (21 Nọvemba, 2020) ka a malitere ịchọ Ijeoma achọ
- Dịka akụkọ si kwuo, otu onye kpọrọ ya n'ekwentị ka ọ bịa techaa ya ihu
- Ka ụbọchị ole ma ole gara, a hụrụ ozu Ijeoma ka ọ tọgbọ n'okporo ụzọ, n'Enugwu
- Ọ bụ akara ekwentị onye ahụ kpọrọ Ijeoma ọrụ ka ndị uweojii jiri jide ndị a na-ebo ebubo igbu ya.
Nne Ijeoma bere akwa arịrị n'ụlọikpe n'ụbọchị Tọzde oge a malitere ikpe mmadụ abụọ eboro ebubo na ọ bụ ha gburu nwata nwaanyị ahụ.
Lee ihe BBC Igbo hụrụ oge anyị gara ụlọikpe maka ikpe ya n'ụbọchị 29 nke ọnwa Julaị afọ 2021:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 1
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 2










