Afcon 2023: Ugo Naịjirịa arachaala Saut Afrịka ka 'banana' Ore

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụru ụwa na-anya ma mechie Bafana Bafana ọnụ etu Naịjirịa siri merie bọọlụ nke taa.
Ka agbachara agba mbụ na nke abụọ, Naịjirịa na Saụt Afrịka gbara 1-1 nke pụtara na-aga agba penaliti.
N'agba penaliti ahụ, Naịjịrịa meriri Saụt Afrịka site na inye ha ọkpọ goolu anọ nke Saụt Afrika satara nani abụ.
Ka ihe niile na-aga n'anya n'anya, Naịjịrịa mechara merie Saụt Afrịka site na penality kụkọrọ ya 4-2.
Ọgbọ ọkụ akajaala na Ivory Coast dịka Ugo Naịjirịa na Bafana Bafana Saụt Afrịka chịpụrụya n'ọgbọ egwurewu bọọlụ.
Ọ kabeghị nwe onye nyere goolu mana Saụt Afrịka anwaala ogige Naịjirịa ugboro abụọ.
Ka agbachara nkeji nke mbụ oweghị ndị nyere goolu mancha.
Bafana Bafana nwalu ogịge Ugo Naịjirịa ugboro atọ ebe Ugo Naịjirịa nwalu nke ha ugboro abụọ ma tụrụgo ọkachasị jide bọọlụ n'nkeji a.
Naịjirịa mechara jiri penaliti nye otu goolu n'agba nke mbu. Ọbụ Ekong nyere goolu ahụ.
Dịka aka na-anụlị na goolu Naịjirịa, Saụt Afrịka satara ya bụ goolu site na penaliti enyere n'aha Bafana Bafana .
Etu ahụ ka bọọlụ siri kwụrụ na 1-1.

Ebe foto si, Getty Images
Otu Super Eagles nke Naịjirịa na Bafana Bafana nke Saụt Afrịka ga-ezute onwe ha n'agba abụọ nke ikpeazụ n'asọmpi Iko Mba Afrịka bụ AFCON 2023.
Asọmpi a ga-adị n'elekere isii nke mgbede ụbọchị Wenezde 7 Febụwarị 2024 n'ọgbọegwuregwu Stade de la Paix dị n'Ivory Coast.
Ka anyị tụlee etu otu egwuregwu abụọ ndị a siri rute ogogo ha nọ ugbua n'asọmpi a.
Naịjịrịa na mbịdọ AFCON 2023 zutere Equitorial Guinea n’asọmpị nke mbu ha, gbaa onwe ha otu ọkpụ, otu ọkpu. Naịjịrịa zutekwara ndị Ivory Coast na Guinea Bissau ma merichaa ha.
N'agba mgbapụ Super Eagles gbapụrụ Kameruun ma gbapụkwa Angola n'agba anọ nke ikpeazụ (quarter finals) nke mere hz jiri tozuo oku izute Saụt Afrịka.
N'aka nke ọzo, Saụt Afrịka mara afọ n'ala mgbe ha zutere Mali na mbụ ma merie ọtụtụ asọmpi ha ndị ọzọ.
Ha meriri ndị dịka Namibia, Tunisia, Moroko na Cape Verde iji tozuo oke izute Naịjirịa ugbua.
Ihe mere oge mbụ Naijịrịa na Saụt Afrịka zulitere n'AFCON

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Naịjirịa na Saụt Afrịka ezutela onwe ha ugboro iri na anọ n'asọmpi bọọlụ egwuregwu bọọlụ, nke Naịjirịa meriri ha ugboro asaa, ha merie ugboro abụọ ebe ha gbara nghatangh ugboro ise.
A bịa n'asọmpi AFCON ha gbara na nso nso a, Naịjirịa emeriela Saụt Afrịka ugboro atọ nke mere ọtụtụ ndị ji atụ anya na Naịjirịa ga-emeri nke taa.
Asọmpị a ga-agba taa ga-abu ugboro ịrị na ịse mba abụọ ga-ezuteonwe ha.
N'afọ 2000, Naịjịrị ji ọkpụ goolu abụọ merie Saụt Afrịka ma kwụsị ha ịgba ịbanye n'agba ikpeazụ n'afọ ahụ. Na 2019, Naịjirịa gbakwara Saụt Afrịka ọkpụ abụọ asatara otu.
"Anyị abịarula nso na mbụ ịbụ ịkọ AFCON mana Naịjirịa jịrị nkeji ikpeazụ merịe n'afọ 2019," onye bụbu onyendu otu egwuregwu Saụt Afrịka Dean Furman gwara BBC World Football n'Afcon podcast.
Nwafọ Saụt Afrịka gbabuuru Orlando Pirates, Bolton Wanderers na Charlton Athletic bọọlụ bụ Fish kwuru na ndị Bafana Bafana kwesịrị ịchefu akụkọ ihe mere na mbụ ma jiri "agwa dị mma" zute Naịjirịa.
O gbakwụnyere "Naijirịa na-akpagbu anyị n'oge ọbụla ma ịtụlee mmeri ha na-enwete n'isi anyị."
Ugboro ole Naịjirịa na Saụt Afrịka maburula iko ACON

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Saụt Afrịka turuugo asọmpị AFCON n'afọ 1996 mgbe a gbara ya n'obodo ha ma gbaa ndị nke atọ n'afọ 2000.
N'aka nke ozọ, Naịjirịa eturula ugo n'AFCON ugboro atọ, gụnyere n'afọ 1980, 1994 na 2013. Naịjirịa agbaala ndị nke atọ n'AFCON ugbọrọ iri.








