Afcon: Onye bụdị Lookman a nyeere Nigeria goolu mmeri?

Ebe foto si, @SSE_NGA,Getty Images
Ademola Lookman nyeere Naijiria gọọlu mmeri megide Angola n'asọmpi ọkara ọkara Ikpeazụ asọmpi Afcon nke afọ 2024 a gbara ụbọchị Fraide.
Tupu asọmpi ahụ, ọtụtụ amaghị nwa amadị ahụ bụ onye nyere goolu ahụ n' ọkara mbụ nke asọmpi ahụ nke nwetara Naijiria ohere isonye n'ọkara ikpeazụ nke Afcon afọ a.

Ebe foto si, Getty Images
Nwa afọ Naijiria ahụ a mụrụ na mba Briten n'afọ 1997, chakere ụbọchị Fraide dịka ọ kụbara bọọlụ o nwetara n'aka Moses Simon na goolu postụ.
Nke a wụsara mmiri n'ala ọkpọ nkụ goolu dịka Naijiria na Angola gbarala bọọlụ ihe karịrị nkeji 38 na enweghị onye nyere ibe ya goolu.
Mana Lookman bụ onye gara Sekọdịrị n'ụlọakwụkwọ Katolk a kpọrọ , St Thomas the Apostle College dị na Peckham ,London, abụghị ya mbụ ichake n'ọgbụgba boolụ, nke ọ na-abụ ya mbụ inye goolu.

Ebe foto si, Getty Images
O sonyererela Naijiria n' asọmpi ugboro 17 ma nye goolu ise.
Onyekwara etu egwu bọọlụ ndị ọzọ ọ gbarala goolu.
Nwa amadị ahụ na-agbara otu egwu bọọlụ Atalanta bụ ya na ya nwere nkwekọrịta afọ anọ nke ọnụ ahịa ya bụ N14,532,040,875(€15 million)
Lookman malite ịgba boolu na nwata mana n'afọ 2015, o banyere nke ndị okenya were gbara otu Charlton Athletic.
Ọ gbara Everton bọọlụ malite n'afọ 2017 ma bụrụkwa onye Naijiria gbalirị ugboro abụọ ịdọta ka ọ gbara Naijria mana o kweghị.
Afcon: Naijiria emeriela Angola

Ebe foto si, Getty Images
Naijiria ejirila otu goolụ asaghị asa merie Angola n'asọmpi ọkara ọkara ikpeazụ na asọmpi Iko Afrịka a gbara n'Abidjan na mgbede Fraide.
Ọ bụ Ademola Lookman nyere goolu ahụ na nkeji 41 ka na Naijiria ji merie.
A kagburu goolu Victor Osimen
Victor Osimhen nyere ihe a gaara akpọ goolu nke abụọ na nkeji 75 nke mere ka mkpu ọnụ Osimhen fịọwa n'amaregwuregwu ahụ mana e mechaara kakpuo ya sị na otozughị ka a gụnye ya dịka goolu.

Ebe foto si, Getty
Naijiria enyela mba Angola otu ọkpụ n'asọmpi ọkara ọkara ikpeazụ n'asọmpi iko Afrika(Afcon) amalitela n'etiti Naijiria na Angola n'amaegwuregwu Felix Houphouet Boigny Stadium n' Abidjan, Ivory Coast.
Tupu enye goolu mbụ ahụ, ọkpọka otu egwu bọọlụ abụọ ahụ gbara asọmpi ahụ ihe karịrị nkeji 38 na e nweghị onye n'ime nyere efe.
Ndị meriri n'asọmpi a ga aga n'agba nke ọkara ikpeazụ ebe ha ga-ezute Saụt Afrịka maọbụ mba Cape Verde.











