Afcon: Ugo Naịjirịa na Bafana Bafana Saụt Afrịka achịpụwalaya

Aha onyonyo, Afcon: Anyi nwere ndị egwu bọọlụ kara aka-Iwobi
Afcon: Ugo Naịjirịa na Bafana Bafana Saụt Afrịka achịpụwalaya
Ugo Naịjirịa na Bafana Bafana Saụt Afrịka achịpụwalaya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ugo Naịjirịa na Bafana Bafana Saụt Afrịka achịpụwalaya

Ọgbọ ọkụ akajaala na Ivory Kost dịka Ugo Naịjirịa na Bafana Bafana Saụt Afrịka chịpụrụya n'ọgbọ egwurewu bọọlụ.

Ọ kabeghị nwe onye nyere goolu mana Saụt Afrịka agwaala ogige Naịjirịa ugboro abụọ.

Agbachaala nkeji nke mbụ oweghị ndị nyere goolu mancha.

Bafana Bafana nwalu ogịge Ugo Naịjirịa ugboro atọ ebe Ugo Naịjirịa nwalu nke ha ugboro abụọ ma bụrụ ọkachasị jide bọọlụ n'nkeji a.

Naịjirịa ejirila penality nye otu goolu n'agba nke mbu. Ọbụ Ekong nyere goolu ahụ.

Dịka aka na-anụlị na goolu Naịjirịa, Saụt Afrịka satara ya bụ goolu site na penality enyere n'aha Bafana Bafana nke mere bọọlụ jiri kwụrụ na 1-1

Alex Iwobi

Ọgbaabọọlụ A ma a a bụ Alex iwobi akọwaala ihe ọ na-atụ anya n'asọmpi Afcon Naijiria na Ivory Coast ga-agba n'abalị 18 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2024.

Afcon: 'Ihe m na-atụ anya na asompi Naijiria na Cote D'Ivorie'
Onye egwubọọlụ na-amasị
Aha onyonyo, Afcon: 'Ihe m na-atụ anya n'asompi Naijiria na Cote D'Ivoire'

Ụfọdụ ụmụ Naijiria ekwuola na-atụ anya n'asompi Naijiria na Cote D'Ivoire' n'egwuregwu Afcon na-akpọtụ na Abidjan taa.

Victor Osimhen: Anyị nwere ndị bọọlụ nwere ike imeri n'asọmpi Afcon
Victor Osimhen

Ọgbaa boọlụ a ma ama bụ Victor Osimhen ekwuola na ndị na-agbara Naijiria bọọlụ n'asọmpi Afcon bụ ndị nwere ike ibutere Naijiria iko.

Mana ọ bụ ihe ga-ewe oge ibulata iko ahụ.

Aha onyonyo, Victor Osimhen: Anyị nwere ndị bọọlụ nwere ike imeri n'asọmpi Afcon

Otu Super Eagle na-anọchite Naijiria n'asọmpi Afcon nke afọ 2024 na-aga n'ihu na Cote 'D'ivore ugbua.

Lee ihe Victor Osimhen bụ onye so na asọmpi ahụ kwuru na mkparịtaụka yuya na BBC nwere na nsonso a n'uju: