Ibadan Explosion: Lee eserese e si n'elu see ebe ihe gbara n'Ibadan
Mmadụ atọ nwụrụ , ọtụtụ ndị ọzọ merụrụụ ahụ, ebe ụlọ ruru 40 bibiri dịka ihe gbara ka ogbunigwe gbara n'Bodija,Ibaddan n'ụbọchị Tuzde.
Anya hụrụ ihe mere n'otu ihe onyonyo kwuru na ụlọ, ụgbọala na ihe ndị ọzọ gụnyere niile ihe ọgbụgba a metụtara n'ihe ọgbụgba a mere n'Adeyi Avenue dị na Bodija Estate ruchara ebe dịka kilomịta 15.
Ndị ọzọ sị na Ologuneru, Apete, New Garage, Bashorun, Akobo, Sango and Eleyele na ebe ndị ọzọ socha ebe ndị ọzọ o metụtara.
Lee ihe onyonyo e si n'elu sete ebe ihe mere.

Ebe foto si, Promise Ihezie
Dịka akụkọ etu ihe gbara dịka Ogbunigwe ma gbuo mmadu atọ n’ Ibadan na-akpọtụ, mata na ọ bughi ya bụ mbụ.
Eweela ebe ihe dị otu ahụ megasiri na Naịjirịa.
Lee ụfọdu n'ime ha.
Ogbunigwe gbara na Legos n’afọ 2002

Ebe foto si, Promise Ihezie
N’ụbọchị 27 Janụwarị 2022, ihe dị egwu mere na Lagos steeti, ogbunigwe ndị edebere n’ụlọ ndị agha dị n’Ikeja Legos gbara gbuo ihe ruru mmadụ 1,100, ọtụtụ mmadu merụrụ-arụ ebe ihe rụru mmadụ 20,000 nọ dịka ndị naweghị ụlọ.
Ụfọdu ndi mmadụ dagburu n'ime mmri ka ha na-agbaọsọ ndụ ha,ụfọdụ bụ ndị eji ọkpa zọgbu mgbe ana-agba ọzọ.
Akụkọ kwuru na ihe kpatara ogbunigwe ahụ jiri gbaa bụ na elekọtaghị ya anya etu kwesịrị.
Ogwunigwe abụọ gbara na Plateau Jos na 20 Mai 2024.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ pekatampe mmadụ 118 nwụrụ n’ihe mberede ahụ, ihe karịrị mmadụ 56 merụrụ-arụ.
Ogwunigwe ahụ buzo gbaa n’ime ahịa, nke abụọ gbara na ebe ana-aba ụgbọala.
Ụfọdu ndị kwuru na o bụ ndị otu ‘Boko Haram’ tụrụ ya bụ ogbunigwe.
Tupu ihe mberede a mee, ndị ekperechi Alawakụba na ndị ekperechi Kristi na-enwe nghọtaghe, ndị otu ‘Boko Haram’ agbaala ọtụtụ ụlọụka ọkụ iji kpali ọgbahiara n’etiti ekperchi abụọ a.
Ọzọ dịka ibeya bụ mgbe ụgbọ bu mmanụ ụgbọala gbara ọkụ na Plateau Jos, gbuo mmadụ iri.
Ọkụ gbara n’Ọnịtsha n’oge ekeresimasi 2014

Ebe foto si, Getty Images
N’afọ 2014, ụlọ gaasị dị na Nnewi Anambra steeti gbara ọkụ gbuo mmadụ 100 n'ụbọchị ekeresimesi.
Akụkọ kwuru na ọkụ ahụ bidoro gbaba mgbe otu ụlọ gaasị nwuuru ọkụ.
Ọzọ bu nke mere n’ụzọ Awka Onitsha Anambra steeti na Disemba 12 2021.
Ọtụtụ mmadụ nwụrụ naya mana ewughị ole ha dị.
Ụlọ gaasị gbara na Rivas Steeti

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ iri (dozens) nwụrụ na ka gaasị gbara na Rivas steeti n’ụbọchị Frịde bụ 3 Marchị 2023.
Akukọ kwuru na ihe kpatara ya bu na ugbọala juputara na mmanụ agbịdị nwuuru ọkụ ka ha na-aga ebe ha ga anọ sitaa ya bụ mmanụ agbịdị .

Ebe foto si, Promise Ihezie
Ọtụtụ mmadụ gbakọrọ ị hụ otu ọnọdụ ebe a siri dị.

Ebe foto si, Promise Ihezie
Mmadụ abụọ anwụọla, ebe mmadụ 70 merụrụ ahụ , ebe ụlọ ruru 40 mebiri dịka ihe dịka ogbunigwe gbara nna Bodija, Ibadan ụbọchị Tuzde.
A mabeghị ihe kpatara ya maọbụ ihe gbara ebe ahụ.

Ebe foto si, Promise Ihezie
Ọ bụ onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ ụbọchị Wenezde setere anyị foto ndịa, iji gosi etu ọnọdụ ebe ahụ dị ugbua.

Ebe foto si, Ihezie Promise
Fọtọ a na-egosi etu ọnọdụ siri dị n'ogbe ebe ihe ahụ gbara.

Ebe foto si, Promise Ihezie
Fọtọ a na-egosi etu ọnọdụ siri dị n'ogbe ebe ihe ahụ gbara.

Ebe foto si, James Alagban
Foto na onyonyo dị icheiche agbaala na-egosi ụdị mkpamkpa kpara n'Ibadan.
Aka na-achị steeti ahụ bụ Seyi Makinde kwuru na ndị na-egwupụta ọnatarachi nke iwu na-akwadoghi bụ ndị butere ihe ahụ gbara mana ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ etu o siri mee kpọmkwem.
Ndị na-eme ngwupụta ọnatarachi iwu na-akwadoghi bụ ndị butere ihe gbara n'Ibadan

Aka na-achị Oyo Steeti bụ Seyi Makinde ekwuola ihe kpatara ihe gbara ka ogbunigwe n'Ibadan n'abalị Tuzde.
Makinde gwara ndị ntaakụkọ n'isi ụtụtụ Wenezde na ọ bụ ndị na-egwupụta ọnatarachi nke iwu na-akwadoghi bụ ndị butere ihe ahụ gbara.
N'okwu Makinde, "ihe anyị na-eme ugbua bụ ịgbapụta ndị niile nọ n'ime uzuzu ebe ihe a mere na ndị ihe dakwasịrị".
Ndị ọrụ gbatagbata amalitela ọrụ ebe ahụ ebe ha kwuru na mmadụ abụọ anwụọla ebe mmadụ 77 ndị ọzọ merụrụ ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Ibadan Explosion: Ka ihe si kwụrụ n'Ibadan n'ụtụtụ Weneszde

Ndị ọrụ gbatagbata ekwuola na mmadụ atọ anwụọla n'ihe gbara ka ogbunigwe n'Ibadan dị n'Oyo steeti.
Akụkọ kwuru na ihe ahụ gbapụrụ n'ebe a kpọrọ Adeyi Avenue mana ọ metụtara ụfọdụ ebe tere aka n'ebe ọ dị.
Ebe ndị o metụtara gụnyere Ologuneru, Apete, New Garage, Bashorun, Akobo, Sango nakwa Eleyele.
Ihe ahụ gbapụrụ mara ala jijiji nke ukwuu ma kwatuo ọtụtụ ụlọ nọ na gburugburur ya.
Ka ihe si kwụrụ ugbua, a ka na-arụ ọrụ ịzọpụta ndị tọrọ n'ime ụlọ ndị dara ada.

Gọọmentị Oyo steeti amalitela inyocha ihe gbawara n'Ibadan
Gọọmentị Oyo steeti amalitela inyocha ihe gbawara na steeti ahụ na mgbede ụbọchị Tuusde.
O dobeghi anya ihe ọ bụ mana akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu maka ihe gbara dịka ogbunigwe n'Ibadan dị na steeti ahụ.
Ha kwuru nke a n'akara X bụbu Twitter ha ma na-arịọ ndị mmadụ ha nọrọ nwayọ dịka nyocha na-aga n'ihu.
Ndị mmadụ na-ekesa ihe onyonyo dị icheiche igosi ahụmihe ha gbasara ihe ahụ gbara.
Otu onye gosiri etu glassị niile dị n'ime ụlọ ya dara n'ala dịrị n'iperipe.
Onye ọzọ gosiri ihe onyonyo ebe anwụrụ ọkụ dị ojii na-apụta otu ebe n'ike n'ike dịka ndị mmadụ na-agba ọsọ.
Ndị uweojii Oyo steeti azabeghi ekwentị ha rue ugbua a na-ede akụkọ a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Mana kedụ ihe kpatara ihe a gbawara n'Ibadan, nke ọtụtụ ụlọ obibi gbakara ụlọ gbuo ma merụọ ndị mmadụ ahụ?

Ụjọ jikwa ndị bi n'isi obodo Oyo steeti bụ Ibadan, maka na ha chere na ọ bụ ndị omekome wakporo Ibadan n'abalị Tuzde.
“Anyị nụrụ ụda gbara n'elekere 07:30 n'abalị gbawara ụlọahịa Dominos, Ace Mall na Bodija,” dịka otu nwoke si wee kwuo.
Anya hụrụ ihe mere n'otu ihe onyoonyo na-efegharị kwuru na ụlọ, ụgbọala na ihe ndị ọzọ gụnyere niile ihe ọgbụgba a metụtara n'ihe ọgbụgba a mere n'Adeyi Avenue dị na Bodija Estate ruchara ebe dịka kilomịta 15.
Ndị ọzọ sị na Ologuneru, Apete, New Garage, Bashorun, Akobo, Sango and Eleyele na ebe ndị ọzọ socha ebe ndị ọzọ o metụtara.

Mana a ka na-eche ịnụ etu ihe gbara si wee gbaa nakwa ihe kpatara ya.














