Ndị uweojii anwụchiela otu onye a sị aka ya dị n'ọnwụ Nabeeha

Nwoke ahụ ndị uweojii nwụchiri

Ebe foto si, Prince Olumuyiwa Adejobi Nigeria Police

Ndị uweojii anwụchiela otu nwoke a sị na aka ya dị n'ọnwụ na ntọ Nabeeha na Kaduna.

Cheta na ndị ntọ tọọrọ Nabeeha na ụmụ nwanne ya ise na nna ya na Bwari dị n'Abuja tupu ha emechaa gbuo Nabeeha iji mee ka ndị ezinaụlọ ya weta ego mgbapụta ozugbo ozugbo.

Ọnụ na-ekwuru isi ụlọorụ ndị uweojii bụ Muyiwa Adejobi depụtara n'akara Twitter ya na achọtara nwoke ahụ aha ya bụ Bello Mohammed n'otu ụlọ oriri dị na Kaduna.

Mohammed dị afọ 28 bụ onye Zamfara steeti kwetara na o so na ndị tọọrọ ma gbuo Nabeeha na ezinaụlọ ya nakwa ezianụlọ nwoke ọzọ a kpọọ Barrister Ariyo n'Abuja kwa.

"E jidere ya ebe o ji nde naira abụọ na ụma nke echeere bụ oke ya n'ụgwọ mgbapụta ezinaụlọ ndị a tọorọ kwụrụ" ka Adejobi dere.

Ọ sịkwa na Mohammed nwara ịnye onyeisi ndị uweojii n'ụlọọrụ ebe e ji ya otu nde naira dịka ego aka azụ iji tọghapụ ya mana ọ mịtaghị mkpụrụ.

"Ndị uweojii agaghị ezuike ganye mgbe akwapịara atụmatụ ndị ohi na ndị ekperima na-enye ala Naịjirịa nsogbu" bụ nkwa o kwere na ngwụcha ozi ahụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Ndị ekperima ahụ gburu Nabeeha atọhapụla ụmụnne ya ise fọrọ n'aka ha

Nabeeha na ụmụnne ya ise ndị a tọhapụrụ

Ndị ekperima atọhapụla ụmụaka ụmụnwaanyị ise n’ime isii ha tọọrọ n’obobo Bwari dị n’Abuja bụ isi obodo Naịjirịa.

Nke a na-abịa dịka ndị ekperima gbuchara otu nwata n’ime ndị a tọọrọ nke aha bụ Nabeeha n’izuụka gara aga.

Ogbugbu Nabeeha butere ọtụtụ okwu n’etiti ndị Naịjirịa ọkachasị n’ihe banyere nchekwa na ntọrị ndị mmadụ na mpaghara Abuja.

Ndị ezinaụlọ Nabeeha gwara BBC na ọ bụ eziokwu na ụmụaka ise ndị ahụ alọghachịla n’ụlọ ha n’abalị Satọde 20 Jenụwarị, 2024.

N’otu aka ahụ ihe onyonyo gosiri mgbe ụmụaka ndị a lọtara na-efegharị na soshal midia dịka ndị mmadụ na-enwe aṅụrị maka ntọhapụ ha.

Ọ bụ anyị zọpụtara ụmụaka ise a - Ndị uweojii

Ndị uweojii Naịjirịa kwuru na ha gbapụtara ụmụaka ndị a site na mwakpo ndị otu ha mere n’oke ọhịa Kajuru nke dị na Kaduna Steeti n’ihe dịke ọkara gafee elekere iri na otu nke abalị Satọde ahụ.

Ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru ha bụ Josephine Adeh pụta kwuru na ụmụaka ndị a ezutela nne na nna ha n’Abuja ma sị na ha ebulitela ọnọdụ nchekwa na mpaghara Bwari nakwa ebe ndị ọzọ dị n’Abuja.

Mana ozi ahụ akọwaghị ma ndị ọrụ nchekwa na ndị ekperima ahụ ọ kwatara mgbọ nke mere e jiri zọpụta ụmụaka ndị a.

Cheta na ndị ekperima wakporo ezinaụlọ Nebeeha ma tọrọ ya, ụmụnne ya ise nakwa nna ha na Tuzde ụbọchị abụọ nke ọnwa Jenụwari 2024.

E mechara tọhapụ nna ya ma si ya ka wete ego o ji agbapụta ụmụ ya bụ nke butere ogbugbu Nabeeha mgbe nna enweghi ike iweta ego ahụ n’ụbọchị ha nyere ya.

Oke ntọrị ndị mmadụ na-aga n’ihe kamgbe na-emetụta ọtụtụ obodo dị na mpaghara Ugwu nke Naịjirịa na-agbanyeghi mbọ ndị ọrụ nchekwa na-agba iji kwụsị ya.

Kedụ ndị so n'ụmụaka ndị a tọhapụrụ?

Nabeela ụmụnne ya na nna ha

Ebe foto si, @Adamu_Asiya_/X

Nkọwa foto, Nabeela ụmụnne ya na nna ha

Ụmụaka ndị a tọhapụrụ gụnyere Najeebah bụ onye gụrụ akwụkwọ na mahadaum Ahmadu Bello dị na Zaria na ngalaba 'Quantity Surveying'.

E nwekwara nwada Nadheerah bụ onye nọ n'ogogo atọ na mahadum Ahmadu na ngalaba 'Wildlife Conservation'.

Ụmụnne ha ndị ọzọ gụnyere Adeebah, Aneesah na Mardiyyah.

Nabeeha onye nwụrụ n'aka ndị ntọrị a bụ osote Ada n'ezinalọ ha, a na-atụ anya na ọ ga-eme emume mpụta n'ụlọakwụkwọ n'ụbọchị 27 Jenụwarị 2024 tupu ọ nwụọ.

Etu Onyeisiala Tinubu na ndị ọzọ si katọọ ogbugbu nwada Nebeeha

Otu n'ime nwanne isii atọrọ n'Abuja kemgbe otu izuụka gaara aga anwụọla n'aka ndị ntọ nke mere ka iwe na ọnụma na-ewu n'igwe Soshal midịa.

Nabeeha ka ndị ahụ si na be ha tọrọ ya, nna ya nakwa ụmụnne ya ise n'ụbọchị Sunde.

Ndị ojiegbe amaghịwakporo ụlọ ebe ezinaụlọ Nabeeha bi n'obodo Bwari dị n'Abuja ma gbakwa ndị uweojii atọ tupu ha atọrọ ụmụnne ndị a na nna ha.

Otu n'ime ụmụnne ndị a bụ Nabeehah bụ nwata ụlọakwụkwọ Mahadum Ahmadu Bello dị na Zaria.

Ndị tọọrọ ya gburu ya n'abalị Fride dịka ezinaụlọ ha enweghi ike iweputa ego a nara ha ruru ($63,000)

Akụkọ kwukwara na ha esila na nde 60 ha na-anabu welie ego ahụ ka o ruo nde 100.

Onye n'ime ndị ezinaụlọ Al-Kadriyar gwara ndị ntaakụkọ Daily Trust na ndị ntọ gwara ha ebe a tọgbọro ozu nwa agbọghọ ahụ, ha ga-buru ya.

Ihe ndị uweojii kwuru

Dịka ihe si kwụrụ ugbua, ndịuweojii ekwuola na ha ezipula ndị ọrụ ga-azọpụta ndị ahụ a tọọrọ.

Ọnụ na-ekwuru isiụlọorụ ha bụ Muyiwa Adejobi kwuru nke a n'akara Twitter ya dịka ọ na-agwa ndị mmadụ ha nwee ndidi na nyocha na-aga n'ihu.

Ọ sị "ndị isi esiela imi n'ala ịrụ ọrụ dị n'ịzọpụta ndị ahụ ma kwụsịkwa ihe ọzọ ịme onye ọbụla"

"Anyị agaghị e nwe ike ịkwuputa ihe ọbụla maka etu akụkọ a sịrị dị nakwa ịhapụ mmebi ọrụ anyị rụrụla" ka o kọwara.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Ndị ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 3

Ndị isi ndị ekweghị n'ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu nke Naịjirịa bụ Peter Obi na Atiku Abubakar ekwupụtala iwe ha maka ogbugbu Nabeehah.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 4