Distance Marriage: O nwere uru dị n'ịlụ di obodo oyibo?

Ndị na-eme agbamakwụkwọ
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist

" O nwere mgbe nwaanyị ga-anọkata chọba di ya, mgbe ahụ gị ga-achọ di gị, ọ gaghị anọ ya."

"Ọ bụ ya bụ ọghọm dị n' alụmdi obodo oyibo."

Ọ bụ ka Chioma Ugonabo( ọ chọghị ka anyị kwuo ezigbo aha ya) gbara afọ 31 gara agbamaakwụkwọ nwanne ya nwaanyị n'obodo ya n'Imo steeti ka ya na Okey Ugonabo gbara 44 zutere.

" Anyị kerịtara akara ekwentị anyị, na-akpazi n'ekwentị."

N'ime otu ọnwa ha ji zutere, Chioma na Okey lụrụ onwe ha tupu Okey laghachi Finland ebe ọ na-agụ akwụkwọ.

" Mụ na ya ayịghị, anyị hụrụ onwe anyị kwe na anyị ka ebinwu."

Ugbua, ọ gaala afọ asatọ ha lụrụ, Chioma atụbeghị ụkwụ n'ala Bekee bụ ebe di ya nọ gụọ akwụkwọ ma na-arụ ọrụ ugbua dịka ọkwọụgbọala (uber driver).

Ụkamaka Okorie gbara afọ 31 alụọla di nke ya afọ asaa.

Ọ bụ onye ya na-arụkọ ọrụ gwara di ya ugbua maka ya.

"Ozugbo, ọ gwara m na ọ chọrọ ịlụ m, m si ya mba na ma agaghị alụ onye ma amaghị."

Ha mechara lụọ ka ọ gachara otu afọ.

Ugbua o ruola afọ asaa ha luru dịka di na nwunye, mana Ukamaka na otu nwa ha ji bi na Naijiria, ebe di ya si mba Jamini alọta ahụ ha otuugboro n'afọ.

Uru dịkwa n'isi azụ

Ụmụagbọghọ bịara agbakwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Ịlụ di obodo oyibo bụ ihe ọtụtụ ụmụagbọghọ Igbo na-arọ nrọ ya n'ihi olileanya na ọ ga-agbanwe ndụ ha nakwa nke ezinaụlọ ha.

N'ezie, mgbanwe ahụ na- adị dịka ụdị alumdi ahụ gbanwerela ndụ ọtụtụ ezinaụlọ gaara anọ n'ahụhụ na ụbịam n'ihi ego igwe e si ala Bekee ezilata.

Dịka ụlọakụ mbaụwa bụ 'World Bank si kwuo, ego ụmụ Naijiria si Alabekee zilata Naijiria n'afọ 2022 bụ ijeri dọla 22 ( $22 billion dollars).

Ụfọdụ n'ime ego bụ a na-etinye maka azụmaọhịa na ịgbaonye ego, ebe ụfọdụ bụ ego ụfọdụ naa-ezilatara nwunye ha na ezinaụlọ ha hapụrụ gawa ịgba mbọ n'ala Bekee.

Ọtụtụ ụmụnwaanyị na-agba ụgbọala arụọla nnukwu ụlọ, ma zụọ ụmụnwanne rue mahadum site n'enyemaka di Ala Bekee.

"Nwoke na-enye gị ihe ọbụla ị chọrọ, etu isi chọọ ya."

Uru ọzọ dị ya dịka Ugonabo si kwuo bụ nwaanyị inwe ohere ezumike.

"Uru dị na ya bụ na ndị ha na di ha bikọta, ị gaacha ọrụ dị n'ụmụ, ị ga nke dị na ndi. Nwaanyị anaghị enwe ezumike."

Ọ bụ ka ihe nracha sị atọ?

Ụmụada na-agba egwu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ ụmụagbaghọ na-arọ nrọ ịlụ di obodo oyibo

Mana ọ bụchaghị ka akụilu si ada n'ọnụ ka o si atọ.

Ụfọdụ ụmụnwoke na-anọ afọ abụọ , atọ ,ise maọbụ karịa na alọtaghị ụlọ nke mere na ụfọdụ ụmụnwaanyị ha dotere na Naijiria na-ata ikikirieze n'ihi ọnọdụ enweghị ohere metụkọ ahụ dịka di na nwaanyị.

Na-agbanyeghị na, "anyị kpara ya akpa tupu ọ gawa" dịka Ugonabo si gwara BBC Igbo na mkparịtaụka, ije di ahụ abụchaghị ihe ọ tụrụ anya.

"Ihe anyị kpara bụ na ụmụ anyị too, mata ihe, mara ala nna ha ọfụma, ọ bụghị oge ha ga -agaba ebe ahụ ha echefuo ala nna ha."

Ugonabọ sịrị,"Ọghọ m dị na ya bụ na o nwere ihe nwoke na-arụ: O nwere mgbe nwaanyị ga-anọkata chọba di ya, mgbe ahụ gị ga-achọ di gị, ọ gaghị anọ ya."

Okorie tụrụ arịị sị,"Ọ bụ n'ime alumdi a ka ghọtara na agaghị na-ahụ ya oge ọbụla."

"Ọ bụ mgbe ị banyere ka ị ga-aghọta ihe di n'ime."

"Agụ mụ na di imekọrịta gụwa m, amalite m ibe akwa, abụ m mmadụ."

E nweghị onye enyemaka n'oge ọrịa, ọdachi

Ọghọm ọzọ dị n'alụmdi obodo oyibo dịka ụfọdụ ndị nọ na ya bi na Naijiria bụ enweghị onye enyemaka oge ọ dị na mkpa dịka ọrịa,ihe mberede.

Chioma sịrị, "O nwere ike ahụ adịghị m, ọ bụrụ m kwọọrọ onwe m gawa ụlọọgwụ."

Kedụ ụzọ ụmụnwaanyị di ha nọ ala Bekee si egbo mkpa mmetụkọ ahụ?

Nsogbu owu ọmụma(lonelines) enweghị ohere mmekọrịta so na ihe na-echere ndị di ha nọ obodo oyibo aka mgba.

Di Ugonabo na-agbalị abịa Naijiria "kwa ọnwa atọ ọbụla."

Mana nke a abụghị na ọ naghị akọ ya ụkọ n'anya.

O kwuru na ya na ejigide onwe ya ma nwekwa ntukwasịobi na di ya na-eme otu ihe ahụ.

Ugonabo kwukwara na, "Mụ na di m na-ekwukwa n'ekwentị kwa ụbọchị ụtụtụ rue abalị."

Okorie kwuru na ya na-etinye mmụọ ya n'ahịa ọ na azụ nke na-ewepụ ya uche na nnọkọrịta di na nwaanyị.

O kwukwara na ya na=anọọ onwe ya iji gbalahu ọnwụnwa.