AFCON: Naịjirịa emeriela Ivory Coast

Ebe foto si, Getty images
Ugo Naịjirịa agbachaala bọọlụ ha na Ivory Coast.
Na nkeji izizi, o weghị ndị nyere gooli mana ka abatara nkeji nke abụọ, Naịjịrịa nwetere asụwa agbaa (penalty kick) nke ha jiri merie bọọlụ nke taa.
Ihe kpatara ya bụ asụwa agbaa bụ aka onye otu Ivory Coast bụ Ousmane Diomande kwara onye otu Naịjirịa bụ Victor Osimhen.
Onye nyere goolu bụ William Troost-Ekong.
Cheta na nke a bụ bọọlu nke abụọ Naịjirịa na-agba n'Asọmpị AFCON 2023.
Ndi izizi ya na ha gbara bụ Equitorial Guinea, nke biri na 0 - 0.

Ebe foto si, Getty Images
A gbaala nkeji izizi mana o nweghi otu nyere goolu.
Ugbua, ha na adị njikere igba nkeji nke abụọ.

Ebe foto si, Getty Images
Kemgbe afọ 1980, Naịjịrịa na Ivory Coast agbaala bọọlụ ugboro isii n' asọmpị AFCON.
Nke ha ga agba tata ga-eme ya ugboro asaa mba abụọ ahụ ga-ezuta onwe ha.
N' asọmpị isii ha gbarala, Naịjịrịa meriri ugboro abụọ, ebe Ivory Coast meriri ugboro abụo; mana ha gbara onye lawa, onye lawa n' asọmpị ugboro abụọ.
O nweghị onye ma ndị ga-emerị na bọọlụ ha ga-agba tata maka na mba abuo ahụ dị ka ha amara onwe ha n' Afrika.
Na bọọlụ ịkpeazụ Naịjịria na Ivory Coast gbara na afọ 2013, Naịjịrịa jịrị ọkpu abụọ asatara otu merịe, ma gaa n’ ịhụ buru iko AFCON n'afọ ahụ.
Tata, Naijịria na Ivory Coast ga-akwata ya na amaegwuregwu Olympik Ebimpe dị na mgbago Ugwu Abidjan.
Na mbido asompi AFCON 2023/24
Naịjịrịa na ndi Equatorial Guinea gbara 'onye lawa- onye lawa' na bọọlụ nke mbụ ha gbara.
N' aka nke ọzọ, Ivory Coast jịrị ọkpụ abụọ merie ndị Guinea-Bissau.
A bịa n' etu ọnọdụ ha sịrị dị na tebụlụ, Ivory Coast bu ndị nke mbu dịka ha nwere pọntị atọ, ebe Naịjịrịa bụ ndị nke atọ nwere otu pọintị.
Ndị ọzọ nọ na tebụlụ Naịjịrịa na Ivory Coast bụ ndị Guinea-Bissau, na ogbo ha bụ Equatorial Guinea.












