Igwe Neni's suspension: Ihe mere Soludo ji kpọghachi Igwe Damian Ezeani

Charles Soludo na Igwe Damian Ezeani

Ebe foto si, Charles Soludo/ Damian Ezeani

Aka na-achị Anambara steeti bụ Charles Soludo akpọghachiela Igwe Neni bụ Eze Damian Ezeani.

Ọchịchị Soludo kwụsịburu Igwe Ezeanị n' ọrụ n'ike n'ihi ebubo na o chiri Senetọ Ifeanyi Ubah echichi na anataghị ikike dịka ọ dị n'iwu ndị eze ọdịnala.

Ọ bụghị nani Igwe Ezeanị, gọọmentị Anambara kwụsịkwara eze ndị Ojoto na nke Auguluezechukwu maka ime otu ihe ahụ.

Mana ụkwụ ahụ ọchịchị Soludo zọpụrụ gbarụrụ otu jikọrọ ndị eze ọdịnala steeti ahụ afọ.

Onyeisi ha bụ Obi Ọnịcha bụ Igwe Nnaemeka Achebe kọwara n'akwụkwọ mgbasaozi ọha o binyere aka ma wepụta na ọchịchị Soludo fere Eze ọdịnala aka n'ihu dịka o zọpụrụ ụkwụ ahụ na-ajụghị ya ese dịka onyeisi ndị eze ọdịnala.

Ozi nke ọnụ na ekwuru Soludo bụ Christian Aburime kwuru n'ozi o wepụtara sịrị," Gọọmentị steeti anabatala mgbaghara ma weghachi Eze ndị Neni ma gbaghara Eze ndị Ojoto na nke Auguluezechukwu."

Igwe Achebe: Ihe anyị ma maka akụkọ a sị na Soludo achụọla Obi nke Onicha n'oche

Igwe Nnaemeka Achebe

Ebe foto si, Charles Soludo/Facebook

Dịka akụkọ na-efegharị n' ọchịchị Gọvanọ Charles Soludo achutuola Obi nke Ọnicha bụ Igwe Nnaemeka Achebe n'oche, gọọmentị Anambara steeti agọọla si na akụkọ ahụ bụ okpotokpo asị.

Akụkọ fegharịrị na soshal midia boro ebubo na dịka nsogbu dapụtara n'etiti ndị eze ọdịnala na Soludo na-akawanye njọ, na Soludo achụtuola Igwe Achebe n'oche dịka onyeisi otu jikọrọ ndị eze ọdịnala Anambara steeti.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mana Soludo agọọla sị n'akụkọ ahụ bụ "akụkọ ụgha."

Ọnụ na-ekwuru ya bụ Christian Aburime gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọ bụ "akụkọ ụgha" ahụ bụ aka ọrụ "ndị ọchọnganoko" ..

Ọ sịrị, "Akụkọ e konukọrọ si n'aka ndị ọchọnganoko kwuru na ọchịchị Gọvanọ Chukwuma Charles Soludo ewepụla Onyeisi otu jịkọọ ndị eze ọdịnala Anambara na Obi nke Onicha bụ Igwe Alfred Nnaemeka Achebe, n'oche."

"Akụkọ a abụghị eziokwu kama ọ bụ akụkọ ụgha."

"Gọọmentị ewepụtala akwụkwọ mgbasaozi nke kọẁara ihe mere ụnyaahụ n'etiti Gọvanọ Soludo na ndị ezeọdịnala."

"O nweghị ihe yiri ya mere maọbụ onye ọbụla kwuru ."

Ọ gara n'ihu dọọ aka na ntị ka ndị na-ekesa ụdị akụkọ ahụ sepụ aka enwe n'ofe.

Cheta na nsonso a, nsogbu dapụtara n'etiti Achebe na Gọvanọ Soludo dịka a akwụsịrtị Igwe Neni nwa mgbe nta maka ichi Senetọ Ifeanyi Uba echichi.

Igwe Achebe gbarụrụ ihu sị na Gọọmentị Soludo agbasoghị usoro kwesịrị n'ịzọpụ ụdị ụkwụ ahụ na ajụghị otu jikọrọ ndịeze nke ya bụ Achebe bụ onyeisi ya ese.

Igwe Neni's Suspension: Gọọmentị Anambra agbagharala ma nabata Igwe a

Soludo na Obi na-achị Onicha

Ebe foto si, Anambra state Government

Gọọmentị Anambra steeti agbagharala ma nabata Igwe Neni bụ nke akwụsịrị ọrụ n'ike.

Nke a pụtara n'ozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Christian Aburime binyere aka dịka aka na-achị steeti ahụ bụ Chukwuma Soludo nakwa ndị Igwe odinani gafere iri na itoolu nwere nzụkọ n'Ọka.

Soludo kọwara na ihe mere o ji mee ihe o mere ụfọdụ ndị Igwe achụrụ n'ọrụ na ndị ọzọ agbara ajụjụ ọnụ bụ iji debe iwu ala ka ọ ghara imebi.

Ihe ndị ọzọ ha kpara na ya bụ nzụkọ bụ usoro a ga-esi kpokọ otu ọhụrụ maka ndị Igwe ọdịnala na steeti ahụ.

N'aka nke ya, Obi na-achị Ọnịcha bụ Igwe Nnaemeka Achebe kwuru na ha kwudosiri Soludo na-azụ ma kwuo na ha dị njikere iso ya jikọọ aka maka ọdịmma steeti ahụ.

A gbaghara Igwe Ojoto nakwa Igwe Aguluezechukwu bụ ndị agbaburu ajụjụ ọnụ.

Ihe Ifeanyi Ubah sara Soludo maka ịkwụsị Igwe a ọrụ

Sịnetọ Ifeanyi Ubah na Gọvanọ Soludo

Ebe foto si, BBC/Soludo/Facebook

Sịnetọ Ifeanyi Ubah na-anọchiteanya Anambra South n’ụlọomeiwu Naịjirịa agwala Gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anambra Steeti ka ọ kwụsị ịbụlite nzuzu ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’Anambra.

Nke a na-abịa dịka Gọvanọ Soludo kwụsịrị Igwe Neni bụ Damian Ezeani ọrụ n’ihi na o chiri Ifeanyi Ubah echichi ‘Ikemba Ojoto’.

Na mkparịtaụka Ubah na ndị ntaakụkọ Authority FM dị na Nnewi nwere na Mọnde, O kwuru na ọ chọbughi itinye ọnụ n’okwu ahụ kama na ọ chọrọ ka o doo ewu na ọkụkọ anya.

O kwuru na ọ bụghị echichi e chiri mmadụ na-egosi na a maara onye ahụ ama kama na ọ bụ site n’ọrụ onye ahụ na-arụ.

“O nweela mgbe ndị Eze ọdịnala mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ Southeast Council of Traditional rulers chọrọ ichi m echichi, mana m jụrụ ajụ.

“Ọ tụrụ m n’anya mgbe m nụrụ na a gọvanọ kwụsịrị Igwe Ojoto ọrụ maka na o chiri m echichi ‘Ikemba Ojoto.

“Ana m arịọ Soludo ka ọ kwụsị ịgbalite nzuzu ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’Anambra Steeti na gọọmenti nwere ọtụtụ ọrụ cheere ya n’ihu ọ kwesịrị ileba anya.”

Sịnetọ Ubah gara n’ihu kwuo na Onyeisi ndị Eze ọdịnala n’Anambra adịla mbụ katọọ nkwụsị n’ọrụ ahụ site n’akwụkwọ ozi ha degaara gọvanọ Soludo

Igwe Damian Ezeani, Charles Soludo, Igwe Achebe

Ebe foto si, Ndi Neni?Charles Soludo/Igwe Achebe/Facebook

Akwụkwọ ozi Obi Onicha degaara Soludo maka ịkwụsị Igwe Neni ọrụ

Onyeisi ndị eze ọdịnala n'Anambara steeti mabụrụkwa Obi Onicha bụ Igwe Alfred Achebe akatọọla aka ọchịchị Charles Soludo ji eso ndị eze ọdịnala n'Anambara steeti.

Nkatọ a na-eso nkwụsị n'ọrụ Gọọmentị Anambara steeti akwụsịrị Igwe nneni bụ Igwe Damian Ezeani ọrụ nwa obere oge maka ichi Senetọ Ifeanyi Ubah echichi.

N'akwụkwọ ozi nke Igwe Achebe binyere aka ma zigara Kọmishọna na-ahụ maka ihe metụtara echichi ọdịnala bụ Collin Nwabunwanne, o kwuru Gọọmentị steeti ahụ ji nwayọo akpụ ugwu ndị eze ọdịnala n'ala.

O kwuru na akwụkwọ usoro agwa kwesịrị onye eze(Code of Conduct) bụ ndị eze gbakọrọ aka mee ya bụ iwu ka ọ na-achị ha.

O kwuru na ha na-ahụ na onye Eze ọbụla gbasoro iwu ahụ, onye ọbụla dara iwu ahụ, ha atụnye gọọmentị ọbụla nọ n'ọchịchị alo ntaramhụhu kwesịrị.

Akwụkwọ ozi Igwe Achebe degara Komishona

Ebe foto si, Igwe Nnaemeka Achebe

Akwụkwọ ozi Igwe Nnaemeka Achebe degara Komishona

Ebe foto si, Igwe Nnaemeka Achebe

"Mana ugbua ọ dị ka gọọmentị ugbua ji aka ha ahazi iwu ji ndị eze na-ajụkwaghị otu ndị eze bụ mere ya bụ iwu."

Ọ sịrị na nkwụsị n'ọrụ a kwụsịrị Igwe Ezeani agbasoghị usoro dị n'iwu ndị eze ọdịnala steeti ahụ.

“Ana m eche n' akwụkwọ ozi e sitere m nke rutere m aka ka ọ gacharala awa 24 akwụkwọ ozi e jiri kwụsị lgwe Damian Ezeani ọrụ wuwerela na soshal midia n'abalị Asatọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2024 bụ iji mezuo iwu."

Igwe Achebe onye gbarụrụ ihu n'olu Kọmishọna ji dee akwụkwọ ozi ya, siri na ụdị etu e si soo ya maka okwu ichi Ifeanyị Ụba echichi na-arụtụ aka na ikekwe o "nwere ihe ọzọ Igwe Neni maọbụ Ifeanyi Ubah mere' na-ese.

Etu Soludo si kwụsị Igwe Neni ọrụ n'ike

Igwe Damina Ezeani

Ebe foto si, Neni/Facebook

Na mgbede ụbọchị Tuzde, ọ pụtara ihe na Gọọmentị Anambara steeti akwụsịla ịhụ Igwe Damian dịka Igwe obodo dịka a kwụsịrị ya ọrụ obere oge.

N'ozi nke Komishona na-ahụ maka okwu ọdịnala wepụtara, ọ kọwara ihe nke a ji me.

N'ozi ahụ, ọ sị na Igwe Neni dara iwu kpuchiri omume ndị Eze ọdịnala.

Senetọ Ifeanyi Ubah n'obi Igwe Neni

Ebe foto si, Screengrab

Ozi ahụ kwuru sị, "Iwu kpuchiri omume ndị Eze ọdịnala kwuru na o nweghi onye nwere ikike ichi onye esighị n'obodo ya echichi na-anataghị Igwe obodo onye ahụ a na-echi echichi ikike ime nke ahụ."

Ozi ahụ kwukwara na e kwesiri ịnata ngalaba na-elekọta ihe ọdịnala na steeti ahụ ikike tupu e mee nke a.

"Na ị gara n'ihu chie mmadụ esighị n'obodo gị bụ Sịnetọ Ifeanyi Ubah echichi ezughị oke na-agbanyeghị ihe ọbụla iji mee ya."

Ihe a bụ nkọwa gọọmentị Anambra nyere ha ji kwụsị ya n'ọrụ obere oge.

Ha nyekwara ya ohere ịzara ọnụ ya ma zọọ isi onwe ya na mkpebi a.