'Ana ma agagharị na mbaụwa achọ ndị ga-akwado m, Naịjirịa anaghị enye m ego ndị ahụ' - Chioma Ude Afriff

Aha onyonyo, Chioma Udeh malitere Afriff
'Ana ma agagharị na mbaụwa achọ ndị ga-akwado m, Naịjirịa anaghị enye m ego ndị ahụ' - Chioma Ude Afriff
Chioma Udeh

Chioma Udeh bụ nwada Igbo malitere emume na-egosipụta ejije a kpọrọ Africa Internationa Film Festival, Afriff n'aha ịchafụ.

Nwada Udeh bụbu onye na-eme ejije tupu ọ malite Afriff nọrọla afọ iri na abụọ.

BBC Igbo na Chioma mere mkparịtụka ebe o kwuru ihe ndị na-akpalite ya.

O kwuru na ọ bu onye inye aka na-amasị, n'okwu ya; "inye aka na amasị m, ọ bụghị dị maọbụ n'onyonyo."

Chioma akpọtala ọtụtụ ndị ma nke ekwe na-akwụ n'okwu onyonyo na mbaụwa ka ha bịa tinye ego n'azụmahịa onyonyo Naịjirịa bụ Nollywood.

N'okwu ya; ndị mmadụ na-ajụkarị m ihe mere m ji agagharị na mbaụwa na anaghị m anọ na Naịjirịa, ana m achọ ego ji eme ọzụzụ Naịjirịa anaghị enye m ego ndị ahụ.

Chioma arabatala ọtụtụ ndị nwere agba ji ego e ji akwado ejije Nollywood ka ha bịa tinye ego ha na Nollywood, ndị dịka Amazon Prime na ndị ọzọ.

Chioma Ude

N'onyonyo a, BBC Igbo na ụmụ ya na nwanne ya nwoke kpakọrịtara gbasara mmadụ Chioma.

Nwanne ya bụ Frank Jr. Adigwe kọwara na Chioma bụbu onye na-eme ihere mana ugbua, ihere apụọla ya n'anya.

Nwa ya nwaanyị bụ Olive Ude kwuru na kwa afọ ya na-ahụ mkpa ọ dị mmadụ inwe ndị na-adọnyere ya ukwu ka a na-eme emume Afriff. N'okwu ya; 'abụm onye m bụ ugbua maka nne m, ọ siri ike'.

Kirie onyonyo ahụ n'uju.