Child trafficking: Etu aka si kpara nwanyị chọrọ ire ụmụ ya nwoke abụọ n'ihi ọtanisi

Ebe foto si, Anambra Ministry of Women Affairs
Aka akparala otu nwaanyị na nwa ya nwaanyị a na-enyo enyo maka ịkpa nkata ire ụmụ ya nwoke abụọ otu nde naira,otu nde naira.
Ndị uweojii Anambra steeti kwuru na ha nwụchiri Chinyere Chukwu, gbara afọ 38, onye Ozubulu bi Okija na ada ya nwaanyị bụ Joy maka ịkpa nkata ire ụmụ ya nwoke abụọ dịka ha na-eme nyocha na ya bụ okwu.
Kọmishọna na-ahụ maka ụmụnwaanyị bụ Ify Obinabo aka ya kpaara nwaanyị ahụ dịka o mere ka ọ chọrọ ịzụ mmadụ gakwuo nwaanyị ahụ ka o nwetara ozi na nwaanyị ahụ na-achọ ire ụmụ ya nwoke abụọ.
Ka aka kpara ya, nwaanyị ahụ bụ ajadu ji ụmụ 11 kwuru na ọ bụ ihe isi ike meere ya ka ya tinye aka n'ụdị mgbere a.
Chukwu, onye kwuru na ya mụtara ụmụ abụọ oge di ya dị ndụ ma mụọ itoolu n'azụ di ya, kọwara na ọ bụ ka ya matara na onye agbataobi ya rere nwa nke ya ka ya ji kpebie ire ndị nke ya.
Dịka ya na Komishona na-adọrịta ego ole, nwaanyị ahụ kwetara ire ụmụaka abụọ ahụ N1,800 000.
Ada nwaanyị ahụ bụ Joy kwetara na atụmatụ mnwaay dịka o nwere ebunobi isi ebe ahụ nweta ego ọ ga-eji ga mahadum.
N'ozi ya, Komishọna gbara ama na a nwuchikwara onye agbata obi nwaanyị ahụ dịka a gbawarala mbọ ịchọta nwa ya o refuru.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambara steeti bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC sị, "Anyị na Mịnịstrị na-ahụ maka ụmụnwaanyị na-arụkọ iji hụ na e nwere ikpe nkwụmọtọ."
" Azọpụtala ụmụaka ahụ ma jichie onye a na-enyo enyi n'ogige anyị."
Cheta n' ọnwa Mee 29, afọ 2023, Onyeisiala Bola Tinubu mara ọkwa mwepụ oge nkwụbilata ego mmanụ ụgbọala dịka e duru ya n'iyi ọrụ.
Nke a butere mgbali elu ọnụahịa mmanụ ụgbọala nke mere ka ọnụahịa ihe na-ada n'ahịa rịa n'elu ọjị.











