Insecurity: Ntọrị ụmụaka isii, ogbugbu ndị Eze na ihe ndị na-egosi na nchekwa gba ọtọ na Naịjirịa

Ndị ntọrị atọọrọla ọtụtụ mmadụ na mbido afọ 2024

Ebe foto si, Getty Images

Ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa abụrụla chi bọọ anụ ọzọ n’afọ 2024 dịka akụkọ ntọrị ndị mmadụ na-arị elu na mpaghara dị iche iche nke Naịjirịa.

Nke mere na nso nso a bụ etu ndị ntọrị si tọọrọ ụmụakwụkwọ isii, ndị nkuzi ha atọ nakwa otu onye ọkwọ ụgbọala n’Ekiti Steeti.

Ozi gọọmentị steeti ahụ wepụtara, ha kwuru na a tọọrọ ndị a ka ụgbọala bu ha si njem na-alọta n’abalị Mọnde 29th Jenụwarị 2024.

Ozi gara n’ihu kwuo na ndị ọrụ nchekwa na-achọsi ndị ntọrị a ike iji nwuchie ha ma zọpụta ndị a.

Ntọrọ ụmụakwụkwọ ndị a ebutela ọtụtụ okwu na soshal midia dịka ọtụtụ ndị ndọrọ ndọro ọchịchị na ndị nkịtị katọrọ ya.

Bola Tinubu, Onyeisiala Naịjirịa

Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook

Onyeisiala Bola Tinubu katọrọ ya ma nye ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha gbaa mbọ hụụ na a tọhapụrụ ụmụakwụkwọ ndị na ndị nkuzi ha.

N’otu aka ahụ ndị ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa bụ Sịnetị akpọọla ndịisi ngalaba nchekwa na Naịjirịa ka wuchie n’ihu ma kọwaa ihe mere ọnọdụ nchekwa jiri akawanye njọ na etu ha ga-esi gboo nsogbu a.

Kepukepu si n’ụlọọrụ ndị ntaakụkọ na Naịjirịa na-ekwu na ndị ntọrị a ekwuola ka a kwụọ ụgwọ iji gbapụta ụmụakwụkwọ ndị a mana nke a edochabeghi anya.

Ihe ndị ọzọ na-egosi na nchekwa akụọla afọ n’ala

Akụkọ ntọrị ụmụakwụkwọ abụghị naanị ihe merela n’ọnwa Jenụwarị a bụ nke gosiri na nchekwa dị ọjọọ ugbua,

  • N’otu ụbọchị Mọnde ahụ, ndị eze ọdịnala abụọn’Ekiti Steeti zutere ọnwụ ha site n’aka ndị ojiegbe. Oba Olatunji Olusola nke obodo Imojo Ekiti na Oba Babatunde Ogunsola nke obodo Ekun, Ekiti Steeti nwụrụ mgbe ndị ojiegbe wakporo ha ka ha si nzuko n’obodo Irele-Ekiti na-alọta.
  • N’abalị abụọ nke ọnwa Jenụwarị 2024, ndị ntọrị wakporo otu ezinaụlọ bi na mpaghara Bwari dị n’Abuja ma tọọrọ nna nwe ụlọ na ụmụaka ya isii. E mechara tọhapụ nna ha ma gbuo otu nwa ya nwaanyị maka na o gburu oge ịkwụ ụgwọ e ji agbapụta ụmụaka ya n’aka ndị ntọrị a. Mana e mechara tọhapụ ụmụaka ya ise ndị ọzọ fọrọ afọ mgbe ha kwụchara ọkpụrụkpụ ego iji gbapụta ha.
  • Na mpaghara Ugwu, e nwekwara akụkọ ogbugbu na ntọrị ndị mmadụ aghara aghara nke mere na nso nso a. Otu n’ime ha bụ ogbugbu ndị ekperima gburu ihe karịrị mmadụ otu narị n’ụbọchị Ekeresimesi afọ 2023 n’obodo Bokkos na Barkin-Ladi dị na Plateau Steeti.
  • A ga-agụ ole ghara ibe ya?, Etu a ka imi na anya dịkwa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ ebe ndị omekaome na ndị ojiegbe na-ezu, na-atọrị ma na-egbukwa ndị mmadụ. N’ụbọchị Mọnde 29 Jenụwarị ka ndị ojiegbe wakporo ọtụtụ ndị na-azụ ahia idọrọ ego n’igwe POS ma gbuo ụfọdụ n’ime ha tinyere ndị uweojii n’Imo steeti.

N’ime ihe ọnọdụ ọjọọ a nchekwa dị na Naịjirịa, gọọmentịvetiti ka na-ekwusi ike na ha na-agba mbọ ịkwụsị ebe ụjọ ime njem na-atụzị ụmụafọ Naịjirịa.