Etu ndị ojiegbe si zuo ndị POS ohi aghara aghara ma gbuo ufọdụ n’Imo Steeti

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ojiegbe a na-amaghị ndị ha bụ awakpoola ma gbuo azụmaahịa igwe e ji enye ego bụ Point of sale (POS) n’okporoụzọ si Owerri gawa Orlu nke Imo Steeti.
Anya hụrụ ka ihe a si mee kọwara ihe ndị ojiegbe a gburu mmadụ anọ nke gụnyere ndị uweojii abụọ na ndị nkịtị abụọ.
Mana ọ kọwaghị kpọmkpwem ihe mere ndị ojiegbe a jiri gbagbuo ndị a na-azụ ahịa POS.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Imo Steeti bụ Henry Okoye kwuru na kọmishọna uweojii bụ Aboki Danjuma akatọọla mwakpo ndị a ma zipu ndị uweojii ka ha sie imi n’ala chọpụta ma nwuchie ndị kpara arụ a
“Kọmishọna ndị uweojii akatọọla mwakpo na ogbugu ndị ahịa POS abụọ tinyekwara ndị uweojii abụọ n’ụzọ Orlu. O zipụla ndị ọrụ nchekwa ka ha sie imi n’ala chọpụta ndị kpara arụ a.
Akụkọ na-ekwu na e nwekwara ebe ndị ọzọ ndị ojiegbe kpara ike n’Imo Steeti n’otu ụbọchị Mọnde ahụ.
Otu onye kwuru na ije dịka elekere itoolu nke ụtụtụ Mọnde na ndị ojiegbe bu ụgbọala wakporo ụlọahịa ndị POS dị nso n’ebe a kpọrọ Rapour Junction, nara ha ego ha ji azụ ahịa nakwa ihe ndị ọzọ.
N’otu aka ahụ, onye ọzọ kwuru na e zukwara ndị ahịa POS ohi n’ebe a kpọrọ Amawire dị n’Orji nke ụzọ si Owerri gawa Okigwe.
Ọzọkwa bụ na ndị ojiegbe a wakpokwara ndị ahịa POS nọ na Christiana Junction nke okporoụzọ Egbu n’ihe dịka elekere asatọ nke ụtụtụ ma zuo ha ohi.
O doghi anya ma ọ bụ ofu ndị ojiegbe kpara ike niile ka ha ekesara onwe ha ekesa maọbụ ndị otu ndị ojiegbe dị iche iche.

Ebe foto si, getty
Cheta na Imo steeti so n’otu steeti ọnọdụ nchekwa ya kachasị njọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ dịka akụkọ ntọrị, ogbugbu, ohi nakwa mpụ ndị ọzọ dị elu.
Gọọmentị Imo steeti ekwuola ọtụtụ oge na ọ bụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-akwado ndị ekperima ka ha na-eme mpụ ndị a.
Ebe ndị ọrụ nchekwa na-ebo otu chọrọ nwereonwe Biafra bụ Indeginous People of Biafra (Ipob) ebubo na aka ha dị na mwakpo ndị a mana Ipob agọọla site n’ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powerfula na aka ha dị ọcha.
N'akụkọ nchekwa ọzọ, a hụrụ ozu mmadụ abụọ n'ogige ndị ntọrị mmadụ n'ọhia Ihiagwa nke Imo steeti.
Ndị uweojii Imo bọpụtara ozu mmadụ abụọ n'ogige ndị ntọrị mmadụ n'Ihiagwa

Ebe foto si, Imo State Police
Ndị uweojii Imo Steeti abọpụtala ozu mmadụ abụọ n’ogige ndị ntọrị mmadụ dị n’oke ọhia n’agbata obodo Avu na Ihiagwa nke steeti ahụ n’ụbọchị Mọnde 29 Jenụwarị 2024.
Ọnụ na-ekwuru ha bụ Henry Okoye wepụtara ozi a ma kwuo na ha wakporo ogige ndị ntọrị a site n’enyemaka ndị dinta obodo.
O kwuru na ha nwuchiri mmadụ ise a na-enyo enyo bụ ndị ntọrị nke gụnyere Muazu Awuta dị afọ 30, Abdullahi Abubakar d i afọ 32, Ozeru Sabo dị afọ 25, Sadam Suleiman dị afọ 27 na Bashir Yahaya dị afọ 28.

Ebe foto si, Imo State Police
O kwuru na ndị a ha nwuchiri na-enyere ha aka ugbua na nyocha ha na-eme iji nwuchie ndị otu ha ndị ọzọ.
Ọ gara n’ihu kwuo na na ha na-eche na ozu mmadụ abụọ ahụ ha hụrụ bụ nke ndị a tọọro mana ha ga-eme nyocha iji chọpụta kpọkwem ndị ha bụ.
Henry kwuru na ha hụrụ ihe ndị ọzọ gụnyere mkpanaka, akpụkpụ ụkwụ, ọtụtụ ekwentị na ọgbatumtum ise ndị ntọrị ji arụ ọrụ.
E nyochapụtakwara ogige ọzọ ebe ndị ojiegbe na-eri anụ mmadụ n’Okigwe

Ebe foto si, Nigerian Army
Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ekwuola na ha wakporo ogige ndị otu chọrọ nwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) na Eastern Security Network (ESN) na gburugburu obodo Umulolo-Umukele nke okpuruọchịchị Okigwe dị n’Imo Steeti.
Osote ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa 82 Division Enugwu kwuru na ha mere nke a site na njikọ aka ndị uweojii, ndịagha mmiri nakwa nke ala, tinyere ndị ọrụ ‘civil defense’.
O kwuru na ha chọpụtara ọtụtụ ihe dị iche iche n’ogige ndị a nke otu n’ime ha gosiri na ndị a na-eri anụ mmadụ nke bekee kpọrọ ‘cannibalism’.
Ọ gara n’ohi kwuo na ha chọpụtakwara na ndị otu a na-agwọ oke ọgwụ dị iche iche nakwa mpụ ndị ọzọ.
Ihe ndị ọzọ ha chọpụtara gụnyere;
Ogige ebe a na-arụpụta ogbunigwe, akara uwe ndị uweojii abụọ bụ ndị ha tọọrọ n’okpuruụzọ si Enugwu gawa Portharcourt, akwụkwọ ego Biafra, akwụkwọ ego dọla nke adịgboroja, uwe ndịagha Biafra, uwe ndịagha Naịjirịa nakwa ogbunigwe dị iche iche.
Ha nwuchikwara mmadụ abụọ a na-enyo so n’otu ndị a.

Ebe foto si, Nigerian Army
Cheta na nke abụghị mbụ akụkọ iri anụ mmadụ na-apụta n’ogige ojiegbe na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
N’ọnwa Disemba afọ 2021, ndị ọrụ nchekwa wakpokwara ogige ndị ojiegbe n’obodo Nkwere-Uda dị n’Orsu, Imo Steeti ma chọpụta na ndị a na-ahụ anụ mmadụ n’ọkụ ma na-eri ha.
Mana ọnụ na-ekwuru otu Ipob bụ Emma Powerful pụtara n’oge ahụ kwuo na ọ bụghị ndị otu ha na-eri anụ mmadụ n’Orsu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post









