Asagba nke Asaba: Ihe i kwesịrị ịma maka Obi Chike Edozien lara mmụọ

Eze Chike Edozien, Asaba nke Asaba nke 13

Ebe foto si, Asaba.com

Eze ọdịnala ndị Asaba mabụrụ Asagba nke Asaba Chike Edozien anwụọla ka ọ gbachara afọ 99.

Ọ nwụrụ n'ụbọchị Wenezde dịka ndị nọ ya nso si kwuo.

Otu onye nọ ezinaụlọ ahụ nsọ n'Asaba achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo si. " Ọ bụ eziokwu na ọ nwụọla mana dịka omenala anyị sị dị, ekwesịghị ikwu bedị na ọ nwụọla, ọ gara ahịa."

O kwuru na ọ bụ naani ma e mezuru dịka omenala si dị ka a ga-ekwupụta ọnwụ Eze ahụ bụ onye ọrụahụike na onye nkuzi mahadum tupu ọ nwụọ.

Mana onyeisi ala Naijiria bụ Bola Ahmed Tinubu ezigarala ezinaụlọ ya na ndị otu jikọrọ ndị eze ọdịnala na Delta steeti ozi itiaka n'obi.

Ọ bụ ọkammụta dọkịta na ọchọudo nwere agba-Tinubu

Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu etiela Ezinaụlọ Asagba nke Asaba aka n'obi maka ọnweụ nna ha.

N'ozi o zi pụtara nke onọnụ na-ekwuru ya bụ Ajuri Ngelale binyere aka ma wepụta ụbọchị Tọzde, Tinubu onye kọwara Edozie dịka dọkịta nwere agba sịrị, "Eze biri ndụ ya n'uju , chọọ udo, idinotu, eziokwu na ịkwụwa aka ọtọ," ma gbakwụnye sị, "nke a bụ nnukwu ihe mwute ugbua ndị ọchọ udo dị Naijiria mkpa."

Onye bụdị Eze Chike Edozien nwụrụ?

Eze Chike Edozien bụ Asagba nke Asaba nke 13.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọ bụbụ onyenkuzi mahadum na 'Chemical Pathology' na mahadum Ibadan bụ "University College, Ibadan(UCH)" tupu ọ gaghachi Ireland ịga gụkwu akwụkwọ.

A mụrụ ya n'afọ n'afọ 1925 n'ezịnaụlọ Nathaniel Ezozien bụ onye si n'agbụrụ Nnebisi bụ nna ndị Asaba.

Ọ gara akwụkwọ Praịmarị na 'Catholic School' dị na Warri, sekọndịrị ya na Christ the Kings' College, Ọnịcha , gụkwa na Yabatech tupu ọ gaa Gana gụọ na Achimota School, dị na Accra, Gana.

Edozien malitere akwụkwọ mahadum ya n'afọ 1944 na mahadum 'University College of Dublin' dị n' Ireland'.

Ọ gụchara 'Physiology' na mahadum 'National University of Ireland' n'afọ 1948. mee 'Masters' ya na 'Physiology' n'afọ 1950, ọ gakwara n'ihu gụụ ịbụ dọkịta.

Ọ bụ onye nkuzi mahadum nakwa onye ọrụ ahụike nwere agba tupu ọbanye n'ọkwa eze ọdịnala.

Edozien malitere ọrụ dịka onye nkuzi 'Clinical Biochemistry' na 'Middlesex Hospital Medical School, nke mahadum 'University of London' n'afọ 1951 tupu ọ laghachi Naijiria n'afọ 1952 ma malite ọrụ dịka nnukwu onyenkuzi 'Chemical Pathology' na UCH n'afọ 1951.

Ọ gbara ọzọ ndụ oge agha dara gbapụ mba ofesi dịka e boro ya ebubo na aka ya so na ndị kpara nkata ndị mere ka Biafra wakpoo 'Midwest' n'afọ 1967.

Ọ lụrụ nwaanyị bụ Modupe Smith bụ onye na-arụkwa na UCH oge ahụ dịka 'radiographer' ma bụrụkwa nwanwa Herbert Macaulay, otu n'ime ndị lụrụ Naijiria ọgụ nnwereonwe n'aka ndị Briten.