Igwe Achebe na ndị eze Anambara akatọọla 'mbata ndị Almajiri n'Ọwụwa Anyanwụ'

Obi na-achị Ọnịcha
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Obi na-achị Ọnịcha nakwa Igwe na Eze ndị ọzọ n'Anambra steeti akatọọla 'mbata ndị almajiri n'ọwụwa anywanwụ'.

Igwe Nnaemeka Achebe bụ onyeisioche ọgbakọ ndị Igwe ahụ kwuru ka ndị gọvanọ ọwụwa anywanwụ hie asaa n'anya gbasara okwu a.

N'ime akwụkwọ ozi ọgbakọ ndị Igwe wepụtara ha kwuru sị "okwu a metụtara anyị nke ukwu n'ihi na ọ dị ka ndị almajiri a ebutela ọrịa Covid-19 tupu ha agbadata n'ala anyị"

Ha kwukwara "anyị na-arịọ ndị gọvanọ niile n'ọwụwa anyanwụ ka ha gbaa mbọ hụ na ndị almajiri abataghị na steeti anyị n'ihi na ha agaghị esonyenwu n'ihe metụtara akụnaụba obodo, mmekọ ọha nakwa omenala dị adị"

Cheta na n'abalị ole na ole gara aga, e jidere gwongworo bu ọtụtụ ụmụntorobia e chere na ha bụ ndị Ugwu n'oke ala Abia steeti.

Tupu nke ahụ emee, e nwetakwara gwongworo ọzọ n'oke ala Enugwu steeti nke ndị ọrụ nchekwa chụghachiri azụ.

Ebonyi steeti akwụsịla mmachi ọgbakọ ụlọụka na okpukpere ndị ọzọ

David Umehi

Ebe foto si, EBONYI GOVERNMENT

Nkọwa foto, David Umahi gọvanọ Ebonyi steeti

Gọọmentị Ebonyi steeti ekpebiela ịgbape ụlọụka nakwa ebe okpukperechi ndị ọzọ na steeti ahụ n'ihi arịrịọ nke ndị isi otu CAN nke steeti ahụ rịọrọ ya.

O kwuru na ọgbakọ ụlọụka ọbụla agaghị agafe mmadụ narị ise ma nyekwa onwe ha efe, na mkpuchi ihu nakwa ịkwọ aka ga-adịrịrị ma kwuo na a ga-agbachi ụlọụka ọbụla a chọpụtara dara iwu nke a.

O kwukwara na ekpere niile a na-eme ga-amalite n'elekere itoolu nke ụtụtụ ma jedebe n'elekere iri na otu n'ụbọchị ha họpụtara ị me ya.

Jude Idimogwu abụrụla onyeisi ndị Igbo na APC Legọs

Jude Idimogwu

Ebe foto si, Jude Idimogwu/Facebook

Naanị otu onye Igbo so nn'ụlọomeiwu nke Legọs steeti bụ Jude Idimogu aghọrọla onyeisi ndị Igbo n'otu APC n'alaka Legọs.

Ọ bụkwa Eze Ndi Igbo dị icheiche họpụtara Jude Idimogwu bụkwa onyeisioche otu mwulite akụ n'ụlọomeiwu Legọs maka ọkwa a.

Idimogu na-anọchite anya Oshodi/Isolo kọwara na ọtụtụ ndị Igbo anaghị atụnyere APC n'ihi na ọchịchị anaghị eru ha aka n'oge.

Gọọmentị etiti enyela iwu ka emepe ụlọakwụkwọ isii ọzọ na Naịjirịa

Gọọmentị etiti enyela iwu ka emepe ụlọakwụkwọ isii ọzọ na Naịjirịa.

Nke a pụtara ihe n'ozi Bashir Ahmed bụ onye enyemaka onyeisiala Buhari depụtara n'elu soshal midia ya.

Steeti ndị ahọpụtara maka ụlọakwụkwọ ọhụrụ ndị a bụ Ebonyi, Edo, Sokoto, Benue, Bauchi nakwa Osun steeti.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post