Coronavirus lockdown: Etu e si achụghachị ọtụtụ ndị na-achọ ịbata n'Abia na Enugwu Steeti

Ndị si n'otu steeti aba n'ọzọ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Kamgbe ọnwa abụọ gara ka ọtụtụ steeti na Naịjirịa bidoro mmachi i si na steeti bata na steeti n'ihi coronavirus.

N'otu aka ahụ Onyeisiala Buhari nyekwara iwu ka agbachie okeala jikọtara steeti niile, mana na ọtụtụ mmadụ ka na-esi n'otu steeti baa n'ọzọ.

Ọtụtụ mgbe ka a nụ akụkọ na ndị nchekwa nwuchiri ndị si mpaghara ugwu na-chọ ịbata na steeti dị n'ọwụwanyanwụ.

Mana i ji chọpụta nke bụ eziokwu, anyị kpọtụrụ ndị gọọmentị ụfọdụ steeti dị n'ọwụwanyanwụ.

N'Abia Steeti odeakwụkwọ mgbasaozi gọvanọ Okezie Ikpeazu bụ Onyebuchi Ememanka, ọ sị na nke a bụ eziokwu.

O kwuru na ọtụtụ mgbe ka ndị ọrụ nchekwa nwuchiri ụgbọala bu ndị mmadụ na-achọ ịbata Abia Steeti.

Skip Facebook post, 1

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 1

N'ịmaatụ, ọ sị na e jidere ụmụnwaanyị si Akwa Ibom nabata Aba, jidekwa ndị awụsa si ụzọ Enugwu nabata Aba na nso nso.

Ọ sị na nso nso na e jidekwara ụgbọala ukwu bu ndị ugwu si Akwa Ibom nabata Umuahia mana a chụghachịrị ndị niile ahụ azụ ebe ha si.

N'otu aka ahụ, kọmishịọna mgbasaozi n'Enugwu bụ Chidi Aroh sị na ọtụtụ mgbe ka ndị ọrụ nchekwa na-anwụchi ndị na-abata na steeti ha.

Skip Facebook post, 2

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 2

Ọ sị na na-esi na steeti dị iche iche gụnyere Legọs, Abuja, nakwa mpaghara ugwu ndị ọzọ.

Mana ọ sị na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa ka ọ dị n'aka ịma kpọmkwem ebe ndị a si na-achọ ịbata Enugwu.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu Steeti bụ Daniel Ndukwe gwara BBC Igbo na ha na-achụghachị ndị ekwesịghị ịbata n'obodo ruru okeala nso.

Na kọmshịona uweojii bụ Ahmed Abdulrahman na-agarukwa ebe ahụ ịhụ etu ndị otu ya si echekwa okeala ndị ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: