Ewepụla kọmishọna uweojii Kogi kwuru sị chọta Dino Melaye

Ebe foto si, @DinoMelaye
Onyeisi ndị uweojii gburugburu Naịjirịa bụ Ibrahim K. Idris, ewepụla kọmishọna ndị Kogi steeti bụ Ali Janga ka o nyechara iwu sị chọta sinetọ Dino Melaye.
N'akwụkwọ ozi onye na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Jimoh Moshood zitere, o kwuru na Idris họpụtara Esa Sunday Ogbu bụbụ kọmishọna nke Federal Operations nke isiụlọọrụ ndị uweojii dị n'Abuja, ka ọ nọchie Janga ewepụrụ.
Idris kwuru na ihe mere o jiri wepụ Janga n'ọkwa bụ maka na ọ ghọtaghị etu mmadụ isii bụ ndị anwụchiri anwụchi a na-enyo enyo ga-esi gbapụ n'ime ebe ndị uweojii dobere ha n'isi ụtụtụ Wenesde.
O kwuru na Janga emeghị ka onye ihe gbasara, na ọ kpazighị agwa ọfụma.
N'ime mmadụ isii ahụ gbafuru agbafu, mmadụ abụọ tụrụ sinetọ Dino Melaye aka, sị na ọ bụ ya nyere ha egbe ndị uweojii hụrụ n'aka ha.
Ndị uweojii nyere iwu sị 'chọta Dino Melaye' ma tinye aha ya na ndị Interpol na-enyo enyo.
Ndị isi uweojii kwuru sị na ndị uweojii ahụ ndị a na-enyo enyo gbanahụrụ, ga-ata ezigbo ahụhụ gbasara ya.




