Yulia Skripal na nna ya e nyere nsi na UK adịla mma

Ebe foto si, EPA/YULIA SKRIPAL/FACEBOOK
Yulia Skripal bụ onye e nyere ya na nna ya Sergei Skripa nsi na mba Briten n'ọnwa gara aga apụọla n'ụlọgwụ ebe ọ na-anatabu ọgwụgwọ.
Onye kwuru nke a ụị onyeisi ụlọọgwụ, Salisbury District bụ Christine Blanshard, n'okwu ya, "Anyị ahapụlaa Yulia.
Nna ya naha adịkwa mma, ụbọchị Fraide, e kwuru m na ọ nọghịzị n'ọnọdụ ize ndụ mana ọgwụgwọ ya anaghị aga ọsịsọ ka nke Yulia.
Anyị na-ele anya na ya onwe ga-apụa n'ụlọọgwụ n'ọdịnaihu."
Cheta na mba UK boro mba Rọshịa ebubo na ha zitere ndị nyere mmadụ abụọ ahụ nsị n'ala UK.
Nke a mere mba UK na mba ndị ọzọ ruru 20 na mpaghara Yurop ji chụpụ ndị ọrụ Rọshịa nọ na mba ha maka ya bụ nsị.
Mana Rọshịa kwusiri ike na ha emeghi ihe ọbụla.

Akụkọ ga-amasị gị:







