Ịhe ndị Naijiria na-ekwu gbasara nkwupụta Buhari

Aha onyonyo, Ntuliaka 2019: Ndị mmadụ ekwuola obi ha gbasara Buhari

O tebeghị aka onyeisiala Naịjrịa bụ Muhammadu Buhari kwuputechara na ọ ga-azọ ọchịchị ọzọ na 2019.

Ọtutu ndị mmadụ, ọkachasị ndị otu pati dị iche iche nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu ekwuputala uche ha gbasara ya bụ nkpebi.

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, SIMON MAINA

Nkọwa foto, Ụfọdụ mmadụ na-akatọ,ebe ụfọdụ nabatara mpụta onyeisiala maka ịzọ ọchịchị ọzọ

Ndị otu akpọrọ Indigenous people of Biafra na ichafụ IPOB,ekwuola na obi dị ha ụtọ maka Buhari ị puta ọzọ ịzọ ọchịchị.

Ha kwuru na ọ bụrụ na Buhari merie,IPOB ga-enweta Biafra ọsịsọ.

Aha onyonyo, Ụkọchuku Peace: Chịneke ga-eji Buhari wetara anyị Biafra

Onye ọkaiwụ nakwa onye bubu onyeisi aka Ikenga akpọrọ Goody Uwazurike kwuru na iwu obodo akpọrọ ''constittution'' kwadoro onyeisiala ịzọ ọchịchị ọzọ,

mana ọ bụ ihe o metere ka a ga-eji mata ma ọ ga-meri na ya bụ ntụliaka na-abia nụ.N'uche ya ọ cheghị na o metere ọfụma.

Onyeisi pati akpọrọ ''United Progressive parti'' (UPP) bụ Chekwas okorie na ya bụ mkpebi bụ ihe ama na ọ ga-eme eme mana parti ya na ndị ga-ejikọ

wepụta otu pati ga-achụpụ onyeisiala na ntụliaka 2019. Gere okwu ya n'uju:

Aha onyonyo, Ihe ndị mmadu na-ekwu maka mputagharị Buhari

Onye ọkachamara n'ihe gbasara ndọrọndọrọ bụ Ike Abonyi kwuru na ọ bụ eziokwu na ọ bu eziokwu n'iwu obodo kwadoro Buhari ịzọ ọchịchị ọzọ,

mana ajụjụ onyesisiala kwesiri ịjụ bụ arọ one ọdị na ahụike a ga-ekwe ya rụọ ọrụ ọfụma ma ọ laghachị n'ọchịchị. Gere ịhe okwuru ebe a n'uju:

Aha onyonyo, Ihe ndị mmadu na-ekwu maka mputagharị Buhari

N'aka ọzọ,odee akwụkwọ mgbasa ozi pati APC na Legọọsị bụ Joe Igbokwe nabatara ya bụ ozi ọfụma.

N'ọnụ ya ''Buhari bụ nnukwu uru nye pati anyị'',ọ bụ sọ ndị ọjọ na-agaghị enwe obi ụtọ gbasara mpụtagharị onyeisiala"

Pia ihe nkịrị a ka i gere ihe ọkwuru n'uju:

Aha onyonyo, Ihe ndị mmadu na-ekwu maka mputagharị Buhari

Akụkọ ndị ga-amasị gị: