Afghanistan Taliban Crisis: Ihe mere na mba ahụ o nwerike ime na Naịjirịa?

Ebe foto si, Reuters/Getty
Ifeanyi Olumba bụ ọkaibe n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa nakwa nke mba Ofesi ekwuola ihe na-eme n'Afghanistan nwerike ime na Naịjirịa maọbụrụ na gọọmenti emeghị ihe ha kwesiri ime.
Olumba kwuru na etu ndị otu Taliban si nara gọọmenti Afghanistan ọchịchị na-eyi egwu.
O kwuru na o yitere ihe na-eme na Naịjirịa ebe ndị otu Bokoharam nakwa Islamic State West Africa Province (ISWAP) na-achọ ka Naịjirịa nakwa Afịrịka niile nwe sọ otu ọkpụkperechi nakwa kwụsị ndị mmadụ ịgụ akwụkwọ.
Ọ gụnyekwara ndị otu akpọrọ "Bandits" nakwa ndị ọchị ehị na-akpa mkpa mkpa ugbua n'ala Naịjirịa.
Olumba kwuru na ihe a mere na Afghanistan na-aka ndị otu a obi imewanye oyi egwu ha na-eme.
N'ọnụ ya, "Afghanistan ga-ebido kwadowe ndị otu Bokoharam, Bandits, ọchịehi ugbua n'ụdị agha iyi egwu ahụ maka mba ahụ ga-aha bụ isi ụlọọrụ agha iyi egwu dịka ha kpọrala ebe ahụ Islamic Republic of Afghanistan."

Ebe foto si, Screengrab
Ihe gọọmenti Naịjirịakwesiri ime agwọ a nọ n'akịrịka ugbua?

Ebe foto si, Ifeanyi Olumba
"Ihe gọọmenti Naịjirịa kwesiri ime bụ ịmata site ugbua na nnukwu nsogbu adaala ma lụsie ọgụ a ike ma kwụsị otu ndị na-eyi ụmụ Naịjirịa egwu ugbua."
"Maka ha mechaa nara ọchịchị na Naịjirịa, otu ndị a ga-aga wekọrọ ọchịchị na mba ndị gbara Naịjirịa okirikiri."
Olumba kwuru na ọ dị mkpa ka gọọmenti etiti kpọọ otu ndị na-atọrọ ụmụ mmadụ tụmadị ụmụakwụkwọ ma tụwa ha ime, gbuo ọtụtụ mmadụ, otu oyiegwu.
"Kedụ ka gọọmenti ga-esi kwu na ha gbagharala ndị na-atọrọ ụmụaka kpọba ha ọhia, wakpo ha n'ike, tụba ha ime ma kpọrọ ụmụ ha mụtara ndị Bandit maọbụ Boko Haram lakwute nne na nna obi na-agbawa." bụ ihe Olumba jụrụ.
O kwuru na ọ ga-adị mma ka gọọmenti Naịjirịa kpọkọọ ọgbakọ nke mba Afịrịka dị iche iche ka nwee nkwekọrịta etu a ga-esi memina otu ndị na-eyi ndụ egwu tupu ha rie Afịrịka niile.

Ebe foto si, AFP
Olumba chọrọ ka onye ọbụla tinye ọnụ n'okwu a makana ezigbo nsogbu adaala.









