Afghan Peace Deal: Amerịka na ndị Taliban enwela nkwekọrịta ịkwusị agha

Mullah Abdul Ghani Baradar, the leader of the Taliban delegation, signs an agreement with Zalmay Khalilzad, U.S. envoy for peace in Afghanistan, at a signing agreement ceremony between members of Afghanistan"s Taliban and the U.S. in Doha, Qatar February 29, 2020. REUTERS

Ebe foto si, Reuters

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ebinyela aka na nkwekọrịta e mere eji hụ na agha mba Amerịka na-ebuso ndị Taliban n'Afghanistan bịara na njedebe.

Nkwekọrịta a enwere na mba Qatar ga-ahụkwa na ndị Afghanistan n'onwe ha malitere mkparịta udo.

Ọ bụ mkparịta ụka Amerịka na Taliban butere nkwekọrịta a.

Onye na-anọchite anya Taliban na Qatar bụ Mullah Abdul Ghani Baradarsị na he di nkwadobe ị hụ na e mere ihe niile e kwesịrri ịhụ na nkwekọrịta kwuru ọfụma. s

Mba Amerịka n'onwe ha na mba Afghanistan wepụtara akwụkwọ ozi gosiri mkpebi ịmalite iwepu ndị agha Amerịka na mba ahụ ruo 8600 n'ime abalị 135, ma hụ na onweghi onye agha Amerika fọrọ na mba ahụ n'ime ọnwa 14.

Ihe mere Onyeisiala Buhari ji nye onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbaghara ndị Naịja Delta ezumike

Professor Charles Dokubo

Ebe foto si, Prof. charles dokubo/twitter

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ebinyela aka n'atụmatụ inye onyeisi ngalaba akpọrọ Presidential Amnesty Programme bụ Charles Dokubo ezumike nwamgbenta.

Ezumike a e nyere Maazị Dokubo ga-enye kọmiti gọọmentị họpụtara ohere ka ha nyocha ebubo mpụ na nrrụrụaka eboro ya.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Ọ bụ onye na-ekwuru Buhari bụ Femi Adesina binyere aka n'akwụkwọ bu akụkọ.

Ọ bụ n'afọ 2018 ka e nyere Maazị Dokubo ọkwa a dịka a chụrụ Paul Boroh n'ọrụ maka ebubo nrụrụaka kwa.

N'Ofesi

Ndị na-echekwa onwe ha maka ọrịa Covid-19

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị na-echekwa onwe ha maka ọrịa Covid-19 na Legọs

Ngalaba na-ahụ maka ahụike ụwa niile bụ WHO ekwuola na obi dị ha ụtọ etu Naijirịa si alụsọ ọrịa Coronavirus ọgụ.

Ọ bụ onye na-anọchite anya ngalaba a na Naijirịa bụ Peter Clement kwuru nke a ma dọo aka na ntị were sị na akụkọ asị ga-ebute mgbasa ọrịa .

Clement kwukwara were sị ka ụlọọgwụ ndị nọrọ onwe ha na gọọmentị rụkọọ ọrụ ọnụ n'ihi na ndị ụlọorụ ahuike na-amaghị maka ọrịa Coronavirus na enyere aka ị gbasa ya bụ ọrịa.

Adọtiela ntuliaka Guinea ruo izuụka abụọ

Alpha Conde

Ebe foto si, Reuters

Onyeisi ala mba Guinea bụ Alpha Conde ekwuputela na ntuliaka kwesiri imalite na mba ahụ echi ga adọtị aka ruo izuụka abụọ

Ntuliaka a ga-abu nke a ga-eji mara ma a ga-agbanwe iwu mba Guinea ji nye ohere na Conde dị afọ iri asatọ na otu soro zụọ ọchịchị ọzọ.

Fifa ga-akagbu asompị

Gianni Infantino

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Gianni Infantino weghara ọchịchị n'aka Sep Blatter n'afọ 2016

Onyeisi Fifa bụ Gianni Ifantino ekwuola na ha nwereike kwagbuo asọmpị dị ichị ichi ekwesiri ịgba n'ọnwa Maachị gunyere nke eji ahọputa ndị ga-esonye sụọ mpị EURO 2020

Ọ sị na nke a bụ maka nje Coronavirus na eferagharị na ọ tụtu mba.

Ufọ otu egwuregwu ejirila maka ya kagbuo ikwe n'aka n'asọmpi.