Ebonyi state news today: Onyeisi ndị ntoroọbịa APC na ndị uweojii abụọ nwụrụ n'ụgbọala danyere n'olulu

Ndị ọrụ gbata gbata agụpụtala ozu mmadụ atọ nke otu n'ime ha bụ Ogochukwu Elem bụ onyeisi ndị ntoroọbịa otu pati APC na ndị uweojii abụọ n'olulu ụgbọala ha danyere n'Ebonyi Steeti.
Gọvanọ Ebonyi steeti kwuru na ya bụ ihe na-echu ụra ma yie ndị ụlọọrụ hapụrụ ya bụ olulu na-ekpochighi ya.
O kwuru na obi adịghị ya mma etu ụfọdụ ụloorụ si enupu isi maka ihe gbasara iwu gọọmentị hiwere maka ịgwuputa akụ ọnatarachi.
Ụgbọala a dabanyere n'ime olulu mmiri juru n'ime ya na mberede okporoụzọ mere na mpaghara Ikwo n'Abakaliki.

Ụgbọala A bụ nke Volks Wagen Golf na-eme njem a ga Ikwo n'oge ọdachị a mere n'ụbọchị Satọde, August 14, 2021.
Ọ bụ n'elekere atọ nke ehihe ka o mere.
Onunu ahụ bụ nke ndị ụlọọrụ na-egwụpụta nnụ n'ime mmiri nke akpọrọ "Royal Salt Mining company" gwuru.
Dịka o mere, ndị ọrụ gbata gbata malitere njem ịgụpụta ụgbọala ahụ.

Ebe foto si, BBC Sport
Ọ bụ n'ụtụtụ Mọnde ka e mechara were ụgbọala katapila gụpụta ụgbọala ahụ.
Anya hụrunụ kwukwara na ka ihe a si mee, ike ikwa ụgbọ pụrụ ọkwụ ụgbọ n'aka nke mere o ji kụpụ n'ụzọ sọnye isi n'ime ogige onunu a ndị ọrụ Royal Salt Mining Company na-egwupụta nnụ ma lunye ndị njem a n'ime mmiri nke mere mmiri ji rie ha niile.



Ụlọọrụ "Royal Salt Mining company"nọ na mpaghara Enyigba, nọ n'okpuruọchịchị Ikwo dị n'Ebonyi Steetị. Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe ahụ n'ụbọchị Sọnde, sị na ndị ọrụ nchekwa nọ ebe ahụ na-achọ ịdọpụta ndị a a si na-eme ya bụ njem dakpụrụ n'onunu ahụ dịka ihe odachi a mere ụnyaahụ.

Ndị ọrụ nchekwa gbata gbata na-agba mbọ ugbua i butekwa akụrụ ngwa pụrụ iche e jị adọpụta ndị mmadụ n'ime mmiri.
Onyeisiokpuru ọchịchị ebe ahụ dukwa ndị okacha mara na-igwu mmiri ka ha tinye aka na mbọ ha na-agba idọpụta ndị a.
Ihe ndị uweojii kwuru maka ọdachị a
Loveth Oda bụ ọnu na-ekwuchitere ndị uweojii n'Ebonyi steeti kwuru na ọ bụ ụgbọala a na-amabeghị ka ọ dị dakpuru na nnukwu onunu ahụ ebe e si egwupute ihe.
O kwuru na ụgbọala ahụ bu ndị mmadụ ruru ise.
O kwuru na igwe 'Kraine" na-agụpụta ihe

"Ọ bụ onunu ebe a na-eegwupụta ihe bu ebe ahụ ihe a mere, mana ekpochịghị ya, mmiri ozuzo banyezie a kpatara mmiri ji juu n'onunu ahụ."
"Ndị ọrụ gbata gbata na-agba mbọ ịma ma onwere onye ịhe a metụtara ha ga-agụpụtalị."
"Ugbua a anyị amabeghị ndị gwuputara ihe n'onunu ahụ , anyị na-enyocha ihe mberede a merenụ."
"Anyị ga-agwa ọhaneze ihe anyị chọpụtara n'oge na-adịghị anya."










