Anaghị m ekwenye n'ihe niile Nnamdi Kanu na Igboho na-ekwu mana ha bụ ezigbo enyi m - Femi Fani Kayode

Ebe foto si, Femi Fani Kayode
Onye bụbu Mịnịsta njem ụgbọelụ Naijịrịa bụ Femi Fani-Kayode kwuru na ọ kwadoghi nkewa Naijịrịa maọbụ agha ọ bụla ga-esilete isi na mba Naijịrịa.
Ọ bụ n'ọgbakọ ndị otu ntaakụkọ Kwararafa Reporters mere n'ụbọchị Tọọzde maka ịdị n'otu ala Naijịrịa nke isi okwu ya bụ "One Nigeria: A Critical Look into the Future" ka o kwuru nke a.
N'okwu ya Femi Fani-Kayode kwuru si:
"Udo ka mma n'okwu ala anyị, agha abụghị ụzọ ziri ezi. Mụ na ọtụtụ ndị mmadụ arụkọla n'oge gara aga, obughị mmadụ niile a ka mụ na ha nwere nkwekọrịta ma agaghị eji maka na anyi enweghi nwekọrịta kagbuo emi enyi dị n'etiti anyị"
Ọ gara n'ihu kwuo ụfọdụ n'ime ndị bụ enyi ya nke otu n'ime ya gụnyere Nnamdi Kanu
O kwuru sị: "Nnamdi Kanu bụ ezigbo enyi m agbanyeghi na anyị anaghi enwe nkwekọrịta oge niile, mụ na ya zukọrọ n'ime ụlọ nga nke Kuje".
"Sunday Igboho bukwa enyi m. Mu na ya arụkọọla ọrụ n'oge gara aga, ọ kachasi mgbe anyị jịkọrọ aka mee mkpesa ka egbulie mmachi amachiri ịbụta nri nke onyeisiala Buhari gere nti mee"
O kwuru si "Ịwe mmadụ niile na ala Naijịrịa ruru ha, ma ndị ugwu, ma ndị ndịda, enwere etu Naijịrịa si emejọ ma emetụta mmadụ niile. Anyi aghaghi eji maka mmejọ ndị a gbuwe maọbụ katọba onwe anyị kama ka anyị niile jịkọọ aka ọnụ soro ụzọ udo nakwa ịdị n'otu ịhụ maka ọgaihu ala anyị"
Fani-Kayode kwukwara uche ya maka ndị na-acho nkewa Naijịrịa maọbụ nwere onwe
O kwuru si na ala Naijịrịa ka mma etu ọ dị, o kwukwara na nkewa abụghị ihe ga-emezi nsogbu anyị ugbua kama ọ bụ itinye ndị ọchịchị ziri ezi n'oche, ihazigharị usoro ọchịchị nke bekee kpọrọ "restructuring" nakwa ikpe udo maka ihe ndị mere n'oge gara aga.
O kwuru si na dịka e si gbuo ụmụ Igbo na agha Biafra, na egbukwara ndị mmadụ na mpaghara oke Naijịrịa mana na onweghị onye na-ekwu maka ndị a nwụrụ.
Na nchịkọta okwu ya, o kwuru ka mmadụ niile gbaghara onwe ha n'ịhị na anyị niile bụ ụmụ nne kama ka anyị hụ n'udo na-achi na ala anyi.
O kagburu mkpụ agha ụfọdụ ndị mmadụ na-eti ma kwusie ike na udo kama, ọ kachasi dịka ntụlịaka nke afọ 2023 na-abịa.











