Sex for marks: Onyenkuzi OAU ga-aracha nga afọ abụọ

Ebe foto si, OAU Facebook page
Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na Richard Akindele nọ na-achọ idina nwa akwụkwọ ya tupu o bufee ya n'ule, ga-aga mkpọrọ afọ abụọ.
Ọkaikpe Maureen Onyekenu, nyere iwu a n'ụlọikpe dị n'Ọshụn steeti, ka Akindele na-akuzi na mahadum Obafemi Awolowo (OAU), ka Akindele mechara kwenye na o mere Monica Osagie bụ nwa akwụkwọ ya, ihe e boro ya.
Onyekenu kwuru na Akindele ga-anọ n'ụlọmkpọrọ dị n'Ilesha, maka ụdịrị ihe o mere, nke o kwuru "na-amụbanye n'ime obodo a."
Onyekenu kwukwara na e kwesịrị inwe onye ga-ama n'ọnya, ka ọ kuziere ndị nkuzi na-emeso ụmụakwụkwọ ha ụdịrị omume a na mahadum, mụrụ akọ.
Francis Omotosho bụ ọkaiwu Akindele, rịọburu ụlọikpe arịrịọ ka ha gbaghara ya.
Akụkọ ga-amasị gị:




