Nwoke na-awakpo ụmụnwanyị, nara ha nwa n'Ebonyi nọ anyi n'aka - Ndị uweojii

Ebe foto si, AFP
Ndị uwojii n'Ebonyi steeti ekwuola na nwoke ha ji maka ozu nwata nwaanyị a hụrụ n'Abakaliki gwara ha na ya akpala ụdịrị arụ a mbụ.
Ọnụ na-ekwuru uweojii n'Ebonyi steeti bụ Loveth Odah gwara BBC na ya bụ nwoke a na akpọ Uchenna Awoke kwuputere na ọ sụrụ nwaanyị dị ime mma, ma nara ya nwa ya dị afọ atọ gbalaga.
Awoke gara n'ihu kwuo na o tufuru nwaanyi ahụ n'ime ọhia.
Ndị uweojii kwuru na o bụ ha bugara nwaanyị ahụ ụlọọgwu ebe nwa dị ya n'afọ nwụrụ n'ihi na ọgbaala oke ọbara.
Nwunye Awoke gwara ndị uweojii na di ya enyetula ya ọgwụ ọjọọ were tọrọ nwa ha nwoke ga ree nara ego.
Akụkọ ndị a pụtara ihe ka uweojii kpara Awoke aka maka ozu nwaanyị ahụrụ n'ụlọ oriri na nkwari akpọrọ Crown Garden Resort dị n'Abakaliki.
Ozu nwaanyị ahụ erewela ere mgbe a chọpụtara ya.
Ndi uweojii sị na ozu nwaanyị ahụ dị n'ụlọozu dịkwa n'Abakaliki.

Ebe foto si, AFP
Odah gwara BBC Igbo na ọ bụ Awoke kpọtara nwaanyị ahụ na ụlọ oriri na nkwari a.
Ndị uweojii sị na Awoke kwuputere na ọ bụ ya gburu nwaanyị ahụ.
O kwukwara na ọ bụ eziokwu na ya tọrọkwa nwa ya ga ree.
Odah gwara anyị na Awoke na nwunye ya nọ n'ụlọmkpọrọ ugbua.
Ha si na Awoke ji aghụghọ na-arata ụmụnwaanyị kpọ nwa iji nara ha ụmụ ha wee resị ndị mgbere mmadụ.
Ọ dọkwara ndị ọha aka na ntị si na onye ọbụla gbado anya n'ihi na ndia na egbu mmadu enweghị ọrụ aka.
Ọ sị; "Kedụzi ka onye enweghị ọrụ aka ga-esi enye mmadu ọrụ? Onye ọbụla saa anya."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:











