BBC achọpụtala ụlọọrụ mba India na-arụpụta ọgwụike na-akpa mkpamkpa n'ọdịda anyanwụ Afrịka

Vinod Sharma.
    • Onye dere ya, BBC Eye Investigations
    • Ndị mere akụkọ a, BBC World Service
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

A chọpụtala ụlọọrụ mba India na-arụpụta ọgwụịke ma na-ebuga ya na Afrịka.

Ọgwụike ahụ na-akpa mkpamkpa na mba Gana, Naịjirịa, na Cote D'Ivoire dịka nnyocha BBC Eye si chọpụta.

Ụlọọrụ ahụ bụ Aveo Pharmaceutical dị na mpaghara Mumbai, India, na-arụ ọgwụ dị iche iche jupụtara n'ihe a na-akpọ 'tapentadol, carisoprod na ihe ndị ọzọ a machiri na Yurop.

Enweghị mpaghara ụwa ebe enyere ndị na-arụ ọgwụ ikike ịjị ya rụọ ọgwụ maka na o nwereike ịkwụsị mmadụ ịku ume maọbụ gbuo onye ṅụfere ya oke.

N'agbanyeghị ọghọm dị na ịnụ ọgwụ ahụ, ndị mmadụ na-azụ ya aghara aghara maka na ọ dị ọnụ ala.

Aha onyonyo, Oge e setere Vinod Sharma ka o sị na ọgwụ 'Aveo cocktail' dị njọ mana ọ bụ ahịa ka ha na-azụ.

Oge BBC chọpụtara na ụlọọrụ Aveo bụ ụlọọrụ dị na mba India, ha zigara otu onye n'ụlọọrụ ahụ dịka onye na-achọ ịzụ ma ree ọgwụ ahụ na Naịjirịa.

BBC ji igwe na-ese onyonyo zoro ezo nwere seta otu onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Vinod Sharma oge ọ na-egosi ọtụtụ ọgwụ ike ha na-ere n' ọdịda anyanwụ Afrịka.

N'ihe onyonyo ahụ ka Sharma kwuru na ọ bụrụ na onye ọbụla nụọ mkpụrụ ọgwụ ahụ abụọ maọbụ atọ na onye ahụ 'ga-ezuike' ọ kwetekwara na onye ahụ nwereike 'ọgwụ ahụ egbuo ya ka mmaya.

Na mpaghara Tamale, na mba Ghana, ọtụtụ ụmụntorobịa na-aṅụ ọgwụ ike dị iche iche nke mere otu onye ọchịchị na obodo ahụ bụ Alhassan Maham jiri hiwe ndị ọrụ nchekwa na-anwụchi ndị na-ere ọgwụ ike ahụ.

Nwoke a ṅụchara ọgwụ ahụ ma kpudo ihu ya n'ala
Nkọwa foto, A na-asị na nwoke a ṅụrụ ọgwụ a na-akpọ Tafrodol

Mgbe e jidere otu onye na-ere ọgwụike, ihe a hụrụ n'akpa ya gunyere ọgwụ Tafrodol. Ọgwụ ahụ nwere njiri mara Aveo Pharmaceuticals.

BBC Chọpụtara na e nwere ọgwụ ndị Aveo rụpụtara nke ndị uweojii jidere n'ebe ọzọ na-abụghị na mpaghara Tamale na mba Ghana

Anyị chọpụtara na a na-ere ọgwụ Aveo n'okporoụzọ na mba Naịjirịa na Cote D'Ivoire bụ ebe ụmụaka na-etinye ya n'ime mmaya ka o nweike gbu ha egbu.

A chọpụtara na Aveo Pharmaceuticals nakwa ụlọọrụ Westfin International na-ebubata ọtụtụ ajọ ọgwụ a n'ọdịda anyanwụ afrịka.

Naịjirịa dị nde mmadụ 225 bụ ebe a na-ere ọgwụ ahụ.

Onyeisioche Nigeria Drug and Law Enforcement Agency (NDLEA), bụ Mohammed Buba Marwa, gwara BBC na "ọgwụike na-emebi ụmụ ntorobịa, ọtụtụ ezinaụlọ nakwa obodo dị icheiche na Naịjirịa.".

Ọgwụ
Nkọwa foto, N'oge e jidere onye na-ere ọgwụ Tafrodol na Aveo na mpaghara Tamale, Ghana
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N'afọ 2018 mgbe BBC Africa Eye mere nnyocha maka ire 'opioid' dị ka ọgwụ n'okporo ámá, ndị ọchịchị Naijiria gbalịrị ijide ọgwụ mgbu 'opioid' a na-emegbu nke ukwuu nke a na-akpọ tramadol.

Gọọmenti machiri ire tramadol n'enyeghị ndenye ọgwụ, machie oke oke n'ụgwọ, ma gbachie mbubata ọgwụ ndị iwu na-akwadoghị. N'otu oge ahụ, ndị ọchịchị India mechiri iwu mbupụ na tramadol.

N'oge na-adịghị anya ka mgbawa a gasịrị, Aveo Pharmaceuticals malitere mbupụ ọgwụ ọhụrụ dabere na tapentadol, opioid nke siri ike karị, jikọtara ya na carisoprodol na-eme ka ahụ ike.

Ndị na-anọghị n'UK ga-ekiri akụkọ a na YouTube.

Ngwa ahịa ọhụrụ Aveo dị njọ karịa tramadol bụ nke ọ nọchiri anya ya.

Dịka Dọkịnta Lekhansh Shukla si kwuo, osote ọkankuzi na National Institute of Mental Health and Neuro Sciences na Bengaluru, India, tapentadol "na-ekwu na ihe opioid na-eme gụnyere ime mmadụ oke ụra.

"O nwere ike ime ka mmadụ enweghị ike eku ume ma mee ịnụfe ọgwụ ahụ oke asdị mfe.

Ọgwụ
Nkọwa foto, Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa dosara ọgwụ ha jidere na Lagos

Onye na-ahụ maka ọgwụ na mba India, CDSCO gwara anyị na gọọmentị India maara ihe ha kwesiri ime banyere ọrụ ha n'ihe gbasara ahụike ọhanaeze ma gbasie mbọ ime na India nwere usoro nhazi ọgwụ siri ike.

Ọ gbakwụnyere na ha na-eleba anya nke ọma na mbupụ ọgwụ si India na-aga mba ọzọ.

CDSCO kwuru na ya na mba ndị ọzọ, gụnyere ndị nọ na ọdịda anyanwụ Afrịka, na-agba mbọ ka ha na mba ahụ jikọọ aka gbochie ire ajọ ọgwụ.

Tafrodol
Nkọwa foto, Mgbe ndị ọrụ nchekwa na mba Gana jidere ndị na-ere ọgwụike na mpaghara Tamale, ma hụ ọgwụ Aveo e dere Tafrodol.

Aveo abụghị naanị ụlọọrụ na-arụpụta ajọ ọgwụ na mba India ma na-ebupụ ya mba ndị ọzọ. Ndị na-emepụta ihe ndị a na-emebi aha ụlọ ọrụ na-emepụta ọgwụ na mba India.

Onye ọrụ nzuzo nke BBC, onye a na-aghaghị ekwu aha ya sị: "Ndị ntaakụkọ Naijiria na-ede akụkọ banyere 'opioid' kemgbe afọ iri abụọ, mana m na-eche ka m hụ ndị so-arụpụta ọgwụ ahụ ihu na ihu. Ọ na-arụpụta ma na-ebubata ya na Naịjirịa. Ọ ma na ọgwụ ahụ dị njọ mana ọ kpọrọ ihe ọ na-eme 'azụmahịa'.