Drug abuse effects: Etu ọgwụ ike 'kush' si akpa mkpamkpa

Aha onyonyo, Etu ndị na-ese 'kush' si akwụ ụgwọ ịzụta ya

Ndị na-ese ihe osise a kpọrọ 'kush' na mba Sierra Leone kọwaara BBC etu o si eru ha aka na ihe ndị ha na-eme iji nweta ya.

BBC nụrụ akụkọ na ọtụtụ ndị ntorobịa na-egbu onwe ha, emerụ onwe ha maọbụ ndị ọzọ ahụ, wee gaa mee nchọpụta maka ya bụ ihe.

Dịka akụkọ si kwuo, ọ naghị ara ha ahụ ịgwọkọ, dịka ha na-eji ụdịrị kemịkal nwereike ikpalite ụbụrụ gbaa n'elu otu ụdịrị akwụkwọ nri.

Otu n'ime ndị na-ese kush aha ya bụ Isha, kwuru na ọ na-agba akwụna iji nweta ego o ji azụta ya.

O kwukwara na ọ na-ara ya ahụ ịkwụsị, n'agbanyeghi na ya bụ 'kush' egbuola ụfọdụ ndị enyi ya.

Onye ọzọ, Tindem, kwuru na ọ na-ese ya bụ 'kush' iji nweta onwe ya ma ọ rụchaa ọrụ ya bụ ịkpa alumi.

Mana ọ gwara BBC na ọ na-agbalị ịkwụsị ise kush ka o wee dịrị ụmụ ya abụọ ndụ.

O kwukwara na o nwere mmasị ịbụ ọgbabọọlụ a ma ama.

Ndị ọrụ ahụike n'isiobodo Freetown kwuru na ihe ruru pasentị iri itoolu (90%) ụmụnwoke a na-edubata n'ụlọọgwụ ebe a na-elekọta ndị isi gbakara, bụ ọgwụ kush a tinyere ha n'ọnọdụ ahụ.

Ndị uweojii mba ahụ na-ebukwa agha na-emegide ya bụ ọgwụ ike.

Gịnị bụ Kush

E nwere ụdị ahịhịa 'cannabis' nke a na-e si na mpaghara Kush nke mba Afghanistan enweta, a na-akọ ụdị 'cannabis' nke a 'kush'.

Mana e nwekwara ụdị ọgwụ ike ọzọ a na-akpọ 'kush', nke a bụ nke a na-enweta site na ngwokọ kemịkalụ dị icheiche.

Aha ọzọ bekee na-akpọ ọgwụ ike a bụ 'kush' bụ 'synthethic marijuana'.

Ọgwụ ike a na-eme ka ụbụrụ ndị na-ese ya gbalie elu nke ukwuu.