World Drug Abuse Day: 'A kụgbụrụ nwa m maka ebubo mkpụrụmmiri' - Onye e gburu nwa ya

Aha onyonyo, "O teela Mkpụrụmmiri Bekee ma ka Crystal Meth dịwara n’ala Igbo, mana ajọ ọrụ ya malitere ịpụta ihe n’afọ 2021" NDLEA

N'ọnwa abụọ gara aga, ndị Igbo tiri mkpụ maka ihe mkpụrụmmiri na-eme n'ezinaụlọ niile n'ala Igbo.

Nke a mere ka ọhaneze tie mkpụ ma were otu onu katọọ ya bụ ajọ agwa nke ụmụ ntorobia tinyere aka.

Obodo niile bụ ndị ometutere pụtara ihe buso ya bụ ajọ ihe agha n'ụdị dị iche iche.

Ụfọdụ na-eti na soshal midia ebe ụfọdụ ji aka eti nke ha.

Ụmụntorobịa Igbo pụtara ịpịa ndị niile ha chere n'aka ha dị na ya bụ ajọ agwa ụtarị.

Ihe dịka mmadụ abụọ nwụrụ n'ime ya..

Otu n'Ezihe na Mbano, Imo steeti ebe nke ọzọ bụ na Enugwu Agidi n'Anambra steeti.

N'ime mmadụ abụọ a, ọnweghị nke ndị ezinaụlọ ha kwetere na ọ bụ mkpụrụmmiri mere e jiri gbuo nwa ha.

Nne Darlington n'Ezihe bụ Charity Ugbuaja sị na "nwa m anaghị ese sịga ma ya fọkwa mkpụrụmmiri".

Igwe Mike Okekuche n'Enugwu Agidi sị na, "ọnwere nwatakiri a na-akpọ Anayo Nwora, ha nwere jide ya otu be n'ime obodo, sị na ọ na-emegheri ka onye n'aṅụ mkpụrụmmiri... amaghị ka ha siri mata na ọ ṅụrụ mkpurummiri..."

Nke bụ eziokwu bụ na o nweghị onye ji n'aka na ndị e boro ya bụ ebubo ṅụrụ mkpụrụmmiri.

Ihe ndị uweojii kwuru

BBC jụkwara ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga.

Ikenga sị na "ya bụ ọgwụ sigburu udele ma sigbuo nkakwụ, bụ ihe o megoro n'ala Igbo"

Ọ sị na-agbanyeghị n'ezie na ndị obodo na-enyeaka ebuso ya agha, mana ya bụ ikwe n'aka gafere nkọ aka n'obod ụfọdụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) na Naịjirịa bụ Femi Babafemi sị na "onye na-aṅụ mkpụrụmmiri nwere nsogbu, ekwesighị iti ya ihe... E kwesiri ịnyere ya aka kpọga ya ebe a ga-eleta ya anya".

O kwuru na ndị ọrụ ha ejiela mmadụ ruru iri puku na otu bụ ndị n'anụ ya bụ ọgwụ ike.

Babafemi kọwara ka ya bụ ọgwụ siri bata ala Igbo na ihe e kwesiri ime ka ọ laa.

Gịnị bụ kpụrụmmiri?

Mkpụrụmmiri bụ nke Bekee kpọrọ Metaphytamine maọbụ Crystal meth n'aha ịchafụ bụ ọgwụ ike na-egbu karịa mmanya nke bụ onye o jidere ọ naghị ahapụ ya.

Nchọpụta gosiri na ọnweghị uru ọ na-abara ahụike mmadụ.

Ọ na-acha ka mmiri maọbụ anụnụ anụnụ na-egbuke egbuke.

Ọ na-adịkwa ka iko maọbụ ugegbe Bekee kpọrọ "glass".

Ọ dị oke njọ ma na-emerukwa mmadụ ahụ ebe ọ dị ọjọọ.

Gịnị ka NDLEA kwuru?

Femi Babafemi sị na ọ bụghị taa ka ya bụ mkpụrụmmiri bịara Naịjirịa.

Ọ kwuru na ọ bụ ndị Mexico na ndị Ecuador bụ ndị bịara kuziere ndị Naịjirịa ka e si esi ya bụ ọgwụike.

Ọ sịkwa na ndị ọrụ ha nwere ebe a na-elekọta ndị nwere nsogbu mkpụrụmmiri anya nke onye ọbụla chọrọ ya ga-ahụ na akara nwaududo ndị NDLEA .

Ndị mere akụkọ a: Chris Sanctus Chukwudi Okereke na Nnamdi Agbanelo.