Akụkọ kachasị taa: A tọpụla onye Jamini a tọrọ
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
...................
Buahri na-aga London taa.

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-apụ taa gawa London ebe ọ na-anata ọgwụgwọ maka ahụ na-arịa ya.
Akwụkwọ onyenkwuchiteọnụ onyeisiala bụ Garba Shehu dere kwuru na onyeisiala ga-anọ mkpụrụ ụbọchị anọ na ya bụ njem.
O kwuru na oge onyeisiala gara London maka mmezi na ịgbanye mmanụ n'ụgbọelu ya oge o si mba Amerịka alọta, ya na dọkịnta ya mere nzụkọ.
NAFDAC emechiela ụlọọrụ Emzor na ndị ọzọ.

Ndị NAFDAC emechiela ụlọọrụ atọ atọ na-emepụta ọgwụ, ụlọọrụ ndị a bụ Peace Standard, Bioraj na Emzor Pharmaceuticals.
Onyeisi ndị NAFDAC bụ Ọkammụta Mojisola Adeyeye kwuru na ha mere nke a oge ha mesịrị nyocha n'ụlọọrụ ndị ahụ nke so nchọpụta BBC gbasara ọgwụ codeine.
A tọpụla onye Jamini a tọrọ

Ebe foto si, AFP
A tọpụtala otu ịnjinia onye Jamịnị aha ya bụ Michael Cremza, na-arụrụ ụlọọrụ Dantata na Sawoe nke ndị ojiegbe tọrọ n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Epreelụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ, SP Musa Majia, gwara onye ntaakụkọ BBC na nwoke ahụ ndị uweojii gbapụtara na-enweta nleta na ụlọọgwụ.
Zambia achọghị ka ụmụakwụkwọ ha na-agba ọtọ

Ebe foto si, Dikina Muzeya
Ndị isi otu mahadum na mba Zambia adọọla ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị ha aka na ntị ka ha kwụsị ịbụ oyi akwa gbọ ọtọ.
Ndị isi ụlọ akwụkwọ ahụ dere akwụkwọ ha biri n'akụkụ ọbaakwụkwọ ha gwa ụmụnwaanyị ha ka ha ghara kwụsị igosi ahụ ha maka na ọ na-agharịpụ ụmụnkwoke ha.
Na mba ofesi
Trump ga-ekwu uche ya gbasara nkwekọrịta Iran gbasara ngwọagha nuklịa taa.
Na mba ofesi onyeisiala mba Amerịka Donald Trump ga-ekwu taa ka ọ ga-agbahapụ nkwekọrịta ya na Iran mere gbasara imepụta ngwọagha nuklịa.
Mba Yurope, China na Rọshịa na-agbakiri ala kamgbe ịhụ Amerịka ewepụghi aka na nkwekọrịta hụ nke e kwuru nwere ike ibuta agha mbaụwa ọzọ.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu, otu egwu bọọlụ Real Madrid na-ele anya na Ronaldo ga-adị mma ịlaghachite n'asọmpi Champions Lig ọzọ.
Nke a bụ maka ahụ o merụrụ ụbọchị ụka oge ha na otu Barcelona zutere.
Nkeji nke ụtụtụ a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.
Ihe onyonyo taa
Asambodo gị ọ na-enye gị nri? Ụfọdụ ndị Naịjirịa ekwuputela obi ha gbasara Asambodo agụmaakwụkwọ ha.











