A nwuchiri ọgwụike 'cocaine' e zoro n'ime akpa kọfị e bu aga ụlọọrụ Nespresso

Akpa Cocaine

Ebe foto si, EVN

Ndị uweojii mba Swiss ekwuola na ha akpachiela ọgwụike Cocaine dara nari ise kilogram e kechiri n'akpa coffee e bu aga Nespresso.

Ndị ọrụ nọ na Romont tiri mkpu tigara ndị uweojii mgbe ha hụrụ ntụ ọcha sị n'ime akpa ndị ahụ apụta.

Ndí uweojii mechere hụkwa ntụ ndị ahụ na kontena ise ndị ọzọ bụ nke ha chọpụtara na o si Brazil.

Ndị ọrụ na Nespresso sị na ya bụ ọgwụike abanyeghị na ya bụ Coffee ha na-arụpụta.

"Anyị chọrọ ịgwa ndị ahịa anyị na ngwaahịa anyị dị mma, ọnweghị ihe mere ya".

Ya bụ ọgwụike ha kpachiri bụ ezigbo ya ruru 80% nọ n'ọnụ egoahia ruru Euro iri ise ($53 m; £43 m).

Onyeisi ọrụ nchekwa ebe ahụ bụ Marc Andrey sị na ya bụ mnwuchi gbara agba.

Ọ sị na ha che na ọ bụ Iropu ka ya bụ agha n'aga.

Ụlọrọụrụ Nespresso bụ ụlọọrụ eji ịmetụta kọfị mara.

Ha nọ na mba iri asatọ n'ụwa nke gụnyere mba itoolu mba Afrịka.

Biden eweela onye ojii n'ọrụ dịka ọnụ na-ekwuchitere ya

Karine Jean-Pierre

Ebe foto si, European Pressphoto Agency

Nkọwa foto, Karine Jean-Pierre arigoola n'okpokoro ebe a na-agwa ndị ntaakụkọ okwu mana ọ malitebeghi n'ọkwa ahụ.

Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden ahọpụtala nwaanyị onyeisi ojii mbụ dịka odeakwụkwọ mbụ nke mba ahụ bụ onye nwaanyị na-adịna nwaanyị ibe ya.

Ms Karine Jean-Pierre, gbara afọ iri anọ na anọ (44) bụbu osote odeakwụkwọ mgbasa ozi gọọmentị Biden kemgbe ọ malitere ọchịchị.

Nwaada Jean-Pierre ga-anọchi anya Jen Psaki gbara afọ iri anọ na atọ (43) bụ onye na-arịda na ya bụ oche.

Ọ ga-amalite ọrụ n'izu na-abịa.

Ọrụ ya bụ ịgwa ndị ntaakụkọ okwu kwa ụbọchị nke gosiri na ya bụ ọrụ gbalitere.

Ọ bụ ya bụ ihu na olu gọọmentị mba Amerịka n'ihu ndị ntaakụkọ nakwa ndị Amerịka na mbaụwa.

Aha onyonyo, Onye bụ Joe Biden bụ onyeisiala ọhụrụ mba Amerịka

A na-amatakarị onye ji ya bụ ọkwa ngwa ngwa ọkachasị mgbe nsogbu dapụtara.

N'akara Twitter ya, Jen Psaki kọwara Jean-Pierre dịka nwaanyị "kwesịrị iṅomi" na "ezigbo mmadụ".

Psaki ga-amalite ọrụ n'ụlọọrụ ntaakụkọ MSNBC.

Akụkọ ga-amasị gị

Aha onyonyo, Etu anyị siri jiri ihe onyoonyo atụgharị ihe e jiri mara Anambra steeti