Ndị agha Amerịka egbuola Onyeisi otu Islamic State bụ Abu Ibrahim al-Qurayshi na Syria

Ụlọ ndị agha US gbariri na Syria

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Onwebeghị onye ma onye bi n'ụlọ ahụ ndị agha Amerịka gbajara na Syria

Ndị agha Amerịka egbuola onyeisi ndị agha nnupụisi Islamic State (IS) na agha mberede ha busoro ha n'ime abalị na mba Syria, dịka ndị otu onyeisi ha kwuru.

Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden kwuru na "anyị kelere ndị agha mba anyị na mbọ ha gbara iwepụ bu Ibrahim al-Hashimi al-Qurayshi n'ihu ụwa a".

Ndị agha gwara ndị ntaakụkọ na Qurayshi ji aka ya tọghe ogbunigwe gburu ya na ezinaụlọ ya.

Mana ndị Syria kwuru okwu sị na ha hụrụ ozu mmadụ iri na atọ mgbe a kwachara ya bụ mgbọ ebe ahụ.

Ugbọelụ ndị agha mba Amerịka gara biri na Atmeh dị na okeala Tọkị n'abalị Tọzde.

Ndị obodo ahụ sị na ya bụ njem adịghịkwara ndị Amerịka nfe maka na ndị IS kwawara ụgbọelụ ndị agha ahụ mgbọ site site n'ogologo egbe ha dọwara n'ụgbọala.

Ha kwụrụ na ya bụ mgbo dara ihe ruru awa abụọ tupu ya bụ ụgbọelụ ndị Amerịka fepụ.

Ụlọọrụ mgbasaozi New York Times sị na ndị Amerịka hapụrụ otu ụgbọelụ ha mebiri emebi ebe ahụ bụ nke ha mechere gbarie.

Onyeisiala Biden sị na ndị niile gara ya bụ agha lọtara n'udo nakwa na ya bụ agha ga-enweta udo n'ụwa niile gbaa gburugburu.

Onye ntaakụkọ AFP gara nso ebe ahụ sị na ụlọ ogogo ahụ ya hụrụ dị nso na-ebe alụrụ agha a gwuru agwu.

O kwukwara na a gbariri ebe niile, na ya hụrụ ọbara ebe niile n'akụkụ ụlọ ahụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ha hụkwara otu nwaagbọghọ merụrụ ahụ n'ụkwụ onye kọwara na e gbuchara ndị be ha niile na ya bụ agha.

Ndị ọrụ mba Syria na-ahụ maka ikike dịrị onye kwetere na ọ bụ mmadụ iri na atọ nwụrụ ma kwuo na ọ bụ ụmụaka isii na ụmụnwaanyị anọ so na ndị egburu.

Etu ọkụ latrik si dọgbuo mmadụ 26 n'ọdọahịa na mba Congo

Ọdọahịa ọkụ latrik dọgburu ndị mmadụ na DR Congo

Ọkụ latrik adọgbuola mmadụ iri abụọ na isii n'ọdọahịa dị na mba Democratic Republic of Congo na Wenezde.

Nke a mere mgbe osisi ọkụ latrik dakwasịrị ọtụtụ ụlọ nakwa ndị mmadụ n'isiobodo ha bụ Kinshasa.

Ihe onyonyo pụtara na soshal midia gosiri ka ozu ndị mmadụ tọgbọchara n'ala mgbe ihe ahụ mechara.

Amatabeghi kpọmkwem ihe butere ọdịda osisi ọkụ latrik ahụ.

Mana ozi ụlọọrụ na-ahụ maka ọkụ latrik na DR Congo sị na ọ dị ka ọ bụ amụma igwe gbara n'eriri ọkụ ahụ kpatara ya.

Ndị uweojii sị na o mere na mpaghara Matadi-Kibala nke Kinshasa na ụfọdụ ndị nwụrụ ozugbo o mere.

Maapụ ebe ọkụ latrik dọgburu ndị mmadụ na DR Congo

Praịm minista ha bụ Sama Lukonde gara ebe ahụ ma kwuo na ihe ọjọọ mere ma tie ezinaụlọ ndị nwụrụ anwụ aka n'obi.

Idemmiri na-akpa ike n'ọtụtụ mpaghara dị n'isiobodo ahụ maka enweghi ezi ọwammiri.

Otu onye na-ere ahịa sị na idemmiri na-eme n'ọdọahịa ahụ ma mmiri zoo.

Etu ọgwụike cocaine si dulaa ọtụtụ mmadụ mmụọ

Ọgwụike cocaine

Ebe foto si, Getty Images

Ọgwụike Cocaine nke adịgboroja egbuola ihe ruru mmadụ iri na isii ma kpọga ihe ruru mmadụ iri ise n'ụlọọgwụ na mpaghara Buenos Aires dị na mba Ajentina.

Ndị ọrụ nyocha ekwenyere na e tinyere nsi maọbụ akụrụngwa ọzọ n'ime ọgwụike ahụ.

Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa n'ogbe ahụ agwala ndị zụrụ ọgwụike a na nso nso ka ha biko ghara ịṅụ ya bụ ọgwụike.

Akụkọ sị na a zụtara ọgwụike ndị ahụ n'otu ebe, mana a nwụchiela mmadụ itoolu.

A na-eche mpụtara nyocha a na-eme iji mara ma ọgwụike gburu ndị a bụ otu ihe na ndị nke a kpachiri akpachi.

Ndị nke a metụtara si na mpaghara Hurlingham, Tres de Febrero na San Martin, e buuru ha gawa n'ụlọọgwụ.

Ndị ọrụ ahụike sị na ọ dịka ọ bụ ọrịa osise nakwa ọrịa obi bụ ihe gburu ụfọdụ ndị nwụrụ anwụ.

Gịnị bụ ọgwụike 'cocaine'

Cocaine nke e ji hydrochloride maara bụ otu n'ime ọgwụike a na-akpọ 'stimulant' nke a na-esi n'ahịhịa osisi a kpọrọ 'coca' amịpụta.

Ọ na-adọ akpịrị nke ukwuu nke bụ na ị malite ịṅụ ya, ọ ga-adị ka gị ṅụrụ zie gawa.

Ọ na-adịkaarị n'ụdị ntụ nke a na-aṅụ site n'ịkpọ ya n'ime ka ụtaba.

Akwụkwọ ebipụtara n'afọ 2019 n'Amerịka, mba Ajentina bụ mba ndị mmadụ kachasị aṅụ cocaine ma ewepụ Amerịka.