Afrịka a na-eweghara ọkwa dịka ọgbọ ọgụ agha jihad n'aka Middle East?

Ebe foto si, AFP
- Onye dere ya, Frank Gardner
- Ndị mere akụkọ a, Onye ntaakụkọ BBC n'ihe banyere nchekwa doro anya
Ihe dịka ndịagha mba Briten mmadụ 300 bụ ihe wuchiri na mba Mali n'Afrịka ebe otu "Islamic State' dịka ha hapụrụ mpaghara"Middle East" bata Afrịka.
Atụmatụ ahụ ga-anọ afọ atọ nke ha bịara ije ya bụ ihe a kpọrọ "Operation Newcombe" bụ nke ha na ndịagha UN dị 15,000 bụ nke mba Fransi nọ n'isi ya na-agba mbọ iweta udo na mpaghara ahụ a ma dịka "Sahel".
MalibU otu mba n'ime mba ndị nọ zara ndị na-ebu agha megide ndị nnupuisI Jihad, ya bụ ọgụ na-ekpo ọkụ na-aga n'ihu.
Dịka ngụkọ maka nsogbu iyi egwu na ụwa nke a kpọrọ "Global Terrorism Index' nke e wepụtara n'abalị 25 nke ọnwa November, "ọgbọ ọgụ nke otu "Islamic State" bụ IS apụọla na Middle East gaa kụọ akwụ n'Afrịka na mpaghara ụfọdụ na Ndịda Asia (South Asia).

Ebe foto si, Getty Images
Na mpaghara Afrịka dị nso na Sahara, ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'aka IS ejirila pasent 67 gbalite kemgbe afọ gara aga.
Ozi "Global Terrorism Index" kwuru sị, "Mgbasasị otu ha na ISIS jịkọtara mpaghara Afrịka dị nso na Sahara emeela ka nsogbu iyi egwu n'ọtụtụ mba dị na mpaghar ahụ."
"Mba asaa n'ime iri ndị nsogbu iyi-egwu kawanyere njọ dị na mpaghara Afrịka dị nso na Sahara: Burkina Faso, Mozambique, DRC, Mali, Nijie, Kamerun na Etiopịa".
Ozi ahụ kwukwara na n'afọ 2019, mpaghara Afrịka dị nso na Sahara bụ ndị kachasị nwee ndị nwụrụ site na nsogbu nke bụ 982, maọbụ pasent 41 ndị iyi egwu tara isi ha..
'Nzọpụ ụkwụ n'ọgụ megide nsogbu ndị oyi egwu'
Ndị agha Jihad abụghị ihe ọhụrụ n'Afrịka.
N'agba ọhụrụ, onye ndu al-Qaeda leader Osama Bin Laden nwụrụ anwụ mere Sudan ebe obibi tupu ọ laghachi Afghanistan n'afọ 1996.
Boko Haram nke Naijiria bụ nke a ma maka ịtọrọ nari kwuru narị ụmụakwụkwụ ụmụnwaanyị na Chibok n'afọ 2014 mere mwakpo ọtụtụ oge dịka ha kwupụtachara na ha na-amalite agha Jihad n'afọ 2010.
Mana taa, otu Jihad dị iche iche na-ama onwe ha aka dịka nsogbu iyi egwu na-akawanye njọ.
Onye nchịkọta ngalaba gọọmenti Amerịka na-ebu agha megide iyi egwu bụ ambasadọ Nathan Sales, kwuru na IS na al-Qaeda ebupụla isi ọnọdụ ha na Syria na Iraq bugazie ya Ọdịda Anyanwụ na Ọwụwa Anyanwụ Afrịka nakwa mba Afghanistan.
Ọ sị, "Afrika bụ isi sekpụ ntị n'ịga n'ihu n'ọgụ megide nsogbu iyi egwu."

Ebe foto si, Getty Images
Mana ọ bụghị naanị nsogbu ndị gọọmenti na ndị oyi egwu, e nwere ekworo onye ka ibe ya n'etiti ndị otu agha Jihad nke al-Qaeda na IS.
N'ihi ekworo a, Olivier Guitta bụ ọkachamara sị ụlọrụ "GlobalStrat Risk Consultancy" na ekwu na "Afrịka ga-abụ ọgbọ ọgụ Jihad n'afọ 20 na-abịa, na Afrịka ga-anọchi Middle East".
Al-Qaeda na IS kpọrọ gọọmentị ndị ndịọcha ndị "West" na-akwado asị.
Mana ụzọ ha si eme nke ha dị iche iche.
IS na-eji ihe onyonyo na-awụ akapa oyi dịka ebe a na-egbupu mmadụ isi nke mere o ji adọtara ha ndị omekome obi fere azụ nakwa ndị isi ghasara aghasa, nke mekwara na ọtụtụ ndị Muslim kpọrọ ha asị.
Al-Qaeda na ndị otu ha Na-achọnkwado ndị obere mmadụ ekwennyeghị na gọọmenti ha maọbụ ndị uweojii ha nakwa akpamoke ebe onye si.
Mba ndị ọ kachasị metụ?
Mali na mba ndị ọzọ mpaghara Afrịka dị nso n. ọzara Sahara
Mpaghara ahụ ka a na-akpọ "Sahel", nke pụtara "ikperemmiri" n'asụsụ Arabic ..
Mali, Chad, Niger, Burkina Faso na Mauritania bụ mba ndị dị na Sahel. Ha niile na-arịa nsogbu ndị oyiegwu.
Ụfọdụ mba ndị a bụ ndị ala ọkpọnkụ, ụbịam, enweghị ọrụ, nrụrụaka ji ọgbọ .
Ambasadọ Sales, sị na "Ọdịda Anyanwụ Afrịka bụ ebe a ma na mpiti ga-ekwe n'ihi na ọtụtụ mba ndị nọ ebe ahụ anaghị achịkọtali ala ha, ndị agha ha na-akpa arụ, ma nwekwa oke ala enweghị mgbochi."
Otu Jihad kachasị akpa ike na mpaghara a bụ nke ha na al-Qaeda na-arụkọ bụ otu Jama'at Nusrat Al-Islam wa'l-Muslimin (JNIM).
Otu a nke ha na otu IS na-arụkọ bụ Islamic State in the Greater Sahara (ISGS) achịpụla ya ugoro ugboro n'afọ a.
Naijiria
Naijiria ahụla nke tọrọ Biati n'ọgụ ndị agha Jihad dịka Gọọmenti na-agbali ibuso ndị Boko Haram agha n' Ọwụwa Anyanwụ Ugwu NAijiria.
Ozi si "Global Terrorism Index," kwuru na "Boko Haram egbuola mmadụ "37,500 n'agha ebe ihe karịrị mmadụ 19,000 nwụrụ site na nsogbu iyi egwu kemgbe afọ 2011 ọ kachasị na Naijiria" na mba ndị dị ya nso.

Ebe foto si, AFP
N'afọ 2015, otu nkewa dị na Boko Haram sowere IS, were ghọọ "Islamic State West Africa Province" (Iswap), ma nweta ụkpụrụ n'ikperemmiri Chad n'afọ 2018.
Otu ahụ kwuru na ihe onyonyo nke otu ahụ wepụtara n'abalị mbụ nke Ọnwa Disemba na ọ bụ ha gburu ọtụtụ ndị ọrụugbo na Borno steeti ndị ha kwuru dọnyere ndị agha Naijiria ukwu.
Mba ndị ọcha kwenyere inye Naijiri









