Mkpụrụ mmiri: Etu aka si kpara ndị na-ere ọgwụ ike a n'Agulu

Mbọ a na-agba iji chụọ ọgwụ ike ọsọ n'ala Igbo mịtara mkpụrụ n'ụbọchị Sọnde dịka ndị ntorobịa n'obodo Agulu, Anambra steeti nwụchiri mmadụ anọ a na-enyo enyo na ha na-ere ọgwụike.
Onyonyo ya bụ ihe na-efegharị ugbua na soshal midia dịka a gbara ndị a n'anwụ.
Ọ bụ ndị nche Agulu, na onyeisi ndị ntorobịa e ji Jonjoloko mara, nakwa onyeisi 'Town Union' Agulu nwuchiri ndị ahụ.

N'okwu ya, o kwuru na ọ bụ n'ebe a na-akpọ Ugwu Court, nke dị n'Ụmụ Owele, Agulu ka ha nwuchiri ndị ahụ.
Ndị ha nwụchiri gụnyere otu nwa agbọghọbịa, otu nwaokorobịa, otu okenye nwaanyị, nakwa otu okenye nwoke.
Dịka onyeisi ndị ntorobịa ahụ siri kwuo, ha hụkwara egbe abụọ n'ụlọ ebe ndị ahụ na-ere mkpụrụ mmiri na-anọ.

Ebe foto si, Facebook screen grab
Ha chọtakwa ọtụtụ ọgwụike dị icheiche, ma nke na-acha ntụ ntụ bụ nke ha sị na ọ bụ 'cocaine'.
Oge BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Toochukwu Ikenga, o kwuru na ha enwetabeghị mkpesa dị otu a, mana ọ ga-eleba ya anya ma zighachitere anyị ozi.
Anyị kpọkwara onyisi oche nchere oge obodo Agulu bụ Onyebuchi Okpala, ọ gwara anyị na ya bụ ihe mere n'ezie.
O kwuru na ọ bụ n'ụbọchị taa bụ Sọnde, abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Nọvemba ka o mere.

Ebe foto si, Facebook screenshot
N'ime onyonyo ahụ na-efesa na soshal midia, oge a gbara nwa agbọghọ ahụ nke a sị na o so ere ọgwụike ajụjụ, o kwuru na ọ bụ nwoke a na-akpọ 'Ten Kobo' ka ọ na-arụrụ ọrụ.
Nwa ada ahụ kwukwara na enwekwara onye ọzọ a na-kpọ 'John Bull', bụ onye na-anara 'Ten Kobo' ego iji nyere ya aka zochie ahịa ọjọọ ahụ ha na-azụ.
Mana 'John Bull' mechara chọwa ka 'Ten Kobo' welite aka n'ego ọ na-enye ya, nke a mere ka ha abụọ see okwu.
Oge ha sere okwu, 'John Bull' mere ihe onyonyo tinye na soshal midia ebe ọ nọrọ gbaa ama na ọ bụ n'Ugwu Court dị n'Umu Owele Agulu ka ndị na-ere mkpụrụ mmiri na-anọ.
Ọ bụ onyonyo ahụ mere ndị ntorobịa jiri wuchie ebe ahụ wee nwuchie ndị na-ere ya bụ ọgwụ ike.
Nwa agbọghọ ahụ kwuru na ndị ọrụ nchekwa jideburu ya n'oge gara aga, ma mechaa tọhapụkwa ya.
Gịnị bụ mkpụrụ mmiri?

Ebe foto si, Getty Images
Mkpụrụ mmiri bu ọgwụike akụrakụ siri ezigbote ike nke a na-akpọ Crystal Meth na Bekee.
A na-akpọ ya ka ụtaba, ese ya ka sịga, agba ya n'akwara, ma na-aṅụkwa ya ka mmiri. O nwekwara ndị na-ata ya ka nri.
Mkụrụ mmiri na-akpalị mmadụ obi elu, mee ka onwe ha na-atọ ha ụtọ, ma mekwa ka ọtụtụ chefuo ihe bụ ihe ọma na ihe bụ ihe ọjọọ.
Mana Mkpụrụ mmiri na-emetụta ahụike mmadụ n'ụzọ na adịghị mma.
O nwereike ịgbaka mmadụ isi, maọbụ kurie umeju nakwa ngụgụ mmadụ kpamkpam.










