US presidential debate 2020: Joe Biden o nwereike imeri Trump bụrụ onyeisiala Amerịka?

Joe Biden na-ele anya ka ọkọlọtọ Amerịka dị n'azụ ya.

Ebe foto si, Getty

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Joe Biden bụ otu onye kwụchịrị Donald Trump na afọ anọ ọzọ n'ọkwa oche eze na White House.

Ọ bụbu osote Barack Obama, mgbe Obama chịrị Amerịka. Ugbua, a họpụtala ya ka onye ga-anọchịanya Democratic Party na ntuliaka ga-eme na Novemba (2020).

N'anya ndị nkwado ya, ọ bụ onye ọkachamara n'ihe gbasara mmekọrịta mba na mba na Washington, nke ma etu esi ekwuru ọha okwu ga-amasị ndị nkịtị.

Ọ bụkwa nwoke biferela ụfọdụ ihe mberede na ndụ ya.

N'anya ndị na-ahụghị ya n'anya, ọ bụ onye na-akwado ndị na-emekarị mmeghe.

O tozuru ịkwatu Trump na White House?

Onye na-ekwu okwu ọsịịsọ

Joe Biden okoroọbịa onye isi nkwọcha nọ n'oche ya na 1970s.

Ebe foto si, Getty

Nkọwa foto, Joe Biden bara ndọrọndọrọ tupu amụọ ọtụtụ ndị na-atụ vootu taata

Biden abụghị onye ọbịa nye ndị na-azọ ọkwa ọchịchị - ọ malitere ndọrọndọrọ ọchịchị na Washington site ụlọomeiwu US n'afọ 1973 (afọ 47 gara aga) ma mgbe mbụ o so kwado onyeisiala bụ n'afọ 1987 (33 gara aga).

Ịchọ ndị ga-atụrụ ya vootu, ma bụrụkwa onye okwu juru ya n'ọnụ ka ogbunigwe.

Nke a bụ ugboro atọ ya ịzọ ọkwa onyeisiala maka na o chezọrọ onwe ya wee gbarụọ ndị igwe obi ka ọ malitere ikwu okwu.

Joe Biden ka o ji ike niile na-etizi igwe mmadụ mkpu.

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Biden ma ekwuru ọha okwu mana ọ na-eji ọnụ akpatara onwe ya isiokwu ọjọọ mgbe ụfọdụ

N'ọgbakọ ịchụnta vootu, o bidoro kwuwe na: “Ndị nnanna m rụrụ ọrụ ebe an-egwupụta koolu na nọt-ist Pennsylvania” nakwa na iwe bụ na ha enwetaghị ihe tozuru ha.

Mana onweghi otu n'ime ndị nna nna ya rụrụ n'ebe ana-egwupụta koolu - o zurula okwu ahụ (na ndị ọzọ) n'aka onye ndọrọndọrọ ọchịchị ndị Briten; Neil Kinnock, onye ndị ezi ya bụ ndị ngwupụta n'ezie.

Nke ahụ na ndị ọzọ socha n'ihe ndị akpọrọ ogbunigwe Joe “Joe Bombs”.

Ka ọ na-etu ọnụ maka ahụmihe ya n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n'afọ 2012, ọ gwara igwe aghọtachaghị ihe na: “Ndị nke m, aga m agwa unu na amatala m ndị isiala (Amerịka) asatọ, amaruru m atọ n'ime ha ruo ụlọ,” n'amaghị ama, ọ na-asị na o dinarala ha kama ịsị na ha bụ ezigbote enyi.

Barack Obama na Joe Biden na-efe aka ka ha makuru onwe ha.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Biden bụ osote Barack Obama site 2009 ruo 2017

Ka osote onyeisiala Obama na 2009, o miri ndị mmadụ ụjọ mgbe ọ sị na "anyị nwereike ịdaruo 30% ịzọpụta ego mba Amerịka".

Ihuọma mere o jiri bụrụ onye a họrọ ịbụ osote onyeisiala onyeisiojii nke mbụ n'Amerịka ka ọ kọwara ya ka "onye isiojii nke mbụ ma okwu ekwu ma bụrụkwa nwoke mara mma n'anya".

N'agbanyeghi okwu a, nkwado ndị isiojii ebe Biden nọ ka kwụrụ chịm n'ịchụnta vootu ugbua ana-azọ ọkwa isi oche n'Amerịka.

N'oge etebeghi aka, mkparịtaụka ya na onye ntaaakụkọ onye isiojii bụ Charlamagne Tha God rtụgharịrị mgbe o kwuru sị: "Ọ bụrụ na ị maghị onye ị ga-atụnyere m maọbụ Trump, ya bụ na ị bụghị onye isiojii."

Mpakrịtaụka Charlamagne Tha God na Joe Biden.

Ebe foto si, THE BREAKFAST CLUB ON POWER 105.1/Via Reuters

Nkọwa foto, Biden mere ihe iribama mgbe ọ na ihe onyonyo redio nke Charlamagne Tha God na-ahazi

Otu ahịrịokwu ahụ bụ mbido ezigbo esemokwu nke bụ na ndị ọrụ ya gbalịrị ịkọwa na o nweghi ihe ọ kpọrọ ụtụ vootu ndị isiojii bi n'Amerịka.

Anụ ochie n'ịchụnta vootu

Joe Biden ka ya na ndị na-atụ vootu na-ese foto.

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Biden adịghị ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ọzọ, izuta ndị na-atụ vootu na-amasị ya

Mana o nwere aka ọzọ n'okwu ya - n'ụwa ebe ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-atụ asị, o soghị, e ji anya onye kwụrụ ọtọ ele ya.

Ọ sị na o cheta ka o si agụ ihe mgbe ọ bụ nwata, ọ gaghị achọ ịgụpụta okwu ya n'akwụkwọ kama, ọ ga-achọ ka o kwuo ihe si ya n'obi.

Joe Biden ka ọ nọ n'ihu igwe mmadụ na-akwado ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Biden emeriela ntuliaka asaa nke ụlọomeiwu na US

Biden na ndị Amerịka gụnyere ndị ọrụ na ndị gbakọtara ị gee ya nti na-emekọrịta ka o ti egwu ama ama.

Mana ugbua etu a o si emekọrịta ma na-emetu ndị mmadụ aka abụrụwala nsogbu.

Ebubo

Joe Biden n'ihu ọkọlọtọ US

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ ụmụnwaanyị e bola Biden ebubo maka agwa ya

Ụjmụnwaanyị ruru asatọ biara na-ebo Biden ebubo na ọ na-emetụ ha, makụọ ma susuo ha ọnụ nke ụlọọrụ onyonyo mgbasaozi nọ na mba US goskwara etu o si bia ezigbo nso ma o na-ekele ụmụnwaanyị n'emume ha ụfọdụ.

Mana Biden ekwuola na ọ ga-akpachapụ anya na etu o si emekọrịta n'ọha.

Mana n'ọnwa Maachi ka Tara Reade,boro ya ebubo na o kwagidere ya na wọọlụ ma kwaso ya iko kamgbe afọ iri atọ.

ỤmụnwaAnyị na-eme ngagharịwe n'ihu ụlọikpe ukwu mba US

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, "Believe survivors" abụrụla okwu ama ama kamgbe ọtụtụ afọ gara aga

Biden agọọla aka na ụkwụ maka nke a site akụwkwọ ozi ụlọọrụ achụmnta vootu ya wepụtara nso nso a.

Ndị Democrats na-akwado onye ha chorọ ka ọ bụrụ onyeisiala ha ga-ekwu na ọtụtụ ụmụnwaanyị apụtala boo onyeisiala Trump ebubo ikwaso ha iko mana e nwereike ibutu udiri omume a n'egwuregwu ọnụ ọgụ

Kamgbe mkpụ #MeToo malitere, Democrats gụnyere Biden na-ekwuis ike ka obodo kwete ụmụnwaanyị makana ihe ọbụla e mere iji gbaa ebubo eboro ha nkịtị ga-eme ka ndị na-azọta ikike ahụ ghara ịṅụ mmiri tọgbọ iko.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

N'ajụjụ ọnụ agbara Reade nso nso a, o kwuru, ndị nke Biden agwala m ọtụtụ ihe na-agba obi ma na-ekwukwa maka m na soshal midia.

Ọgbakọ achụmnta vootu Biden agọọla ebubo a.

Igbalahụ nzọghie ụkwụ a

Donald Trump na-ekiri Hillary Clinton mgbe a na-eme nrụrịtụka.

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Hilary Clinton bụ onye kacha nwee ihe mmụta gbasara ọchịchị mana Donald Trump meriri ya na ntụliaka onyeiaiala 2016

Ndị nso nso Biden na-eche etu o si anabata ndị mmadụ ga-azọpụta ịdanye n'ọnya ndị Democrats zọgoro ọkwa onyeisiala n'oge gara aga na-adanyekarị.

O nwetela ọtụtụ ihe mmụta na Washington , afọ iri atọ n'ụlọ sineti nakwa afọ asatọ dịka osote onyeisiala Barak Obama, mana ụdịrị mbọ niile ọ gbara a gaghị enyecha aka.

Ndị nso nso Biden na-eche na etu a ọ dị umeala, na ọ gaghị adanye n'ọnya nghọtaghie.

Barack Obama na Joe Biden na-efe aka n'ihu ọkọlọtọ US.

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Obama gbadoro achụm nta vootu na iweta mgbanwe n'afọ 2008 mana ọ ga-ahiara Biden ahụ imenwu udiri ihe a.

N'ihe karịrị otu mgbe, ka ndị mba Amerịka ga-atụnyere onye na-azọ ọkwa onyeisiala gaa bụgharịa ọnọdụ ndọrọndọrọ nọ n'ụlọ ahụ.

Mana nke a ga-arịa ahụ makana Biden a nọọla na ndọrọndọrọ ọchịchị ruo afọ iri ise nke e nwereike iji megide ya.

Ndọti ihe mere mgbe gboo

Joe Biden na-ekwu okwu n'ọgbọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Biden bu ụzọ zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 1987

N'oge afọ 1970, o dọnyere ndị na-akpa oke agbụrụ bi na ndịda n'imegide ụmụaka ndị ọzọ si ebe ọzọ nke gosiri ịkpa oke agbụrụ.

Ndị otu Republicans na-ekwu na Robert Gates bụ odeakwụkwọ Obama kwuru na Biden bụ onye ọtụtụ mmadụ ga-ahụrịrị n'anya mana ọ daala n'atụmaatụ mba ofesi nakwa nchekwa obodo kamgbe afọ iri anọ.

Ya chere aka ghọrọ udiri okwu a dịka a na-achụ nta vootu ịzọta ọkwa onyeisiala ugbua.

Ihe mberede ezinaụlọ

Joe Biden na nwunye ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ihe mberede okporoụzọ tara isi nwunye Biden a kpọrọ Nelia na nwa ya nwaanyị

Ọ bụ ihe nwute na otu ihe mere ka ọ dịka Biden a nọpụrụ anọpụ na ndọrọndọrọ bụ otu ihe metụrụla mmadụ niile - ọnwụ.

Ka ọ na-akwado ka ọ banye ọkwa sineti ka o merichara ntụliaka ya nke mbụ, nwunye ya bụ Nelia nakwa ada ya nwaanyị Naomi nwụrụ n'ihe mberede ụgbọala nke merụrụ ụmụ ya nwoke abụọ ndị ọzọ (Beau na Hunter) ahụ.

Joe Biden na Beau Biden

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Nwa nwoke Biden akpọrọ Beau bụ onye ọkaikpe nakwa onye agha n'Iraq

Beau mechara nwụọ maka ọrịa ụbụrụ n'afọ 2015 ka ọ gbachara afọ 46.

Ndị Amerika ka ghọta nsogbu arịrị ọnwụ ndị Biden hụrụ n'anya buterela ya makana a gbanyeghị na ọ bụ onye ama ama na ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa akụ na ụba ya, ụfọdụ ihe merela ha emetụla ya.

Mana e nwere akụkọ pụrụiche gbasara ezinụlọ ya, nke a metụtara nwa ya nwoke Hunter.

Ike, nrụrụaka na ụgha

Joe Biden na Hunter Biden

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Hunter Biden ebuterela ndọrọndọrọ ọchịchị nna ya ọtụtụ mgbagoju anya

Hunter bụ ọkaiwu nakwa onye na-achụ ihe n'ike tupu ihe gbasara ndụ ya mgbe ọ nọghị n'ihu ọha ewetewe nnukwu nsogbu.

Nwunye ya nke mbụ boro ebubo ibu ọgwụ ike n'akwụkwọ mgbasa alụm di na nwunye ha, a tụpụkwara ya n'ụlọ ọrụ ndị agha mmiri Amerịka ka achọpụtachara na o bu 'kokain'.

Ihe nrụrụaka ndị a Hunter metarala eweterala nna ya Biden ajọ akụkọ n'ụlọọrụ mgbasaozi dị iche iche n'Amerịka.

Ndị Amerịka nwereike ịghọta ihe gbasara onye ya mmasị o nwere n'ebe ọgwụ ike dị na-agbarị mana ebe ọ bụ na Hunter ejirila agwa ọjọ a ma na-arụ ọrụ ebe a na-akwụ ya ezigbo ụgwọ ọnwa gosiri etu ndụ si diri ndị otu ndọrọndọrọọchịchị dịka Biden.

Nwepụ n'ọchịchị

Donald Trump

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, E wepụrụ Trump n'ọchịchị mana ndị sineti mechara hụ na aka ya dị ọcha nke mere na ewepụghị ya n'ọchịchị

Ụfọdụ ọrụ a ebe a na-akwụ ezigbo ụgwọ ọnwa gụnyere Ukraine, nke mere ka a na-eche na onyeisiala Trump kwuru ka ụlọ ọrụ onyeisiala mewe Hunter nyocha maka nrụrụaka.

Nkata n'ekwenti ahụ mere ka atụwa alo iwepụ Trump n'oche onyeisiala, ma ha emenwughị ya, mpịtọ ndọrọndọrọ Biden ga na-eche na ọ karịghị ịmanye aka.

Ihe gbasara mba ofesi

Joe Biden na onyeisiala Chinese Xi Jingping

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Biden nwere ọtụtụ ihe mmụta gbasara mba ofesi

Nrụrụaka mba ofesi ọbụla agaghị a dịrị Biden mma makana e ji ọkaibe n'ihe gbasara mmekọrịta mba ofesi wee mara ya.

Mana amabeghị ma ndị ga-atụ vootu a ga-ebu nke a n'obi n'ụbọchị ntụliaka.

Ndị agha Saudi nakwa nke mba mgbe ha na-aga Kuwait n'agha Gulf mbụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A na-eche na mkpebi Biden mere inye vootu megidere atụmaatịụ ndị agha gbasara agha Gulf mbụ kpatara na ọ zọghị ọkwa onyeisiala n'afọ 1992

A chịkọta ndọrọndọrọ ọchịchị ya niile, a ga-asị na o ji nwayo nwayo azọnye ụkwụ n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ọ tụrụ vootu megidere agha Gulf n'afọ 1991, nke kwadoro mwakpo mba Iraq n'afọ 2003 mana katọọ nsonye mba US n'ebe ahụ.

Ọ dụkwara Obama ọdụ ya ezipụla ndị agha gara gbuo Osama Bin Laden.

Ihe ndị mere ka ụfọdụ ndị Democrats na-azọ ikike sewere ya ihu.

Mana ndị mmadụ ga-apụta n'ọnwa Nọvemba ga-atụọrọ ya vootu.

Ihe niile maọbụ enweghị ihe ọbụla ma ncha

Joe Biden na-apụ n'ọgbọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ma o meriri ma o merighị, ihe a ga-abụ agba ikpeazụ nke ọrụ ndọrọndọrọ ọchịchị Biden

Mpụtara ntụliaka nyocha na-egosi na Biden ji pọinti ise ruo iri aga Trump dịka ha na-azọ onye ga-abanye n'ụlọ ọcha mana ntụliaka nke Nọvemba ka tere aka, a ga-enwekwa ọtụtụ ọgụ n'ihu tupu oge ahụ e ruo.

Trump na Biden esela okwu maka mwakpo ndị uweojii na-awakpo ndị isi oji nakwa etu gọọmenti si hazie ihe gbasara ntiwasa coronavirus.

Mana o nwere ọtụtụ ihe ka ihe ndị ahụ mkpa.

Ọ bụrụ na Biden merie, ọ ga-abụrụ ya okpu eze e kpukwasịrị n'isi ndọrọndọrọ ọchịchị o maliterela kamgbe, mana ọ merighị ọ ga-abụ iwere ọchịchị nyefe n'aka nwoke o chere ekwesih=ghị ichị Amerịka

nakwa onye "a gaghị atụkwasinwu obi."

N'oge na-adịghị anya, mgbe ọ na-eche ma ọ ga-aba n'ọsọ onyeisiala nke 2016, Biden kwuru na ọ ga-anwụli dịka nwoke nwere obi aṅụrị maọbụghị onyeisiala."

Nke ahụ abụghịzi uche ya ugbua.