US Presidential Debate 2020: Ihe mere na nrụrịtaụka Donald Trump na Joe Biden

Trump na Biden

Ebe foto si, Reuters

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Dịka Donald Trump na Joe Biden na-azọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka mere nrụrịtaụka maka ntuliaka a ga-eme n'ọnwa Nọvemba, lee ihe ndị ị kwesịrị ịma.

Trump na-azọ ọkwa a n'okpuru pati Republicans ebe Biden na-azọ n'okpuru Democrats, nke a bụ mbụ ha abụọ na-ezute na nrụrịtaụka.

Chris Wallace bụ onye ntaakụkọ n'ụlọọrụ Fox News chịkọtara emume a e mere n'abalị Wenezde, Septemba 30.

N'etiti Trump na Biden, isiookwu a kacha rụtụ aka bụ Covid-19, akụnaụba obodo, ihe gbasara agbụrụ, mpụ nakwa ihe gbasara ugwu ntuliaka.

Ha dụkwara onwe ha aka n'ọnụ banyere ezinaụlọ ha, dịka Trump dụkwara Wallace chịkọtara ya aka n'ọnụ. Wallace gwara Onyeisiala Trump ka ọ kwụsị imebi iwu e tinyere maka ya bụ nrụrịtaụka.

Wallace ji ihe gbasara onye ga-anọchi Ọkaikpe Ruth Bader Ginsburg nwụrụ anwụ dịka Ọkaikpe kachasị n'ụlọikpe etiti bido ya bụ nrụrịtaụka.

Gbasara ahụike

Biden kwuru na ndị mmadụ ekwesịghị ịtụnyere Trump n'ihi na ọ na-agbasi mbọ ike ịhụ na ọ wepụrụ enyemaka gọọmentị na-enyere ndị mmadụ ịkwụ ụgwọ ahụike.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ọ katọkwuru etu Trump si ebuso mkpa mkpa Covid-19 agha na mba Amerịka, ebe Trump turu ọnụ na akụnaụba obodo na-etolite kemgbe ọ banyere ọchịchị ma kwe nkwa na ọ ka ga-eto na-aga n'agbanyeghi na Covid-19 metụtatụrụ ya.

Gbasara Akụnaụba obodo

Onyeisiala Trump na Biden

Ebe foto si, Reuters

Wallace kwuru na n'ime afọ atọ mbụ Obama na Biden chịrị, na mba Amerịka kewapụtara ọrụ karịa ole Trump kewapụtarala n'ime afọ atọ mbụ ọ chịrịla.

Trump tinyere ọnụ sị ya "Ọ bụ ntolite kacha akpụ akpụ kemgbe afụ 1929".

Biden kwuru na ezigbote ahụ adịghị akụnaụba mba Amerịka mgbe ha banyere ọchịchị n'afọ 2009, mana ha kwalitere ya nke ọma tupu ha apụọ.

Biden katọrọ Trump n'ihe gbasara akụnaụba obodo, dịka o boro ya ebubo itikpọ akụnaụba Barack Obama hapụrụ mgbe ọ chịchara.

Trump na onwe ya kwuru sị na ihe ọ ma bụ na o weghachịtara ọrụ ruru 700,000.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na Biden merie, na akụnaụba mba Amerịka ga-akpụ afọ n'ala.

Gbasara ụtụisi

Wallace jụrụ Trump: "Ọ bụ eziokwu na ị kwụrụ narị dọla asaa na iri ise ($750) n'ime otu afọ dịka ụtụisi a na-akwụ gọọmentị etiti n'afọ 2016 na 2017?"

Trump sara ya sị "A kwụrụ m nde kwuru nde dọla, a kwụrụ m nde dọla iri atọ na asatọ ($38m) n'otu afọ, kwụọ nde dọla iri abụọ na asaa ($27m) n'otu afọ."

Biden gwara Trump ya gosi ndị mmadụ etu o si akwụ ụgwọ ụtụisi ya, ebe Trump sara Biden sị "Ị ga-ahụ ya mgbe ọ gwụrụ" - n'ihi na a na-enyocha ya. Mana iwu ekwughi na ọ gaghị egosiputanwu ya ugbua.

Trump

Ebe foto si, Reuters

Wallace jụkwara ya ọzọ sị "Ị ga-agwa anyị ego ole ị kwụrụ n'ụtụisi gọọmentị etiti n'afọ 2016 na 2017?", nke Trump sara sị "nde kwuru nde dọla, ị ga-emecha hụ ya."

Ọ gara n'ihu gwa Biden na ọ bụ iwu ụtụisi ha tinyere oge ọchịchị ha mere ka ndị dị ka ya na-erite ụdịrị uru a.

Ebe Biden sara ya sị na ụtụisi Trump tinyere dabaara naanị ọgaranya, na ọ ga-ewepụ ha ma ọ bụrụ na o merie, ma tinye ya n'inyere ndị chọrọ enyemaka aka.

Mara na ndị osote ha bụ Mike Pence nke Trump na Kamala Harris nke Biden, ga-eme nrụrịtaụka nke ha n'ụbọchị asaa nke ọnwa Ọktoba.