Mummy GO gwara BBC ihe ndị a maka onyonyo ya na-efegharị na soshal midia

Evangelist Olufunmilayo Adebayo e ji Mummy GO mara ekwuola na ọtụtụ onyonyo na-egosi ebe ọ na-ekwu okwu ,na-efegharị na soshal midia bụ nke akpara aka.
Ọ gwara BBC Pidgin na ọbụghị ya kwuru ụfọdụ okwu a na-ebo ya ebubo ya.
"Ọ bụghị m kwuru ihe ndị ahụ, a na-akpa ụfọdụ onyonyo ndị ahụ aka . ọ bụrụgodi na ekwensu bụrụ ụkochukwu taa, ọ ga-ekwu ihe ndị ahụ? Ekwensu agaghị ekuli ihe ndị ahụ ma ya fọdụrụ ụkọchukwu kpọrọ onwe ya onye dị nsọ, ndị a na-eme ihe a emewela ya kamgbe afọ asatọ."
Olufunmilayo Adebayo bụ onyeisi ụlọụka Rapture Proclaimer Evangelistic Church (RAPEC) dị n'Ota, Ogun steeti.

Ihe ndị ọzọ Mummy GO gwara BBC
"A rụọla m ọrụ ụkọchukwu ihe karịrị afọ iri abụ na anọ," dịka Mummy G.O si gwa BBC pigdin.
"Mana mgbe chineke kpọrọ m, oruola ihe dịka afọ 27, ihe chineke gwara m bụ ka m gwa ndị mmadụ maka ihe ha ga-eme iji gaa eligwe maọbụ gbanahụ ọkụ mmụọ makana na Jizos na-abia ọzọ ịkpọrọ ndị nke ya, ma ndị mmadụ achọrọ inụ ma ha achọghị."
"Iwe anaghị ewe m maka aha Mummy GO ụwa nyerela m ugbua. Ọ bụ aha ọhụrụ."
Evangelist Olufunmilayo gaferala afọ iri ise kwuru na ije ya ibụ ụkọchukwu abụghị nke na-aga siriri werere.
"Esobu m ike ọchịchịrị arụ ọrụ mgbe mbụ , na-ebuso ndị ụka agha nakwa ndị ụkọchukwu mana mgbe Jesus Christ zutere m, e bidoro m meminawa ike ọjọ nile ahụ."
Cheta na soshal midia nwuru ọkụ maka Funmilayo Adebayo, nwaanyị a ma dịka Mummy G.O' maka ụdịrị oziọma ọ na-enye ndị ụka ya.

Onye bụdị 'Mummy G.O', nwaanyị oziọma ya na-amụnye ọkụ na soshal midia?
Soshal midia enwụrụla ọkụ maka Funmilayo Adebayo, nwaanyị a ma dịka Mummy G.O' maka ụdịrị oziọma ọ na-enye ndị ụka ya.
Mummy G.O, onye ndu ụka 'Mountain of Solution' dị n'Ogun steeti ekwuola ọtụtụ ihe na-agbaka ndị mmadụ isi dịka ọ gụtara ihe ndị nwere ike ibuga mmadụ ọkụ mmụọ.
Ihe ndị a dịka o siri kwuo gụnyere iyi 'jeans' traụza, iyi okpunnabueyi, na ihe ndị ọzọ.
N'otu ozi ya, ọ sịrị: "Mụ na Lucifer anọọla. Ihe kachasị amasị ya bụ aramara." Lucifer na-enwe mmekọ kwa ụbọchị. Ị ma na Lucifer na aga ndị mmadụ Akwụkwọ? Ọ lụrụ Rihanna, Ọ lụrụ Lady Gaga."
N'ozi ọzọ, Mummy GO kwuru sị, "Onye ọbụla na-agba egwu 'break dance' bụ onye nwụrụ anwụ, maka na egwu ahụ si n'aka Michael Jackson pụta na-ego ọkpụkpụ 'skeleton' ndị nwụrụ anwụ."
Ọ sịkwa, "Tupu m echegharịa nwere ndụ m nye Kraịst, a bụbu m onye na-ebu ọgwụ ike "Cocaine".
"Anabụ m eresi ndị omekome egbe ha ji akpa ike, abụbu m onye na-egbu ndị mmadụ, mụ na ọtụtụ ndị omekome na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-arụkọ."
"Mgbe m na-ebu ọgwụ ike "Cocaine anaghi m eji ụgbọ elu naani ute ndị mmụọ ka m ji efeghari ebu ya bụ ọgwụ ike site na mba Germany fega mba Amerịka".
Ihe ndị a niile emeela ka ọtụtụ mmadụ kpụrụ ya n'ọnụ ugbua ma jiri ya na-eme ihe ịkpa ọchị.

Ebe foto si, Sceen grab









