Sam Mbakwe: Kedụ ihe ị ma maka ya?

Dee Sam Mbakwe

Ebe foto si, Screengrab/Dee Sam Mbakwe Facebook

Nkọwa foto, Aka ji ekwentị na-egosi foto Dee Sam Mbakwe

Enweghi ike ịkọ akụkọ Imo steeti ma a kpọtaghị aha Samuel Onunaka Mbakwe.

Mbakwe bụ otu nwoke ọtụtụ ndị hụtara ka nna ha maọbụ nwanne nna ha mgbe ọ dị ndụ ma bụrụ aka chịrị Imo steeti.

Nke a mere e ji na-akpọ ya "Dee Sam", dịka ọ bụ nwanne onye ọbụla.

Gịnị ka ị ma maka Dee Sam?

Ndị ma ya mgbe ọ dị ndụ kwuru na o kwenyere na ọchịchị onye kwuo uche ya bụ maka ịrụrụ ndị mmadụ ọrụ ghara ịbụ maka naanị onwe gị (fọnfọju akpa).

  • Sam Onunaka Mbakwe chịrị Imo steeti (Old Imo state gụnyere Abịa na ụfọdụ mpaghara Ebonyi steeti) site n'ọnwa Ọktoba afọ 1979 ruo Disemba afọ 1983
  • A mụrụ ya n'Avụtụ dị n'okpuruọchịchị Obowo dị n'Imo steeti n'afọ 1929
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na Naịjiria, Sierra Leone nakwa Ịnglandị tupu ọ lọghachịta bịa bụrụ Ọkaiwu.
  • Ọ bụbu ọkaiwu, ojiegoachụego nakwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị
  • O so lụọ agha Biafra (ọ bụ onye agha Biafra mgbe a lụrụ agha ahụ), dịka ada ya nwaanyị bụ Patience si kwuo
Dee Sam Mbakwe

Ebe foto si, Screengrab/Dee Sam Mbakwe Facebook

Nkọwa foto, Dee Sam Mbakwe na Odumegwu Ojukwu
  • Otu ihe gọọmentị ya gbadoro anya rụọ ọfụma mgbe ọ nọ n'ọchịchị ya bụ ọtụtụ okporoụzọ. Ọ bụkwa n'ọchịchị Mbakwe ka a rụrụ Adapalm bụ ebe a kụrụ ọtụtụ osisi nkwụ ma na-emepụta mmanụ n'Imo steeti, ụlọọrụ redio na tv mbụ dị na steeti ahụ, nakwa Concorde Hotel, wdgz
  • Mbakwe bụ onye hibere mahadum Imo steeti nke e mechara gụgharịa mahadum Abịa steeti
  • E ji gọvanọ obe akwa nke Bekee kpọrọ weeping governor mara ya; akụkọ kwuru na ọ na-ebekarị akwa iji dọta enyemaka gọọmentị etiti n'ihe ndị steeti ya na-agabiga
  • Ọ nọrọ nga afọ abụọ na ụma mgbe ọchịchị ya biri (ọchịchị ya biri mgbe ọchịchị General Muhammadu Buhari napụchara ndị nkịtị ọchịchị n'ike ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba, n'afọ 1983)
  • Ọ nwụrụ n'ụbọchị isii nke ọnwa Jenụwarị 2004, ka ọ dị afọ 75.

Ihe ndị e merela n'aha ya:

Ọdọụgbọelu Sam Mbakwe
Nkọwa foto, Ọha mmadụ tụkọtara ego ma nyekwa aka iji rụọ ọdọụgbọelu Sam Mbakwe dị n'Owerri

N'ihi ọrụ ọma niile ọ rụrụ n'Imo steeti, ụfọdụ ndị edeela akwụkwọ n'aha ya.

Ndị dị ka Alphonse Okechukwu Okibedi dere akwụkwọ a kpọrọ "Chief Sam O. Mbakwe: a great son of achievement and courage" na Chinedum Uzoma Nwajiuba dere akwụkwọ a kpọrọ "The glorious Mbakwe era".

Ihe ndị ọzọ gụnyekwara ọdọụgbọelu dị n'Owere, Imo steeti, nke ndị Imo steeti tụkọtara ego rụọ n'afọ 1992 ma baa ya aha Dee Sam.

N'ime obi gọọmentị Imo steeti, e nwere ebe a kpọrọ "Sam Mbakwe exco chamber", bụ nke Rochas Okorocha rụrụ oge ọ bụ gọvanọ Imo steeti.

Gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abịa steeti gụharịkwara ụzọ a mabu dịka Faulks road nke dị n'Aba, ma gụọ ya Sam Mbakwe Road, n'ọnwa Maachị 2021.

Aha onyonyo, Ada Palm